HIV Prevalence in Nigeria: Anambara kacha nwee ọrịa HIV n' ala Igbo

Steeti ise akachasị nwee ọrịa HIV na Naịjirịa
Nkenke aha onyonyo Steeti ise akachasị nwee ọrịa HIV na Naịjirịa

Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa ori nchekwa ahụ bụ Human Immunodeficiency Virus ewepụtala etu ihe si gbata kwụrụ gbasara ọrịa ahụ na Naịjirịa.

'National Agency for the Control of Aids' (NACA) wepụtara nke a n'ọba ozi ha.

Dịka nnyocha ahụ si kwuo, ndị nwere HIV na Naịjirịa niile agbadatala otu pasentị na ụma anọ (1.4%).

N'afọ gara aga, ha dị otu pasentị na ụma ise (1.5%)

Akwa Ibom bụ steeti kacha nwee HIV na Naijiria, ebe Katsina bụ steeti opekarịị mpe.

Ndị nwere ọrịa HIV na Akwa-Ibom steeti dị pasentị ise na ụma isii (5.6%), .

Ndị na-esote ha bụ Benue steeti (4.9%), ebe Rivas steeti bụ ndị nke atọ (3.8%).

Nkenke aha onyonyo Steeti kacha nwee ọrịa HIV na mpaghara ọwụwa anyanwụ

Na mpaghara ọwụwa anyanwụ, Anambara steeti kacha nwee ndị nwere ọrịa HIV.

Ndị nwere ọrịa ahụ n'Anambara dị pasentị abụọ na ụma anọ (2.4%).

Enugwu (2.1%) na Abịa (2.1%) bụ ndị nke abụọ na nke atọ.

Mpụtara ule waec agbaala

Image copyright Waec

Ngalaba na-ahụ maka ụlọ sekọndrị bụ Waec ewepụtala mpụtara ule ahụ nke ngwụcha afọ.

N'ime mmadụ puku itoolu na anọ na ụma (94,8840) lere ule ahụ, mmadụ puku iri anọ na itoolu na ụwa ( 49,679) ndị bụ pasent 52.36 mere ọfụma na sọbjet ise gụnyere maọbụ gụpụ®ụ 'English' maọbụ 'Mathematics.'

Naanị pasent 35.10 ndị lere ule ahụ nwetara mpụtara ndị mma na sọbjet ise gụnyere 'English' na "Mathematics."

Ntuliaka Bayelsa na Kogi

Image copyright Facebook
Nkenke aha onyonyo David Lyon na Duoye Diri

Ugo eberela na mgbagbu na Kogi nakwa Bayelsa Steeti ebe a ga-enwe ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na Satọdee.

Ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eso zọọ ya bụ ntuliaka.

Image copyright Facebook
Nkenke aha onyonyo Yahaya Bello na Musa Wada

Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ otu APC maọbụ PDP ka ọkwa ahụ ga-agara.

BBC Igbo ga na-ewetara gị etu ya bụ ntuliaka si aga n'uju.

Ọba nchekwa ahụ nwaanyị

A gbapeelaa ọba nchekwa ebe ndị mmadụ nwere ike ịga kirie ma mụtakwa ihe gbasara ahụ nwaanyị na London.

Ndị rụrụ ụlọ nkiri a kwuru na ebumnuche ha bụ iji kọwara ndị mmadụ ihe gbasara ahụike ụmụnwaanyị.

Dickson Etuhu ọ ga-aga nga?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Dickson Etuhu played at the World Cup and the Africa Cup of Nations for Nigeria

A ga-aga ụlọikpe mkpegharị n'isi Dickson Etuhu gbabuuru Naịjirịa bọọlụ, bụ onye e jidere ka ọ na-anwa ịzụ maachị.

Ma ndị gbara ya akwụkwọ ma ndị ọkaiwu na-anọchite anya ya ekwuola na ha ga-achọ ka e kpegharịa ikpe ya ka a chọtachara ya ihe n'aka.

N'ụbọchị 13 nke ọnwa Nọvemba 2019, ụlọikpe mkpegharị dị na Stọkọlm kwuru na o doro anya na Etuhu na otu onye ọzọ na-agbabu bọọlụ nwara ịzụ maachị site n'aka oche goolu otu egwuregwu AIK bụ Kyriakos "Kenny" Stamatopoulos, n'afọ 2017.

N'aka ọzọ,

Marakwa na otu Dream Team bụ ndị na-anọchite anya Naịjirịa n'Olimpiks ga-ezute ma nwee ohere ịzọkasị Saụt Afrịka n'asọmpi abalị Fraịdee.

Asọmpi a nke eji etozu maka Olympics 2020 ga ebiri ọkụ n'elekere asaa nke mgbede Fraidee.

Ụgbọelu kụrụ afọ n'ala n'Enugwu,

Ngalaba ndịagha ụgbọelu Naịjiria ekwuola na ọ bụ eziokwu na otu ụgbọhelịkọpta ha dara kpọkasịa n'Enugwu, kama na enweghi onye merụrụ ahụ.

Ha kwuru na ha na-enyocha ihe butere ya bụ ihe mberede.

Aisha Buhari na-ewu,

Iwe ji ndị mmadụ na soshal midia makana nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari so arịọ ndị Kogi steeti mgbaghara maka gọvanọ ha.

Nke a mere ka a kpụrụ ya n'ọnụ kemgbe.

N'ofesi,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị mba Họng Kọng malitere ngagharịiwe ọnwa ise gara aga

Mba Họng Kọng adabanyela riseshọn mere ya nke mbụ n'ime afọ iri, ka ngagharịiwe ha mewere kemgbe ọnwa Juun afọ a ka na-ebiri ọkụ.

Akụkọ si mba ahụ apụta kwuru na akụnaụba obodo ha ji ihe ruru pasentị atọ na ọma takpọọ ebe ngwụcha Septemba karịa etu ọ dị n'ọnwa ndị gara aga.

Boko Haram eriela mbombo ọsọ ka agha tara isi ndị otu ha 13

Image copyright Getty Images

Ndịagha Naịjiria egbuola ndị Boko Haram iri na atọ ma merụọ ọtụtụ ahụ mgbe otu abụọ a kwatara ya n'obodo Mallam Fatori dị na Borno steeti.

Ka ndị Boko Haram riri mbombo ọsọ, ndịagha tụtara ọtụtụ ngwaagha gụnyere ogbunigwe, egbe ruru iri asatọ nakwa uwe ndị agha.

Ntuliaka Kogi steeti,

Gọvanọ Nasir El-Rufai nọ na-ebe ndị APC na-eme nkwado maka ntuliaka rịọ ndị Kogi steeti ka ha gbaghara gọvanọ Yahaya Bello n'ụzọ ọbụla o si mejọọ ha.

Nke a na-abịa dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa gọvanọ na Kogi steeti na Bayelsa n'ụbọchị satọdee.

N'ofesi,

Image copyright CBS
Nkenke aha onyonyo A gbachiela ụlọakwụkwọ ahụ na ndị ọzọ dị ya nso

Ụmụakwụkwọ abụọ anwụọla ebe mmadụ atọ merụrụ ahụ ka otu nwoke gbawara egbe n'ụlọakwụkwọ dị na Santa Clarita dị na Kalifonia na mba Amerịka.

Ndị uweojii na-eche na ọ bụ nwata gbara afọ iri na isii nke ọ bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya, kpara arụ a.

N'egwuregwu,

Image copyright PA Media
Nkenke aha onyonyo Federer meriri Djokovic

Roger Federer apịapụla Novak Djokovic n'asọmpi tenis bụ ATP nke a na-eme na Lọndọn.

Ka ọ dị ugbua, Federer ga-ezute onye meriri n'etiti Rafael Nadal na Stefano Tsitsipas.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala

Isiokwu Ndị Emetụtara