Nigeria to Dubai: Ihe na-akpọga ndị Naịjirịa Dubai

Marina Dubai Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Dubai nwere ụlọelu kachasị ogologo na mbaụwa niile bụ nke a na-akpọ Burj Khalifa

Dubai bụ ezigbo ọzara ihe dịka afọ 50 gara aga, mana ugbua ọ bụzị obodo ụwa niile na-eto maka ọganihu na mmepe obodo.

Obodo a dị na mba United Arab Emirates (UAE), ebe ọ bụ isiobodo Dubai Emirates.

Ọ bụ Sheikh Rashid bin Saeed Al Maktoum malitere ịchị Dubai n'afọ 1958 bụ onye malitere mmepe Dubai, mana mmanụ agbịdị achọtara n'obodo ahụ n'afọ 1966 nyerela ha ezigbo aka.

Ego mmanụ agbịdi a banyere ọrụ were mee Dubai ihe ọ bụ ugbua.

Ihe mere ndi Naịjirịa ji awụba Dubai

Onye na-anọchịte anya Dubai na Naịjirịa bụ Dọkịnta Fahad Al Taffaq, kwuru na ihe ruru mmadụ nde iri na ise (15m) na-aga obodo ha kwa afọ.

Ọtụtụ n'ime ndị a na-aga Dubai bụ ndị Naịjiria.

Mana gịnị ka ndị mmadụ na-achọ aga mba ahụ? Lee ihe ndị anyị chọpụtara na-akpọga ha.

1) Dubai na-anabata ndị mmadụ

Al Taffaq sị na ọ bụ etu ndị obodo ahụ si anabata ndị Naịjirịa mere ha ji abịa ebe ahụ n'ike n'ike.

Ọ sị na ihe ruru ndị si mba 200 bi na Dubai na-akpọ ya be ha nke abụọ.

Dubai bụ ebe e si aga mba dị iche iche.

Taata, Dubai bụ ihe Bekee na-akpọ "hub" e si aga Chaịna, Indịa, na mba dị iche iche.

Al Taffaq sị; "Anyị na-akpaso ndị mmadụ agwa ka ha abụ mmadụ, agbanyeghị ebe ha si bịa na ofufe ha. Ihe a bụ etu anyị dị."

2) Dubai bụ nnukwu ahịa

Image copyright Instagram/@davidoofficial
Nkenke aha onyonyo Davido na Zlatan bụ otiegwu na Naịjirịa gara gbaa ndị Dubai ezigbo aka ahịa

Na Dubai, ịzụ ahịa bụ ihe dịrị ndị mmadụ mfe. Onye ọbụla chọrọ ịzụ ahịa ga-ahụrịrị ebe ọ ga-anọ zụọ ya n'obodo ahụ.

Ọtụtụ ndị na-aga ebe ahụ na-ekwu na ngwaahịa adịghị ada oke ọnụ ebe ahụ.

Ọzọkwa bụ na ha na-emekarị ihe Bekee na-akpọ "sales". Nke a bụ oge ndị na-azụ ahịa na-ewetu ego ngwaahịa iji mee ka ọtụtụ mmadu bịa goro ha.

Gọọmentị Dubai na-emekwa ihe niile ha nwereike ime iji hụ na azụmahịa na-aga etu o si kwesi.

3) Dubai b ebe a na-aga nlegharị anya

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkụ dị n'ụlọelu Burj Khalifa na-agbanwe ma a na-enwe nnukwu mmemme kwa mgbe

Dubai mepere ọfụma nke mere ọtụtụ mmadụ ji na-abịa ya ime nleghari anya.

Ụfọdụ ji maka ya ekwu sị "ebe obodo a mara ụdịrị mma a, kedụ ka eluigwe ga-adị".

Ụlọ kachasị ogologo n'ụwa dị na Dubai.

Ha chọkwara obodo ahụ mma nke ukwu ma na-edowe ya ọcha.

Nke nwereike na-amasị ndị Naịjirịa bụ na ọkụ latrik na-enwu ebe ahụ gbanyụụ.

4) Ndị Dubai ji ihe ha nwere kpọrọ ihe

Image copyright Getty Images

Dubai nwere ọzara, ebe ihe ọbụla anaghị eto. Ebe ahụ bụ sọsọ aja dị ya, nke Bekee na-akpọ "desert".

Ha ji ebe ahụ mere ebe ndị mmadụ na-aga eme nlegharị anya nakwa eme egwuregwu, bụ nke ha na-akpọ 'desert safari'.

Ha nwekwara ụdịrị ebe Bekee kpọrọ "Beach" ha na-edowe ọcha ma na-arụzi ya na-eme ka ịnọ na ha na-agụ ndị mmadu agụụ.

Naịjirịa nwekwara ụdịrị ihe ndị a mana ha anaghị edowe ha ọcha maọbụ hazie ha etu o si kwesị.

5) Ihe eji egwuregwu b atụrụ tawa n'obodo a

Image copyright Intagram/@tobibakare

I chọrọ isi n'elu ụgbọelu mapụ?

Ị chọrọ isi n'elu ụlọ elu mapụ?

Ị chọrọ igwu mmiri n'ime osimiri maọbu rahụ n'ụlọ dị n'okpuru mmiri?

Dubai nwere ebe a na-eme ọtụtụ ihe ndị a niile na ndi ọzọ dị etu ndi kachasị mma n'ụwa dị.

Etu eji achụla nd mmadụ na Dubai

Na-agbanyeghi na Dubai na-anabata ndị mmadụ, ha na-agbarụkwa ihu ma mmadụ merụọ iwu ha.

Onye merụrụ iwu ha nwereike hụ onwe ya n'ụzọ nlata.

Lee iwu abụọ Dubai nwereike iji chụla mmadụ:

1) Iwu ụlọikpe: Nke a na-efesa ndị dara iwu nwetere ikike ya n'usoro ụlọikpe Bekee kpọrọ "Legal Deportation".

Dịka iwu UAE siri kwuo, usoro a na-adị ire n'ihe banyere mwakpo mmadụ n'ụdịrị mmetụ ahụ.

2) Iwu gọọmentị: Nke a metụtara ịchụla mmadụ makana ọ bu ihe obodo chọrọ.

Ihe nwereike ibute nke a bụ ihe metụtara ahụike obodo, nchekwa nakwa ime arụ. Ndị mbịarambịara na-enweghi ihe ha na-arụ na Dubai nwekwara ike hụ onwe ha n'ụdịrị ọnọdụ ndị agbara akwụkwọ ụla a.

Ndi UAE chụo gị, ịlaghachịte mba ahụ ga-ara gị ezigbote ahụ. Ọ bụ nanị Minista na-ahụ maka obodo ga-enyenwu gị ikike ị ga-eji batakwa ọzọ.

Gaa ebe a ka ị nwete akụko ndị ọzọ banyere ọchụchụ mmadụ na mba a.