Gastroenteritis: Ọrịa gburu mmadụ 11 n'ime ihe karịrị 317 ofesara na Lagos - Mịnịstrị ahụike

Onye ahụ adịghị Image copyright Getty Images

Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti gwara BBC na ọ bụ naanị mmadụ iri na otu nwụrụla n'ime ihe karịrị mmadụ narị atọ na iri asaa butere ọrịa gastroenteritis na-efegharị na Legọs.

Tubosun Ogunbanwo bụ onye na-achịkọta mmekọrịta mịnịstrị ahụ na ndị mmadụ, kwuru sị na ha ejikpaala ọrịa ahụ mana sị na ọ ka nwereike iselite isi ma mmiri ozuzo ka na-ezo.

Ha na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha gbaa mbọ na-edowe onwe ha ọcha ma gbaara ụfọdụ nri dị ka ihe si n'oke osimiri a na-esighi esi ọsọ.

A na-atụ ndị isi ezughi oke ịga na Naịjiria

Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru mmadụ a kpọrọ Human Rights Watch akatọọla etu e si atụ ndị isi na-ezuchaghị oke ruru puku kwuru puku ịga ma kpọchie ha ebe ha na-anọ emegbu ha na Naịjirịa.

Ha kwuru na ịtụ ịga a na mmegbu a abụghị naanị n'ụlọọgwụgwọ ka a na-eme ya, na o ruchara ma n'ụlọekpere ma nke ụka Kraịst ma nke alakụba, nakwa nke ndị ọdịnaala.

Okwu a sonyere nzọpụta ndi uweojii zopụtara ndị mmadụ nọ n'ụdịrị ọnọdụ a na steeti dị iche iche.

Ndị uweojii egbuola mmadụ abụọ

Ndị uweojii mba Rwanda agbagbuola mmadụ abụọ si mba Uganda na nso oke ala ha.

Ndị uweojii mba Uganda kwuru na ha na-enyocha ogbugbu mmadụ abụọ a ndị ogbo ha na Rwanda na-ekwu na a gbagburu maka esighi ụzọ ziri ezi gafee oke ala mba abụọ a.

Nke a e meela ya ihe karịrị mmadụ iri a na-agbagbu maka otu ihe a kemgbe ọnwa Febrụwarị.

Ndị uweojii anwụchiela onye otu ha

Image copyright Getty Images

A nwụchiela otu onye uweojii e jidere n'ihe onyonyo ka ọ na-ana akaazụ.

Ndị uweojii kwuru na ha na-ekpe Sajent Onuh Makedomu ikpe imeụlọ maka nrụrụaka.

Mana ndị mmadụ achọghị ịnụ nke ahụ, makana ha malitere ikwu na ọ bụghị taa ka ha nụwara maka 'nwụchi ndị uweojii'.

Ihe CAN gwara NYSC

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ngalaba na-achịkọta ndị ụka kraịst na Naịjirịa bụ CAN, etinyela ọnụ na nchụpụ a chụpụrụ mmadụ abụọ n'ebe ha na-efe ala nna ha n'Ebonyi steeti.

Rev Adebayo Oladeji kwuru na ekwesịghị ime ụmụagbọghọ ahụ ihe e mere ha maka nkwenye ha n'okwukwe ha. O kwukwara na ngalaba NYSC kwesịrị ịnabata ụfọdụ ihe.

Ngagharịiwe Họng Kọng,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Oge a gbara onye na-eme ngagharịiwe egbe gosiri n'elu 'nke na-eme ugbua' na Facebook

Mgbọ atụla mmadụ na mba Họng Kọng dịka onye uweojii gbara otu onye na-eme ngagharịiwe egbe.

Nke a ga-eme ya ugboro atọ onye uweojii na-agba mmadụ egbe kemgbe ọnwa Juun nosgbu a bidoro.

N'egwuregwu,

Kenneth Omeruo na Samuel Kalu so na ndị egwu Super Eagles tụgoro down n'Uyo ebe ha nọ akwado maka asọmpi ndị ga-etozu ịga Afcon nke 2021.

Mara na Naịjirịa ga-ezute Bene Repọblik n'ụbọchị Wenesde bụ abalị iri na atọ nke ọnwa a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria