Igbo Tradition: Kedu ndị na-ehibe iwu n'ala Igbo mgbe gboo?

ụmụ okorobia

Obodo ọbụla dị n'ala Igbo anaghị anabata agwa ọjụọ n'ụzọ ọbụla.

Kama etu ọbụla ọ siri dị, enwere ndị isiike na-agba mbọ ihu na ha mere ihe ndị obodo sị ha ghara ime.

Mgbe mmadụ dara iwu obodo n'ala Igbo, Kedu ndị ọ diiri ita ya ahụhụ ma ọ bụ ihu na iwu obodo mezuru?

Otu ihe ekwesiri ịghọta bụ na ndị Igbo kwenyere n'otu dị iche iche nke na-enyere aka n'ihibe iwu obodo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKedu ebe Igbo si?

Anyị jụrụ ndị nwere agba n'ihe gbasatara ọmụmụ na Omenala ndị Igbo maka isiokwu a.

Ọkammụta Chigozie Nnabuihe na Gladys Udechukwu gwara anyị etu ndị Igbo si echekwa iwu obodo mgbe gboo.

Ndị nchekwa iwu n'ala Igbo dịka omenala igbo siri dị gunyere:

1: Nne na Nna

Image copyright Getty Images

Igbo sị na a na-esiri n'ụlọ mara mma pụọ iro.

Nwata gara n'ite nne ya zuru anụ, kedu onye ga-ata ya ahụhụ?

Oshi bụ otu ihe ndị Igbo kacha kpọọ asị nke mere na Nne na Nna na-ebido mgbe nwantakiri pere mpe akuziri ya gbanarụ nke a.

Obodo niile n'ala Igbo nwere iwu megidere izu oshi.

Ọ bụ ọrụ ezinụlo ikuziri ụmụ ntakịrị maka iwu obodo ma taa ha ahụhụ mgbe ha daaraiwu ndị a.

Ndị Ụmụnna

Nkenke aha onyonyo Ndị ụmunna na-abata n'okwu ma ọ karịa ezinụlọ

Mgbe nwata mere ihe megide nne ya, ụmunna ga-ejide ya ma taa ya ahụhụ.

Nke a bụ maka na ọ bụ ụmụnna ka ọ dịịri ihu na Nwunye ha lụtara ga-enweta nsọpụrụ ruru ya.

Nke a pụtara na mgbe ọbụla nwatakiri mejọrọ nne ya, ọ bụ ndị ụmunna ka ọ dịri ihu na orubere nne ya isi.

Ndị Ikwunne

Nkenke aha onyonyo Ndị Kwunne na-abata n'okwu mgbe nwanwa ha na enye ọgọ ha nsogbu.

N'aka nke ọzọ, ijị maa atụ, mgbe nwata kparịrị nna ya, ọ bụ ndị ikwunne ya ka ọ dịiri ita ha ahụhụ.

Nke a bụ maka na ha ga-ajụ sị "Kedu etu nwa nwanne ha nwaanyị mụtara ga-esi kparịa ọgọ ha nwoke".

Ọ bụ ihe a ka ha ga-ebu n'ụche were ga jide nwantakịrị ahụ ihe ọkụ ji ntị oke eme.

Ụmụada

Nkenke aha onyonyo Ụmụada bara ezigbo ụrụ n'omenala Igbo

Ụmụada bụ nzụkọ ụmunwaanyị amụrụ obodo.

Mgbe nwanyị alụtara alụta na-akpa agwa na ezighị ezi, ụmụada ga-abịa tinye ọnụ n'okwu ya.

Ọkachasị ihe gbasara ezi nna ha ka ụmụada na-abata mezie ihe.

I ji maaatụ bụ mgbe nwaanyị na-emegbu di ya maọbụ nne maọbụ nna di ya, ọ bụru kwa na ọna-akparị dị ya, ụmụada ga-abata n'okwu.

Dịka Gladys Udechukwu sịkwa kọwaa, ihe ọzọ bụ kwa na ụmụada nwere ike ibanye n'ikpe gbasara nwoke na ndị ụmụnna.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIbi nwaanyị ugwu abụghị ezigbo omenala

Inyomdi

Nkenke aha onyonyo Umụada na- agbalị ihu na ezinụlo nna ha nwere udo

Nke a bụ otu ụmụnwaanyị a na-alụ n'obodo ọbụla.

Ha na-etinye karị aka n'okwu gbasatara ụmunwaanyị ibe ha alụrụ n'obodo.

Kama ọbụghị obodo niile nwere otu ụmu nwaanyị a.

Otu Ọgbọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị otu ọgbọ na-agba mbo ihu na ndi otu ha na-erube iwu obodo isi

Mgbe nwata toruru ihe dịka afọ iri maọbụ iri na abụọ, ototuola ibanye otu ọgbọ dị iche iche.

Ọ bụ otu ndị a ka ọ dịrị ihu na ndị otu ha na-eme etu iwu obodo siri di.

I ji maaatụ bụ mgbe nwoke tiri nne ya ma ọ bụ nwunye ya ihe, ọ bụ ndị otu ọgbọ ya ga-ahụ na iwu obodo mezuru maka agwa ahụ.

Otu mmnwụ, Ekpe na Ọkọnkọ

Nkenke aha onyonyo Mmọnwụ na-ekpe ikpe niile.

Mgbe mmadụ leliliri nne na nna ya, lelie ndị ọha ndi ọzọ anya, mgbe ahụ ka ndị otu mmanwụ ga-abata n'okwu.

Ndị otu mmọnwụ bụ ndị nọchitere ndị mụọ na ndị nnanna nwụrụla anwụ.

kama ọ bụghị oge niile ihe mere ka a na-eti mmọnwụ.

Mgbe mmadụ mere ihe na ezighị ezi, ma hapụ ime ihe ndị ụmunna, ụmuada maọbụ ihe ndị otu ọgbọ ya si ya mee, mgbe ahụ ka a ga-etipụtara ya mmọnwụ.

Ndị otu mmọnwụ nwere ike ita onye ọbụla ahụhu maka ihe ọ mere.

Igbu mbembe

Ufodu mgbe, mgbe ndị mmọnwụ batara n'okwu gbasara ohi.

A ga-ekpe onye ahụ ikpe i mara ma ọ bụ eziokwu ihe ha boro ya.

O buru eziokwu a ga-ata ya ahụhụ ma tinye ya ihere n'ihu.

Ụfọdụ obodo n'ala Igbo ga-agba ya ọtọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo

Kee ya ọmụ ma were ihe ahụ o zuru kee ya n'olu, kpọharịa ya obodo niile gburugburu.

Nke a bụ ka emenye ya ihere ma kwusi ya izu ohi.

Cheta kwa ilu ndị igbo sị na "Mmebọ emebọrọ ọgaranya karịri ogbugbu egburu ya".

Otu ihe doro anya bụ na onye ọbụla nwere mgbe ọkwesiri ibata na mgbe ọ na ekwesighi ibata.

Isiokwu Ndị Emetụtara