Apostolic Nuncio: Lee Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu na Thaddeus Okolo, ụkọchukwu Igbo abụọ bụ 'Papal Nuncio'

Archibishop Fortunatus Nwachukwu Image copyright Catholic Diocese of Kingstown

A na-ezitara ndị okpukpere ụka Katọlik na Naijiria ndị ndu si Vatican a kpọrọ 'Papal Nuncio'.

Ọtụtụ n'ime ha na-abụkarị ndị ọcha mana ị ma na e nwere ụmụafọ Igbo nọ na nnukwu ọkwa na mbaụwa?

Papal Nuncio maọbụ 'Apostolic Nuncio' bụ onye nnọchiteanya nke Bekee kpọrọ 'Ambassador' nke Rome na mba ndị ọzọ.

Ndị a na-eme papal nuncio na-abụkarị ndị bishọp kajara akaja na nkuzi Katọlik.

Ụmụ Naijiria atọ ma bụrụkwa ụmụafọ Igbo, bụ ndị na-anọchịte anya ọchịchị Rome na mba ụwa; Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu n'Antille, Achibishọp Thaddeus Okolo n'Ireland na Achịbishọp Brian Udaigwe n'Benin na Togo.

Ihe maghị maka Achibishp Fortunatus Nwachukwu

  • Achịbishọp Fortunatus bụ 'Apostolic Nuncio' mba na Dominican Republic, Jamaica, Antigua, Barbuda, Barbados, Bahamas, Belize, Grenada, Guyana, wdg.
  • Nwa afọ Umuokoro Egbelu Eziama Ntigha dị n'Abia Steeti rụburu dịka 'Apostolic Nuncio' mba Nicaragua,
  • E chiri ya ụkọchụkwụ Aba Diocese n'afọ 1984
  • Nwachukwu na-anụ ọtụtụ asụsụ gụnyere; Bekee, Italian, Jamani, Frenchị na Spanish

Ihe ị maghị maka Archibishop Thaddaeus Okolo

  • E mere ya 'Papal Nuncio' ndị mba Ireland n'afọ 2017
  • Ọ rụbuola dịka 'Papal Nuncio' mba ndị ọzọ gụnyere Dominican Republic, Central East Africa nakwa mba Chad
  • A mụrụ nwaafọ Anambara steeti a na Kano n'afọ 1956
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Seminarị na Bigard Memorial Seminary dị n'Enugwu
  • Francis Arinze bụ onye chiri ya ụkọchukwu n'afọ 1983

Ihe ị maghị maka Achịbishọp Brian Udaigwe(Benin na Togo)

Image copyright Catholic Diocese of Orlu
  • A mụrụ ya na mba Kamerun n'afọ 1964
  • E chiri nwa afọ Imo steeti a ụkọchukwu n'Ọlụ Diocese n'afọ 1992
  • E mere ya 'Apostolic Nuncio' mba Benin n'afọ 2013

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Fada Festus Ezeamaka kwuru maka mwakpo awaporo ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara