Nigeria vs Benin: Ihe bụ iwe ndị mmadụ ka a gbachara egwuregwu Naịjirịa na Benin

Ndí ndo Super Eagles na-egosi iwe ha Image copyright Getty Images

N'abalị Wenzde ka otu Super Eagles ji ọkpụ goolu abụọ merie Squirrels ndị Benin Republic mana ọkwụsịghị ebe ahụ.

Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa gara n'elu soshal midia jiri #ShameonNTA ịgosi iwe ha maka etu Nigerian Television Authority (NTA) si gosipụta ya bụ asọmpị.

Kedụzịa ihe ụmụ Naịjirịa tụrụ anya ịhụ n'asọmpị nke NTA gosiri n'igwe onyonyo ha?

Etu ihe onyonyo si di

Ụfọdụ n'ime ha tụrụ anya na agwa Kamera ha ga-adị karịa ihe ha hụrụ ụnyaahụ.

Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ dụka Fmk Abiola kwuo na Kamera ekwentị iPhone ka ya mma.

Etu esi kọwaa ya bụ asọmpị

Ihe ọzọ wuru ewu bụ maka ụfọdụ ihe onye na-akọwa asọmpị ahụ bụ 'Commentator' na Bekee kwuru.

Odogwu kwuru na commentator nke ahụ na-enye akụkọ ezighi ezi.

Ihe ndị ọzọ mmadụ na-ekwu bụ na NTA gosiri na ihe anaghị arụ ọrụ na Naịjirịa ka o kwesiri dịka Samsaon Gbenga kwuru.

Caleb Winful kwuru na ọ bụ oke nka bụ nsogbu NTA.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara