Onitsha Fire Update: Ndị ahịa 'Bridge Head' eweputala 25m iji rụ ụzọ ahịa ha

Ahịa gbara ọkụ n'ọnịcha n'ọnwa Ọktọba
Nkenke aha onyonyo Ahịa gbara ọkụ n'ọnịcha n'ọnwa Ọktọba

Ndị ahịa akpọrọ Head Bridge dị n'ọnịcha amalitela ịrụ ụzọ bara n'ime ahịa ahụ nke mebiri kemgbe afọ iri anọ na asaa.

Ha kwuru na ha na-eme nke a iji belata ahụhụ ha bụ ndị na-azụ ahịa na-ata ebe ahụ maka ụzọ ọjọọ.

Nke a mere na ego ha mapụtara maka ọrụ a bụ nde naira iri abụọ na ise ma kwuo na ụzọ ahụ ga-esi ebe akpọrọ 'Tinker Section' rue 'Niger street'

Dịka ụlọntaakụkọ Sun siri kwuo, onyeisi otu ndị na-azụ ahịa ebe ahụ bụ Sunday Obinze kwuru na aka gọọmentị adịghị na ya chaa chaa.

"Ọ bụ n'ihi iwu Gọvanọ Obiano nyere gbasara ụzọ dị n'ahịa ka anyị ji hibe ọrụ a" ka ọ kọwara.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?

N'aka ọzọ, gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha anụbeghị maka ọrụ a chaa chaa.

Kọmịshọna mgbasaozi bụ Don Adinuba kwuru na "nke a bụ mbụ anyị na-anụ maka akụko nke ahụ"

Ọ gbalịrị itinye anya na ya gwa anyị ihe nchọpụta ya pụtara.

Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-agbalị ịnweta ụfọdụ mmadụ n'ime ahịa ịnụ olu ha.

Akụkọ ndị ga-amasị:

Isiokwu Ndị Emetụtara