Aishatu Mohammed: 'A bụ m nwata afọ 16 na-agaghị akwụkwọ oge m lụrụ Gọvanọ Bauchi'

Aishatu Mohammed Image copyright other

Nwunye aka na-achị Bauchi Steeti bụ Aishatu Mohammed ekwuola na ya agabeghị akwụkwọ n'oge ọ gara ije di.

Dịka ụlọọrụ News Agency of Nigeria (NAN) siri kọọ, Aishatu kwuru nke a na Bauchi n'ụbọchị Satọde bụ abalị itoolu n'ọnwa Nọvemba n'ogige "Naija Youth Talk" bụ nke Bauchi steeti na United Nations Children Fund (UNICEF) hiwere.

Ọ sị; "Anyị dị 100 n'ụlọ anyị. O nweghi onye gara akwụkwọ n'ime ha. Ọ bụ ka m mụchara nwa atọ m ka m malitere ịga ụlọakwụkwọ."

"Nke a bụ makana nne na nna anyị ekwenyeghi na nwa nwaanyị kwesiri ịga akwụkwọ.

"A gbara m mbọ ịga akwụkwọ mana ha ekweghi. Ka m mụrụ nwa nke ato m, a gwara m di m ka ọ chọtaram onye nkuzi.

"E mechara ma gaa sekọndịrị. Taa, e jim asambodo Mahadum nke Abuja."

Mohammed na-akpoku ngalaba gọọmentị na ndị ọzọ ịgba ka ha mbọ hụ nne na nna matara mkpa ọ dị na ụmụ ha nwoke nakwa nwaanyị gara akwụkwọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara