Cannibalism: Nwaanyị esiela ma rie nwa ya

Nwaanyị na nwa ya Image copyright Getty Images

Gọomentị mba Tanzania zipuru ndị isi ọrụ ha n'obodo Mavanga ebe a na-enyo na otu nwaanyị gburu, sie ma rie nwa ya.

Akụkọ si mba ahụ apụta na-akọwa na anwụchiela nwaanyị ahụ na di ya maka ịgba ha ajụjụọnụ maka ihe mere nwa ha nwaanyị.

Ndị isiọrụ ahụ kwuru na ihe a mere ebe mmadụ na-eri mmadụ ibe ya, wụrụ ha akpata oyi n'ahụ makana ha anụtụbeghị ya mbụ n'obodo ha.

Napụ Invictus Obi ego,

Image copyright Getty Images

Ụlọikpe gọọmentị etiti dị na Legọs enyela iwu ka e weghara ihe karịrị nde narị abụọ na iri asatọ a chọtara n'ọbaego Obinwanne Okeke a ma dịka Invictus Obi.

Ọkpaikpe Rilwan Aikawa nyere iwu a ka ndị ụlọọrụ EFCC kwuru na ha hụrụ ego ndị a n'ọbaego ya na nke ụlọọrụ ndị o hibere.

N'akụkọ ọzọ,

Image copyright Jonathan Druion

Anwụchiela otu nwoke a na-enyo na ọ chọrọ ịkpa mkpamkpa n'ime ụgbọelu Ethiopian Airlines feturu na Bujumbura dị na mba Burundi.

Ụgbọelu ahụ si Addis Ababa na-aga Burundi nakwa Kigali dị na mba Rwanda, oge nwoke ahụ malitere ikwu na ọ ga-eji ogbunigwe gbarie ya bụ ụgbọelu.

Mourinho agwala ndị ntaakụkọ okwu

Image copyright Reuters

Jose Mourinho ekwuola na ọ gaghị eme mmehie ndị o mere mgbe ọ na-achịkọta otu ndị ọ chịkwa buru, ugbua ọ na-achịkọta Tottenham.

'Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ karịa ndi Boko Haram'

Image copyright Getty Images

Akwụkwọ nchopụta a kpọrọ Global Terrorism Index nke 2019 kwuru na ndị ọchịehi egbukarịala mmadụ karịa Boko Haram kemgbe n'afọ 2018.

Akwụkwọ a bụ nke e wepụtara na Wednezde sị na Naịjirịa bụ ndị atọ na mba ụwa ihe iyi ndụ egwu kachasị metụta kamgbe afọ 2015.

Dịka akwụkwọ a si kwuo na iyi ndụ egwu na Naịjirịa kachasị na nke ndị ọchịehi na ndị Boko Haram na-eme.

Na ndị otu abụọ a akpaala ike iyi ndụ egwu dị pasentị 78 ebe ha gburula ihe ruru pasenti 86.

Agbanyeghi na aha ndị ọchịehi a nọghị n'akwụkwọ ndị na-eyi ndụ egwu kama ogbugbu n'eso nsogbu ha na ndị ọrụ ugbo bụ ihe iyi ndụ egwu.

Akụkọ a sị na ndị mmadụ nwụrụ n'afọ 2018 maka nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo eruola 1,158.

Ọ sị na nke kachasị dị njọ bụ mwakpo mere n'obodo Gwaska dị na Kaduna, n'ọnwa Mee afọ 2018.

Ikpe Sanusi na Ganduje

Image copyright Patrick van Katwijk
Nkenke aha onyonyo Emir Muhammadu Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa malite n'afọ 2009 rue 2014 tupu o were ọkwa Emir

Taa ka a ga-ama ma nkewa Gọvanọ Abdullahi kewara ọchịchị ọchị ọdịnala nke Kano nke obodo ahụ nwee eze ise ọ ga-akwụrụ

ụlọikpe ga-etinye ọnụ ma Gọvanọ Ganduje omere ọfụma ikeri ngalaba ọchịchị Emir Sanusi ụzọ ise pụtara Rano, Kano, Karaye, Bichi na Gaya.

N'ofesi

Image copyright Getty Images

Akwụsịtụla ogbugbu ndị a mara ikpe ọnwụ n'Amerịka maka ikpe sịrị na usoro e ji egbu ha megidere iwu.

Otu ọkaikpe chabiri ikpe ma kwuo na akwụkwọ mmadụ anọ n'ime ndị a gbara megide usoro ogbugbu ha nwereike ịmịta mkpụrụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles

Mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu bụ Sunday Dare sị n'okwu ịgbatịkwu ọnọdụ Gernot Rohr dịka onye nchịkọta Super eagles dị n'aka ndị NFF.

Gernot Rohr na NFF nwere site ugbua ruo ọnwa Juun afọ 2020 inwọgharị oge ọrụ maọbụ ya akwakọrọ pụọ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile