Ọrụ amalitela n'Ọdọ Ụgbọelu Enugu?
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Ọrụ amalitela n'Ọdọ Ụgbọelu Enugu?

Agbanyeghị na Minista na-ahu maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika gara Enugwu ụnyaahụ ga kụpụ aka maka malite ọrụ n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu ebe ahụ ka tọgbọ chakoo.

Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ, ọ bụ naanị okwute bụ akara ụlọọrụ PW gosiri na onwere ihe nwereike ime ebe ahụ.

Ọ bụ PW ka gọọmentị nyere ikike ịrụ ọrụ okporoụzọ ụgbọelu si efepu na-efedata.

Ndị ọzọ ji ọrụ ebe ahụ bụ ụlọọrụ ndị Chaịna bụ ndị CCECC, bụ ndị asịka ga-enwete ụme ha ga-eji kwanye ọkụ n'ọrụ ha.

CCECC na-arụ ụlọ Bekee kpọrọ "International Terminal". Ya bụ ụlọ anọọla ọdụ kamgbe amalitere ịrụ ya.

Ebumnuche ndị mmadụ bụ na PW ga-awụchị ọdọ ụgbọelu ahụ maka mmalite ọrụ taa apụtaghị ihe maka onweghị onye ọbụla dịka onye ụlọọrụ ahụ ahụrụ maọbụ nụ olu ya.

Ndị ọrụ gọọmentị nọ ebe ahụ sị na nke a abụghị na ọrụ agaghi ịmalịte ọsọ ọsọ.

Otu onye achọghị ka ekwuo aha ya sị; "Ọ ka bụ ụnyaahụ ka Minista bịara ebe a sị ka ọrụ malite."

"Unu bịa ebe a Monday unu ga-ahụ ndị ọrụ ọfụma"

Tupu BBC Igbo zọpụ njem n'ụtụtụ taa, ozi batara bụ na PW malitere ịbụga akụrụmgwa ọrụ ha a ga ọdọ ụgbọelu ahụ kemgbe izuụka gara aga.

Onye ntakụkọ BBC enweteghị akwụkwọ Bekee kpọrọ "Temporary Pass" ga-enye ya ohere ịbanye n'ime ya bụ ọdọ ụgbọelu.

Ọtụ onye na-arụ ọrụ na ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ "Federal Airports Authority of Nigeria" (FAAN) achọghị ka e dee aha ya gwara BBC na ndị ọrụ abịara n'ezie.

"Ndị ọrụ PW na-abịa. Ngwa ọrụ ha dịka n'ime "runway". Ha si ụzọ Ọdọ ndịagha elu abata. Ya mere ndi mmadụ anaghị ahụ ha n'ebe a ("terminal building").

Ka ọ kwụ ugbua, BBC Igbo ga-eso akụkọ ịmata etu ọrụ si aga na etu o si kwụrụ.