Zamfara state: Ndị amakekwu agbagbuola mmadụ 14

Ala arụọla na Zamfara

Ebe ọkụ gbara Image copyright Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị taa bụ na ndị amakekwu awakpola obodo Karaye dị na Zamfara steeti gbuo mmadụ iri na anọ ma mụnye ọtụtụ ụlọ ọkụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Muhammad Shehu sị na ndị omekome a ji ọgbatumtu bata na ya bụ obodo kpọpere egbe ha gbawa ewu na ọkụkọ nọchiri ụzọ.

Shehu sị na ha na-eche na ọ bụ mbọ ka ndị ahụ bọrọ maka ndị nche obodo ahụ mere ha bụ ebe ha gbara ha tọọtọọ ọnwa gara aga.

Mmadụ asat nwụrụ na Lokoja

Image copyright PoliceNG

Gwongworo bu mmanụ ụgbọala egbuola mmadụ asatọ na Lokoja, Kogi steeti dị ka ọ kụrụ ụgbụọla ndị ọzọ.

Ọkụ si na ya gbara ọtụtụ ụgbọala ndị ọzọ nakwa keke dị n'okporoụzọ Felele n'isiobodo ahụ.

Akụkọ kwuru na ya bụ mkpamkpa kpara n'ụtụtụ Monde ka gwongworo bu ya bụ mmanụ ụgbọala tụrụ agwa ọcha dakwasara keke anọ, ọgbatumtum abụọ nakwa ụgbọala anọ, dịka ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii na steeti ahụ bụ Emmanuel Abe si kwuo.

Abe sị na "Ihe a metụtara mmadụ iri na asaa; ebe mmadụ asatọ nwụnyụrụ anya pịị, mmadụ asaa ndị ọzọ nọ n'ụlọọgwụ Federal Medical Centre Lokoja anata ọgwụgwọ".

Ndị ọrụ mmenyụọkụ gakwara ebe ahụ gbanyụọ ya bụ ọkụ tupu o mebie ihe karịa ka o mere.

E nwere ike ịwe ọkụ n'isi unu mgbe adịghị anya

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Otụtụ ndị Naijiria na-atụ arịrị okpokpo ụgwọ ndị PHCN na-enye ha kwụọ kwa ọnwa

Ọchịchị ga-agba ebe niile na Naịjirịa mgbe adịghị anya.

Nke a bụ onu odeakwụkwọ ndị Nigerian Electricity Generation Companies bụ Joy Ogali.

Joy sị na ọ bụrụ na gọọmenti etiti adoghị Nigerian Bulk Electricity Trading Company aka na ntị maka oke iwu ha na-etiri ha, na ha ga agba abụbụọrụ.

Trump sị na ya na-eche maka ịza ụlọikpe oku

Image copyright Reuters

N'ofesi, onyeisiala Amerika bụ Donald Trump ekwuola na ya dị njikere ị ga zara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ebubo a na-ebo ya.

Trump sị na ihe ya ji echesi ya bụ echiche ike bụ ka ndị omeiwu nwee ike ịdowe nke ahụ n'ụsọ tinye uche na oge n'ezigbo ọrụ.

Spain na Romania ga-ekwe n'aka

Image copyright AFP/Getty Images

Obi awaala otu egwu bọolụ Romenia mmiri dịka ha ga-ezute Spain taa.

Echetere na Spain gbara malta ọkpụ asaa chara acha n'izu gara aga.

Gee akụkọ anyị na otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Obi dị anyị ụtọ na-atọghapụrụ Fr. Theophilus - Ụlọụka Katọlik

Image copyright Theophilus Okwuchukwu Ndulue/Facebook

Ụlọụka Katọlik ekeela chineke n'isi Fr. Theophilus nke ndị ntọ tọghapụrụ n'Enugwu.

Benjamin Achi bụ onyeisi mgbasaozi n'ụlọụka katọlik n'Enugwu gwara BBC nke a n'ozi ekwentị.

"O nweghi ihe ọzọ n'abụghị ikele chineke na ọ natara n'udo" ka o kwuru.

Ezinaulo father Theophilus Ndulue ekurula ume ndụ ugbua dịka ndị ntọ ntọrọ ya tọghapụrụ ya n'ụbọchị ụka.

Cheta na a tọrọ Fr Theophilius na mgbede Fraide mgbe o si nzụkọ ụlọụka alaghachite n'Enugwu.

Na Legọs,

Ọ bụ taa ka otu na-ahụ maka nchekwa mbaraezi na Legọs kwuru na ha ga-kpụrụ ọdụm n'eche ụlọ mmadụ na mpaghara Victoria Island dị na Legọs.

Ndị agbatobi n'ebe ahụ chi obi ha n'aka dịka nwoke ahụ bụ onye India ji ọdụm na-echekwa ụlọ ya.

Ihe na-eme n'Afrịka

Image copyright AFP

Mba Fransị enyeghachile mba Senegal mma agha dị mkpa nke ha were kemgbe afọ narị ole na ole gara aga.

Fransị sị na ha mere nke a iji mezu nkwa ha kwere ịnyeghachi ụfọdụ mba Afrịka ngwa omenala ha ha buru na mbụ.

Ọzọ ndị agha mba Burkina Faso egbuola mmadụ iri atọ na abụọ echere na ha bụ ndị na-eyi ndụ egwu na mba ahụ.

Akụkọ kwukwara na atọghapụrụ ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ahụ ji dịka ohu mmekọ ahụ n'ịkpa Yorsala.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Onye nkuzi otu Lesotho bụ Thabo Senong ebunyela Super Eagles Naịjirịa ụkpa ekele dịka ha merichara ha.

Senong gwara ndị ntaakụkọ na "anyị na otu dị mma sọkọtara mpi, ha merie".

Ọ bịara dịka ugo Naịjirịa atụgbuola agụiyi Lesotho dịka ha kwatara ya n'abalị sunde iji ma onye tozụrụ ịga asọmpị AFCON n'afọ 2021.

Ọ bụ ọkpụ goolu anọ asatara abụọ ka Naịjirịa ji nwere mmeri ahụ.

Na ntuliaka Bayelsa na Kogi

Ọgbakọ Yurop bụ EU ekwola ebumnuche ha gbasara ntuliaka emere na Bayelsa na Kogi na ngwucha izuụka.

Ha kwuru na ha nwere ihe akaebe na a zụrụ vootu, zuo igbe vootu nakwa gbuo ọtụtụ ndị mmadụ. Ha tiri ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ aka n'obi.