Grammy nominations 2019: Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite ya?

Burna Boy Image copyright Getty Images

Ị ma na Burna Boy nke Naịjirịa abanyela na ndị nwereike inweta ntụruugo kachasị n'egwu bụ Grammy?

E debanyere ọbaegwu ya ọ kpọrọ 'African Giant' n'ogogo ndị nwereike inweta 'ọba egwu kachasị mma n'ụwa' nke bụ 'Best World Music Album na Bekee'.

Nke a ga-eme ya mbụ Burna Boy ezigbo aha ya bụ Damini Ogulu, na-abanye na ndị nwereike irite nturuugo Grammy a.

Mana ọ bụghị ya bụ onye Naịjirịa mbụ na-enweta ohere a; ndị dịka King Sunny Ade, Fela Kuti, Femi Kuti na ndị ọzọ.

'Soshal midia bill'

Gị na-eji soshal midia achọ ndị mmadụ okwu, ị nwereike ịbanye na nsogbu ma e tinye iwu a.

Ị chetara iwu megidere okwu akpọmasị ndị ụlọomeiwu ukwu tiputara n'izu gara aga nke a sị na ikpe ya bụ ikpe ọnwụ? E bufekwaala ya ngụpụta nke abụọ ugbua.

Obiano na-akasi ndị ahịa Ọchanja obi

Aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano etiela ndị ọkụ gbara ihe ha n'Ọchanja metụtara aka n'obi ma kwuo na enweghị ụdịrị ego ọ sọrọ ya bụrụ, nwereike ịkpọghachite ndị nwụrụ anwụ.

Obiano kwuru nke a ka o du ụfọdụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'Anambara steeti gaa ekpere maka akwamozu nne na nna nwa ọkụ ahịa Ọchanja ahụ gbagburu.

Jose Mourinho ga-anọ Tottenham ruo 2020-23

Image copyright Getty Images

Jose Mourinho ndị Tottenham ka were n'ọrụ, ga-anọ ebe ahụ ruo afọ 2022 na 2023 ma ọ bụrụ na o metaghị ihe e ji chụọ ya.

Mourinho na onwe ya kwuru na ọ bụ ụdịrị ndị ọgbabọolụ nọ n'otu ahụ mere akpịrị ogologo isonye otu a.

Akụkọ mere ugbua bụ na Jose Mourinho abụrụla onye nchịkọta otu egwuregwu Tottenham Hotspur dịka a chụchara Mauricio Pochettino.

Mourinho bụbu onye nchịkọta Manchester United na Chelsea tinyereaka n'akwụkwọ ịnọ n'ọkwa na ngwụcha afọ 2022 ruo 2023.

Mourinho sị na ụdịrị ndị ọgba bọọlụ Tottenham nwere na-enye ya obi aṅụrị nke ukwuu.

Onyeisioche ndị Tottenham bụ Daniel Levy sị " N'ime Jose anyị nwere onye so n'otu ndị nchịkọta kachasị mma na bọọlụ"

Cheta na Tottenham chụrụ Mauricio Pochettino n'ọrụ agbanyeghi na o du ha ruo agba nke ikpeazụ asọmpi champịọns league n'afọ gara aga.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Harry Kane bụ onye ndu ndị Tottenham sị na ọ na-abatara Mourinho n'otu ha

Matt sị ka a na-atụ anya Bale ịbịa Tottenham ugbua

Josephine ugwu atụrụla ugwu

Nwada Josephine Ugwu turuugo pụrụiche n'aka onyeisala Buhari maka ego ndị mmadụ furu efu ọ na-eweghachite azụ n'ọdọụgbọelu dị ịche iche na Naịjirịa.

Nwaanyị na-arụ ọrụ ihicha ụlọ weghachịrị ọtụtụ nde maịra ego.

N'ofesi

Image copyright AFP/GETTY IMAGES

Mba Izrel akwala mgbọ na mba n'ọtụtụ ebe na mba Siria megide gọọmentị Siria nakwa ndịagha Ịran.

Ndịagha Izrel sị na nke a bụ na nzaghachị ọtụtụ ogbunigwe ndịagha Iran gbara n'Izrel.

Nkeji ehihie

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Buhari sị ka ehiwe ụlọikpe pụrụiche maka mpụ

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ụlọomeoiwu ka ha gbapụ ya ọsọ n'itinye iwu ga-ehiwe ụlọikpe ga-elebanya na mpụ ndị pụrụiche.

Ọ kpọrọ oku a n'ọgbakọ e mere iji belata nrụrụaka n'etiti ndị na-arụrụ ọha ọrụ bụ ebe ọ rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha nabata atụmatụ a.

Ụkọchukwu a sị wakporo nwaanyị n'ike

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A nwụchiela nwoke ahụ kụgburu nwunye ya

Ndị uweojii Enugwu steeti agbaala otu ụkọchukwu n'anwụ n'ihi ebubo ịwakpo otu nwaanyị n'ike nakwa ịkwọ ọgwụ ego.

Komishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ahmed Abdur-rahman kwupụtara nke mgbe ọ na-agba mmadụ iri atọ na isii ndị ọzọ n'anwụ maka mpụ dị iche iche.

Image copyright Getty Images

Ndịagha mba Amerịka abụọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu helikọpta mere n'Afghanistan n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba.

A ka na-enyocha ihe kpatara nke a mana ndị oyi ndụ egwu kwuru na ha gbaturu ụgbọelu helikọpta ndị Amerịka na mpaghara Logar.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDi na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara