Lion House: 'E si na mba Kamerun wee zubata ọdụm a hụrụ n'ụlọ anyị'- Onye nche

Ọdụm

Akụkọ na-eru anyị nti gbasara ọdụm achọpụtara n'ụlọ nwoke bị na Victoria Island dị na Lagos anọrọla bụ na ụlọ anụmanụ dị na Lekki.

Onyeisi ngalaba Task Force akpọrọ 'Lagos State Environmental Sanitation & Special Offences (Enforcement Unit) LASESSO.' bụ Yinka Egbeyemi kwuru na onye nche ụlọ ebe ahụrụ ya bụ anụmanụ na-anọ

kwuru na e si mba Kamerun wee zubata ọdụm ahụ.

O kwukwara na anwụchiela onye nche ụlọ ahụ.

Etu o si kwụrụ ugbua ọ sị na ha na-eche ka were nwoke India ahụ kpọnye ndị uweojii Lagọs steeti.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNke a ọ bụ ọdụm na-eche mba?

Kedu iwu agwa a nwoke a kpara megidere?

Okaiwu Goddy Uwazurike kwuru na nwoke dara iwu ndị a

Ndị ọrụ Lagos steeti akpọrọ "Lagos Task Force Team" awụchiela n'ogbe 229 Muri Okunola Street, Victoria Island ịgba ọdụm na-eche be otu nwoke India ọgwụ.

Akụkọ pụtara na ndị bi n'ogbe na-eti mkpu maka etu nwoke India si were ọdụm na-eche be ya.

Lee ụfọdụ foto ndị ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ setere.

Ụfọdụ ndị bi n'agbataobi pụtara na-ekiri ka a ga-esi gba ọdụm ahụ ọgwụ ụra.

Ndị ọrụ gọọmenti Lagos steeti gakwara n'ihu mado akwụkwọ gosiri na nwoke ahụ ji ọdụm eche ụlọ ya dara iwu obodo.

Lekwa ihe ndị ọzọ mere n'onyonyo anyị ka na-abịa nakwa akụkọ.

Akụkọ ga-amasị gị: