Chika Ofili: Onye bụ nwata Igbo a ụbụrụ ya na-acha ọkụ?

Chika Ofili Image copyright Westminsterunder.org.uk

Chika Ofili bụ nwa afọ Naịjirịa bi na mba UK eritela nturugo 'TruLittle Hero' maka nchọpụta ọhụrụ o mere na mgbakọ na mwepu.

A bara nchọpụta ya 'The Chika Test' n'ihi na ọ bụ naanị ya mere nchọpụta ahụ kemgbe ụwa.

Chika dị afọ iri na abụọ meriri mmadụ anọ, ụfọdụ ndị tọrọ ya nọ n'ogo irite ya bụ nturugo.

Dịka ụlọọrụ nturugo ahụ si kwuo, Chika bụ nwata a ma ama na-anọchịte anya ụlọawkụkwọ ya n'asọmpị agụmakwụkwọ dị icheiche.

Ihe ịmaghị maka Chika Ofili

Image copyright Westminsterunder.org.uk

Chika Ofili bụ nwata dị afọ iri na abụọ na-agụ akwụkwọ na "Westminster Under School" nke dị na mba Briten.

E ji ịhụnanya o nwere na agụmakwụkwọ, ọ kachasị mgbakọ na mwepu mara ya.

Ọ kachasị mee ọfụma n'ule mgbakọ na mwepu ndị karịrị afọ iri na otu mgbe ọ ka dị afọ asaa.

Ihe onyonyo ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis

Akụkọ ndị ga-amasị gị