Iva Valley Massacre: Ihe mere ndị na-egwu coal n'Enugu afọ 70 gara aga

Sculpture depicting the Iva Valley Massacre Image copyright Centre for Memories

Abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ọbụla bụ ụbọchị ncheta ogbugbu e gburu ndịọrụ 'coal' n'Enugwu.

Ya bụ ihe mere n'afọ 1949. Afọ a mere ya afọ iri asaa o ji mee.

'Iva Valley Massacre'?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwaeze mba Ingland Philip, mgbe ọ bịara njem nleta n'Iva Valley na Febụwarị 1956.

N'oge ndị ọcha mba Briten na-achị Naịjirịa, 'Coal' so n'otu ihe na-enye Naịjirịa nnukwu ego.

Otu n'ime ebe a na-egwupụta coal n'Enugu oge ahụ bụ ebe a kpọrọ 'Iva Mines'.

Na Nọvemba 1, 1949, ndịọrụ gbara abụbụ ọrụ n'ihi ụgwọ ndị ọcha ji ha.

Kama ịkwụ ha ụgwọ ha, ndị ọcha nyere iwu ka e wepu ogbunigwe niile e ji arụ ọrụ ngwupụta coal na 'Iva Valley'.

Image copyright Pulse.ng
Nkenke aha onyonyo Ndịọrụ ngwupụta 'coal' na Iva Valley

Mana ndịọrụ ahụ ekweghị ka e wepụ ihe ndị ahụ.

Ha ma na ndị ọcha ga-emechi ebe ahụ ma ha wepụchaa ogbunigwe ndị ahụ.

Mgbe nke a na-eme, onyeisi ndị uweojii aha ya bụ F.S Philip nyere ndị otu ya iwu ka ha were egbe chụsasịa ndịọrụ ahụ.

Ndịọrụ mmadụ iri abụọ na otu nakwa otu onye na-agara onwe ya nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara.

Ndị nwụrụ n'Ịva Valley

Image copyright Centre for Memories
Nkenke aha onyonyo Aha ụfọdụ ndịọrụ 'coal' nwụrụ na Iva Valley

Aha ndịọrụ e gburu na ọgbaaghara 'Iva Valley' ka dị ruo taa.

Otu a kpọrọ 'Centre for Memories' nke dị n'Enugwu nyere BBC Igbo ụfọdụ aha ndị a.

Ha gunyere: Sunday Anyasodo, Livinus Okechukwuma, William Nwehu, Felix Nnaji, Ogbania Chime na Moses Ikegbu.

Ndị ọzọ bụ Okafor Ageni, Augustine Nwokoma, Onoh Onyia, James Ekeowa, Nwachukwu Ugwu, Ngwu Nwafor, Jonathan Ezeani, dgz.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ikike dịịrị onye kwenyere na ọnwụ ndịọrụ 'coal' na Iva Valley bụ ihe nlegara anya nye ndị otu ndịọrụ niile.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoal Camp Enugu ewelitala ọnọdụ njirimara ha

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala