Nnamdi Azikiwe: Kedụ ihe i ji mara 'Zik of Africa'?

Azikiwe Image copyright Getty Images

Nnamdi Azikiwe so n'ime otu n'ime iri a ga-akpọpụta aha ha ma a kọwa akụkọ etu Naịjirịa si nweta nnwereonwe ha n'aka ndị Briten.

Azikiwe nke a na-etu 'Zik of Africa' gaara adị afọ 115 n'afọ 2019 a ma ọ bụrụ na ọ ka dị ndụ ugbua.

Azikiwe tupu ọ nwụọ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Mee afọ 1996, bụ otu nwoke kpu ọtụtụ okpu n'isi ya n'ihe gbasara dimkpa tozuru etozu.

A bịa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, o so na ndị ndị ọcha nyefere ọchịchị Naịjirịa n'afọ 1960, a bịa n'agụmakwụkwọ, ọ bụ dike; a bịakwanụ n'ogologo na mma nwoke, ọ kwụ chịm.

N'ihi ụdịrị agba o nwere na Naịjirịa ka e ji nwee ihe ndị e tinyechara iji wee na-echeta ya.

Ihe ndị a gụnyere ihu ya e biri n'elu ego naịra narị ise (N500), ọdọụgbọelu e si efepụ na Naịjiria dị n'Abuja, mahadum dị n'Ọka, Anambara steeti, ọgbọegwuregwu dị n'Enugwu steeti, ụlọọbaakwụkwọ dị na mahadum Nsụka, dgz.

Ude ya degidere wee gafee Naịjirịa, garuo mba Tanzania ebe a gụrụ otu ụzọ dị n'obodo Dar es Salaam aha ya, nakwa otu ụlọ dị na mahadum Lincoln dị na mba Amerịka bụ nke aha ya na Kwame Nkrumah dị na ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ezenwaanyị Elizabeth bubara ya n'ọkwa Privy Council nke mba Briten

Ihe ị kwesịrị ịma maka Zik

  • A mụrụ ya n'obodo Zungeru dị na Naịja steeti n'ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba nke afọ 1904.
  • Ọ na-asụ Igbo, Yoroba na Awụsa.
  • Ọ hibere ma bụrụ onye nwe akwụkwọ mgbasaozi a kpọrọ "West African Pilot".
  • O dere ọtụtụ akwụkwọ nakwa akụkọ mgbasaozi, karịrị iri abụọ
  • Ọ bụ onye isi ojii Afrịka mbụ ga-akuzi na mahadum Lincoln dị na mba Amerịka.
  • Zik sọrọ mpi n'ihe egwuregwu dịka ịgba bọọlụ, ịpịa ọkpọ, igwu mmiri, ịpịa tenis nakwa ihe ndị ọzọ.
  • Zik banyere n'otu Agbalanze ndị Ọnịcha n'afọ 1946.
  • E chiri ya Owelle-Ọsọwa-Anya nke Ọnịcha n'afọ 1972.
  • Ọ chịrị dịka gọvanọ-gburugburu site n'ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba 1960, ruo afọ 1963 mgbe ọ malitere ịchị dịka onyeisiala mbụ Naịjirịa nwere ruo 1966 mgbe ndịagha ji ike were ọchịchị
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ Azikiwe bụ onyeisi pati ndọrọndọrọ bụ National Council of Nigeria and Cameroon (NCNC)

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKing Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12