World Toilet Day: Iji mmiri maọbụ iji ihe hịcha otele gị bụ ajụjụ ụwa kpụ n'ọnụ

Mposi ntukwu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mposi a na-etukwunye na-eme ka nsi pụta siriri werere

Ọ ka na-atụ ndị mmadụ n'anya etu ọtụtụ bi na mba ofesi si ejikarị tishu ehichaa otule ha karịa ma iji mmiri sachasịa ma ha gacha mposi.

Ụfọdụ, iji mmiri sacha ike marala ahụ na-ajụ kedụ ka ị ga-esi nwere naanị tishu hicha mmetọ nsi yiri nrị ndị bekee akpọrọ chokoleti.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWorld Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ'

Ọ bụ eziokwu na tishu akpọghị nkụ dịka igwe eji emepụta mposi mana mmiri kacha dị nro n'isachapụ otule ma ị gacha mposi

O teela aka ndị bi mba dị iche iche na-eji mmiri asachasị ike ha ma ha gacha mposi.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke a na-abụ ihe ụfụ nye ụfọdụ

Mba kachasị eji mmiri asacha otule

UK na US bụ mba kachasị eji tishu ehicha ike dịka Barbara Penner si depụta n'akwụkwọ ya na-egosi etu esi asa ahụ.

Mana mmiri bụ ihe ndị mba ụka alakụba ji asachakarị otule makana okwukwe ha kwadoro ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWorld Toilet Day: Ka nwa gị ga-esi mụta ị ga mposi n'ọnwa isii

Dịka Zul Othman si chọpụta, ọ bụ ndị ụka alakụba nọ na Australia na-eji karị akwụkwọ mposi ehicha otule.

Mana ọbụghị naanị ndị ụka alakụba na-eji mmiri asacha otule maha gacha mposi.

Kaiser Kuo bụ otiegwu ama ama kwuru na ụjọ biara ya mgbe ọ chọputara akwụkwọ mposi ndị bi n'Amerịka na-adọrọ ehicha ike kwa afọ.

The longest 'toilet paper trails'

Annual per capita consumption in rolls

CountryToiley rolls per person
USA141
Germany134
UK127
Japan91
Australia88
Spain81
France71
Italy70
China49
Brazil38
Source: Natural Resources Defense Council

Ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na tishu na-afụchị mposi ọsịsọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Americans are by far the world's highest consumers of toilet paper

Itukwu nyụọ nsi na ịnọdụ ala nyụọ nsị?

Nke a bụ okwu a ka adọgha n'ụwa kịta.

Mana a na-ekwu na ụzọ abụọ n'ime atọ ndị bi n'ụwa ka na-etukwu anyụ nsi ruo ugbua.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionToilet Posture:Lee ka ị ga-esi ga mposi ọfụma na-achịghị nsị

A bịa na-etu ahụ si arụ ọrụ, itukwu ala nyụọ nsi kachasị mma karịa ịnọdụ 'n'oche eze' mposi.

Itukwu nyụọ nsi ga-eme ka ọ pụta siriri werere.

Akụkọ ndị ga-masị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbos in UK: Lekwa ka ndị Igbo bi na Liverpool si emepụta omenaala Igbo

Isiokwu Ndị Emetụtara