Road Accident: otu onye anwuola ebe mmadụ asatọ meruru ahụ

Ihe mberede okporoụzọ n'Anambra steeti

Ihe mberede okporoụzọ Image copyright FRSC

Akụkọ na-eru anyị ntị taa na-ekwu na otu onye nwụrụ ebe mmadụ asatọ meruru ahụ na n'ihe mberede okporoụzọ mere n'agbata ụzọ 'Enugu-Agidi, Anambra steeti.

Onyeisi ndị Road Safety na steeti ahụ bụ Andrew Kumapayi sị na ha nwetere ya bụ ozi n'elekere asatọ ụtụtụ Satọde a.

Kumapayi sị na ọ bụ bọsụ abụọ kụkọtara isi na ya bụ okporoụzọ bụ nke ọ sị na mpaghara ụzọ ebe o mere dị mma.

N'akwụkwọ ndị ụlọọrụ ahụ depụtara, ebe ihe a mere dị kilomita asaa n'ụlọọrụ ndị Road Safety ahụ.

Ọ bụ ụgbọala bụsụ Haice na nke Mitsubishi kụkọrọ isi ahụ ebe mmadụ abụọ na-akwọ ya bụ ụgbọ nọ n'ụlọọgwụ ka ọ dị ugbua.

Kumapayi sị na ọ bụ oke ọsọ nakwa mgbafe na-enweghị isi kpatara ya bụ ihe mberede n'etiti ụgbụala abụọ ahụ nke otu n'ime ya bụjuru ose.

Ndị uweojii ekeela nkwụcha na Ekiti steeti

Image copyright Getty Images

Na-ebe ọzọ, ndị uweojii na Ekiti steeti sị na ha ga-entinye anya na mmiri chọpụta ihe mere ndị ekperima gara ohi na ụlọakụ dị na Oye ụbọchị Tọzde.

Asuquo Amba bụ onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ sị na nke a bụ ugboro abụọ ụdị ihe ahụ na-eme na steeti ahụ nke mere ha ji enyo na ọ bụ otu ndị na-akpa ya bụ ike.

Ala ọmajiji na Kenya

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ oke mmiri ozizo kpatara ya bụ ala nsachapụ

Ụmụnne o, ụnụ anụrụ na mmadụ 29 anwụọla na ala ọmajiji nke bekee kpọrọ landslide na mba Kenya na Satọde.

Kọmishona ogbe ahụ bụ Apollo Okello sị na ọtụtụ ka tọrọ na ya bụ ebe ebe ajọ ọnọdụ ebe ahụ ekweghị ka azọpụta ụfọdụ.

Mourinho na bọọlụ mbụ ya

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, Jose Mourinho azaala aha ya n'asọmpi Tuttenham na West Ham gbara n'ehihie Satọde site na iji ọkpụ atọ asatara abụọ merie ya bụ asọmpi.

Cheta na nke a bụ asọmpị nke mbu Mourinho gbara kemgbe abalị ole ma ọ bụ ole ọ were ọchịchị dịka onyenkuzi na Tuttenham Hotspur.

Gee akụkọ ndị a na nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ụmụaka ji nsị akpụ blọkụ

Image copyright Reuters

Ụmụaka ejirila ihe a na-ekpofu ekpofu mepụta ihe dị mma na mba Philippine.

Akụkọ si mba ahụ pụta kwuru na ụfọdụ ụmụakwụkwọ achọpụtala etu e si eji nsị nkịta arụpụta okwute e ji arụ ụlọ.

Ha ji nchọpụta ha eme ka nsị nkịta kwụsị ị na-adị n'okporoụzọ, nakwa eme ka ihe okwute e ji arụpụta ụlọ dị ọnụ ala.

Ọ bụkwa ihe ga-enyere ihu igwe aka.

Ebubo a na-ebo Allen Onyema

Akụkọ pụtara n'ọba internet ụlọọrụ na-ahụ ikpe nke mba Amerịka n'obodo Atlanta, na-akọwa na a na-ebo Allen Onyema bụ onyeisi Air Peace ebubo maka nrụrụaka.

Ebe ebubo ha wụkwasara Onyema metụtara ihe Bekee kpọrọ "Money Laundering", nke ha boro onye na-ahụ maka ego na nhazi n'ụlọọrụ Air Peace bụ Ejiroghene Eghagha, metụtara igwu ụlọakụ chandum na izu aha mmadụ.

Gụọ ya n'uju ebe a Ihe dị n'ebubo mba Amerịka na-ebo Allen Onyema nke Air Peace

Ohi ataala isi onye uweojii

Dịka ụlọntaakụkọ Star nke Kenya si kwuo, ndị uweojii gbagburu onye otu ha na onye ọkwọụgbọala taxi a na-eche so gaa izu ohi n'otu ụlọ ndị Naịjirịa bi na mpaghara Kiambu County.

N'egwuregwu,

Onye ọbụla na-eche ịma ma Manchester City ọ ga-anyụ Chelsea ịkpakwụ mgbe ha ga-ezute n'ọgbọegwuregwu Etihad.

Ha chọrọ ịma ma Chelsea a ga-eji nkata kporo goolu dịka mgbe City gbara ha ọkpụ isii a na-asataghị otu n'afọ gara aga.

Anaghị m anwa ịchị nke ugboro atọ - Buhari

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola hoo haa na ọ naghị achọ ụzọ o si achị Naịjirịa nke ugboro atọ, na ọ nweghi ụdịrị izu ọbụla ọ sọrọ ndị mmadụ gbaa n'isi ya ga-eme ka nke a mee.

O gbuwara akụ oyibo Nsugbe a n'ọgbakọ ya na ndị isi otu pati ya bụ All Progressives Congress (APC) nwere n'Abuja.

O kwuru na ya kwụgidere n'elu ihe akwụkwọ iwu Naịjirịa dere, nke bụ na ọ bụ naanị ụgboro abụọ ka mmadụ ga-achịnwu dịka onyeisiala.

Kụpụrụnụ Zubby Michaels aka...

Nke a bụ makana Willie Obiano bụ aka na-achị Anambara steeti, enyela ya ọkwa gọọmentị.

Zubby bụ ome ejije a ma ama na Nollywood, ga-abụzị onye ndụmọdụ pụrụiche nye gọvanọ n'ihe gbasara mgbasaozi.

N'ofesi,

Mba Nije na-achọzị ịgbanwe abụ ala ha ka ọ bụrụ nke ha kpamkpam ma ghara inwe ihe ọbụla jikọrọ ha na mba Frans bụ ndị chịrị ha mgbe gboo.

Mara na mba asatọ si mpaghara Afrịka ndị nọbu n'okpuru ọchịchị Frans zukọrọ n'afọ a, ebe ha kpara maka etu ha ga-esi kwụsị iji ego CFA Franc, ma malite iji nke a na-akpọ Eco.

Mourinho ọ ga-anụ ụda ya taa?

A ga-ama ma Jose Mourinho ọ ka makwa nke ekwe na-akụ dịka onye nchịkọta, mgbe Tottenham ga-ezute West Ham n'ọgbọegwuregwu taa.

Image copyright Getty Images

N'otu aka ahụ Mourinho ekwukwaala na ọ ga-agba mbọ ịhụ na Dele Allị bụ nwa Naịjirịa na-agbara Ịngland bọọlụ na-anaghị emecha ọfụma ugbua, ga-amalite "ịgba ka Dele ụwa niile mabu".

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu Nnewi siri malite - Igwe Orizu