Fasting: Ibu ọnụ ruo abalị 40 ọ na-egbu mmadụ?

Ibu ọnụ na-abụkarị atụmaatụ ndị okpukpere dị iche iche ji akwado ekpere ha.
Mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na o nwere ụdịrị ibu ọnụ ga-abụ mmadụ mee, o butere onwe ya nsogbu.
- Kpeerenu Nigeria ekpere ma buoro ya ọnụ - CAN
- 'Anyị biacha ekpere onye ọgwụgwọ nsọ edina anyị'-Ụmụnwaanyị 9
Ụkọchụkwụ Paul Chikwem bụ onyeisi n'ụlọụka Christian Pencticostal Church dị na Festac kwuru na ibu ọnụ dị mma maka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraist.
O kwuru na ibu ọnụ dị n'ụdị n'ụdị dịka nke gụnyere isi n'ụtụtụ ruo na mgbede, iṅụ sọ mmiri , iri sọ ụfọdụ nri nakwa etu ọbụla onye na-achị ya si kpata.
Mana ọ dụrụ ọdụ sị na ibu ọnụ karịghala nke a ga-ebi ụbọchị ahụ maọbụ gụnye erighị aṅụghị ma ncha ruo ihe gafere ụbọchị iri abụọ na otu, e kwesiri ịkwadoro ya ọfụma site n'ime ihe ndị a.
- Inyocha ahụ gị n'aka dọkịta ga-agwa gị ma ị ga-emeli ya.
- Ị nọ n'otu ebe ịgaghị na-arụ ọrụ maọbụ na-agbakasị ahụ
- Marakwa maọbụ Chukwu si gị mee ya
- Emeela ya ka iwee maa aka
- Kebie ya ekebi
Akụkọ ga-amasị gị
- Ihe mere ndị na-egwu coal n'Iva Valley dị n'Enugu afọ 70 gara aga
- 'Obi dị anyị ụtọ na-atọghapụrụ Fr. Theophilus'
- Ugo Nigeria atụgbuola ọsa Benin Republic
Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi