Mmọnwụ agakwanụ nga ka FRSC buru bata maka nkwuchị ụzọ

Ọsọ mmọnwụ nwereike bụrụu ihe agaghị eme n'ekeresimasi a n'Anambara ma ya bụrụ na ndị ndị nchekwa okporo ụzo bụ 'Federal Road Safety Commission' (FRSC) mere ka ha siri kwuo.

FRSC sị na ha ga-anwuchi mmọnwụ ọbụla nọchịri ụzọ.

Ha sị ọtụtu mgbe mmọnwụ na-egbochi ka ụgbọala gafee ma na-ebute kwa ọtụtu mberede n'okporo ụzo.

Nkenke aha onyonyo Mụọ a nwere ike ije nga na ọnwa Disemba

Ọ bụ nke a mere ka ndị FRSC ji kwechiri sị na n'ọnwa disemba nke afo a, na mụo ọbụla nọchịri ụzo ga-anọ na mkpọrọ a nata 'Ego mmiri oyi'.

Ọ bụ nnọchite anya onyeisi ha bụ Kehinde Adeleye kwuru nke a n'Ọnịcha n'ụbochi Tụzde bụ nke asaa n'ọnwa Novemba mgbe ha na-eme nkwado maka nchekwa ụzọ nke ọnwa Disemba nke ha kpọrọ "Nchekwa ụzọ bụ maka onye ụche ya di ya, Mberede okporo ụzọ bụ onye ụche ya adịghi ya, muru anya dịri ndụ".

Image copyright iStock

Onyeisi ndị FRSC nke Anambara Steeti bụ Andrew Kumapayi kwuru si "Enwere ụfodụ mberede okporo ụzọ nke tara isi mmadụ n'afo gara aga, anyi agaghi ekwe ka o mee n'afo a".

Kumapayi dọkwara mmọnwụ aka na nti sị "Anyi ga-anwuchi mmọwụ ọbụla nnọchiri okporo ụzọ"

N'otu aka ahụ ka Osote Gọvanọ Anambara steeti bụ Nkem Okeke gbara ndị FRSC ume ma rịo ha ka ha hụ na ụzọ Anambara steeti nwere ezi nchekwa n'ọge ọnwa Disemba.

Mmọnwụ na-agbakarị n'ọnwa Disemba ka ọtụtụ ndị na-eme emume ekeresima.

Dịka o si dị ugbu a, n'ọnwa disemba a, oke mmọwụ Ijele nwere ike ije nga!

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara