Nigeria vs Lesotho: Super Eagles sị ka ha foo Agụiyi ndị Lesotho ajị

Victor Osimhen nyere goolu abụọ Image copyright Getty Images

Super Eagles nke Naịjirịa pịara Aguiyi ndị Lesotho ụtalị ka ụmụaka mgbe ha zutere n'asọmpi itozuoke Iko Mba Afrịka nke afọ 2021.

N'agbanyeghi na Aguiyi Lesotho bu ụzọ taa Naịjirịa arụ sịte na goolu Masoabi Nkoto nyere na nkeji 11.

Super Eagles tetara n'ụra mgbe Alex Iwobi sara goolu ahụ na nkeji 26.

Tupu Lesotho amara ihe na-eme Naịjirịa malitere pịawa ha ụtalị na nkeji 28, mgbe Samuel Chukwueze nyere goolu ọzọ.

Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Victor Osimhen zakwara aha na goolu abụọ ndị o nyere na nkeji 75 na 85.

Dịka ọ fọrọ tịkọm tịkọm ole ka e gbuchie bọọlụ, Chidozie Awaziem kpọrọ ụkwụ ọcha wụnye goolu na neetị ndị Naịjirịa.

N'ikpeazụ Naịjirịa ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ merie Lesotho.

Ọkparaeze Andrew agọrọla aka ya

Okparaeze Andrew bụ nwa atọ nke ezenwaanyị Elizabeth mba Briten ekwuola na o nweghi ncheta maka ịwakpo otu nwaanyị onye mba Amerịka.

Nwaanyị ahụ enyere aha ya dịka Virginia Guiffre boro ọkparaeze Andrew na ọ wakporo ya mgbe ọ dị afọ iri na asaa.

Mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ, Andrew kọwara na ụbọchị nwaanyị ahụ kwuru na ọ wakporo ya, na ya na ezinaụlọ ya nọ na be ya na-ezuike.

O kọwara na o nweghi eziokwu dị n'akụkọ nwaanyị ahụ na-akọ maka mwakpo.

Gọvanọ ọhụrụ abụọ ga-apụta taa

Taa bụ ụbọchị Inec ga-agụpụta mpụtara ntụliaka ọkwa gọvanọ emere na steeti Kogi na Bayelsa.

Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Festus Okoye ekwuola na ntuliaka ụbọchị satode gara ọfụma nakwa na ọgbaghara dara n'agbanyeghi ihe niile ha nwara.

Okoye kwukwara na enwereike ịkagbu mpụtara vootu n'ebe enwere akụkọ ịzụ igbe vootu nakwa ịchụsasị ndị mmadụ.

Gwunye nu na BBC Igbo iji nụ akụkọ ndị ka o si dị ọkụ.

A kụpụla Federer na ATP

Image copyright AFP

Stefano Tsitsipas akụpụla Roger Federer n'ihe ịtụ anya n'asọmpị ATP nke na-aga ugbua na mba Briten.

Nke a pụtara na Tsitsipas ga-ezute Dominic Thiem n'asọmpị ikpeazụ nke ATP.

Ihe onyonyo ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbo Language: Gịnị bụ 'Blue' n'asụsụ Igbo?

Gee nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji