NYSC Camp: 'Nwaanyị achọghị iyi 'trouser' ya kwara laa' - General Shuaibu Ibrahim

Ndị otu NYSC Image copyright Twitter/NYSC
Nkenke aha onyonyo Ndị otu NYSC

Iwu 'National Youth Service Corps' gbasara ụdị uwe ndị niile na-efe ala nna ha ga na-eyi agaghị agbanwe bụ ihe Ọchịagha Shuaibu Ibrahim bụ onyeisi ngalaba na-azụ ndị ji otu afọ efe ala Naịjirịa bụ NYSC kwuru maka mmadụ abụọ achụrụ n'Ebonyi.

Ihe e ji chụlaa ụmụagbọghọ abụọ ahụ bụ na ha jụrụ iyi uwe ụkwụ ogologo (trouser) a chinyere ha.

Ha kwuru na okwukwe ha dịka ndị ụka Kraịst megidere nwanyị iyi uwe ụkwụ ogologo.

Ibrahim gwara BBC n'ụbọchị ụka na ọ bụ eziokwu na-achụrụ ha.

Image copyright Twitter/NYSC
Nkenke aha onyonyo Shuaibu Ibrahim, onyeisi ngalaba NYSC

Ọ sị na iwu NYSC kwuru hoo haa na onye ọbụla nọ n'ime ogige ebe a na-azụ ndị na-efe ala nna ha ga-eyi uwe e nyere ya.

"Agbanyeghị ofufe onye, mmadụ niile ga-eyirịrị ihe iwu kwuru."

Iwu NYSC (section 3[8]) kwuru na onye ọbụla dara iwu ahụ ga-aga n'ihu ụlọikpe dị n'ime ogige ahụ. Ọ bụrụ na ikpe mara ya, a ga-achụla ya.

Ibrahim kwukwara na ụmụnwanyị nwere ike mee 'trouser' ha ka o buo ibu, ka ọ ghara igosi akụkụ ahụ ha niile.

Mana ha enweghị ikike ọbụla ịgbanwe ya ka ọ ghọọ uwe ukwu ụmụnwaanyị a kpọrọ 'skirt'.

Mgbe BBC jụrụ Ibrahim gbasara ndị ụka Alakụba na-eyi hijab, o kwuru na nke ahụ agaghị egbochi ha ịsọ ga njem n'ahịrị bụ nke Bekee kpọrọ 'marching'.

Ibrahim kọwara sị: "Ọ bụnadị n'ogige ndịagha Naịjirịa, a naghị eyi 'skirt' eme 'marching'."

Ọ kọwakwara na egwuregwu ndị ọzọ a na-eme n'ime ogige ebe a na-azụ ndị na-efe ala nna ha, abụghị nke e ji 'skirt' eme.

Image copyright Twitter/NYSC
Nkenke aha onyonyo Etu ịkwesịghị isi yie uwe NYSC
Image copyright Twitter/NYSC
Nkenke aha onyonyo Akwa iwu kwadoro maka ndị NYSC

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Nwa ebu n'afọ na-agba ọkada na Nnewi'

Isiokwu Ndị Emetụtara