World Pneumonia Day: Naịjirịa bụ mbụ na ndị ọrịa a kacha egbu ụmụaka ya

Ụmaụaka na-egwu egwu Image copyright Unicef Chad

Dịka a na-eme ncheta gbasara ọrịa Pneumonia, dọkịta Joshua Akinde ekwuola na hoha ọ bughị oyi na-ebute ọrịa ahụ.

Dọkịta Akinde kwukwara na ya bụ ọrịa na-emekarị ụmụaka makana ikike ha ji achụ ọrịa esichaghị ike.

Mana gịnị bụ Pneumonia?

Dọkịta Akinde kwuru na ọ bụ ọrịa na-emebi ngụgụ. O kwuru na mgbe nje dịka vairọs, fọngaị nakwa bakterịa gadoro ngụgụ mmadụ , ihe na-eso ya bụ Pneumonia.

Oyi a naghị ebute ya.

Akinde kwuru na ya bụ ọrịa nwereike isi n'otu onye fee onye ọzọ tụmadị ọ bụrụ nke na-ebu ụkwara nta abịa.

O kwuru na ọ bụghị oyi na-ebute ya kamana nje na-ebutekarị ya na-eme ọfụma n'ime mmiri ozizo nakwa ebe juru oyi.

Ka ị ga-esi gbochi ya

  • Gbanahụ ebe mmadụ kpakọsịrị akpakọsịrị
  • Mepesie ụzọ na mpio ọfụma
  • Na-aga ka dọkịta nye gị ọgwụgwọ zuruoke
  • Na-eri nri dị mma
  • Dowe ebe ọbụla ịnọ ọcha

Cheta na ndekọ ọhụrụ nke ngalaba UNICEF wepụtara gosiri na otu nwata nwuru kwa nkeji iri atọ na itoolu site n'ọrịa a.

O gosikwara na ụmụaka mba Naịjirịa mezuru ọnụ ọgụgụ 162,000 n'ime 800,000 nwuru n'ime afọ gara aga nke bụ ọnụ kachasị.

Onye nnọchite anya UNICEF na Naịjirịa bụ Pernille Ironside kwuru na "Pneumonia bụ ọnwụ na-egbukarị ụmụaka n'agbanyeghị na ọ dị mfe ịgwọ".

Ọ kọwara na ihe ndị na-ebutekarị ọrịa a bụ erighị nrị zuruoke, mgbarụ ikuku n'ime ụlọ site n'isi nri n'ime ụlọ nakwa mgbarụ ikuku n'ezi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara