Zubby Michael: I nye Odumeje otito Chukwu, Chukwu eweere gị iwe

Zubby Michael

Onye ejije a ma ama bụ Zubby Michael zutere BBC Igbo n'ogige "Gịnị na-afịọ" were tinye ọnụ n'ihe banyere ejije na etu o si malite njem Nollywood ya.

Ọtụtụ ndị sonyere n'emume Gịnị na-afịọ jụrụ Zubby mmekọ ya na ụkọchuwu Odumejeje nwere.

Zubby kọwara na ya kwenyere na Chukwu mana ya ekweghi n'ụka nke ya ji aga ụka kama na ọ bụ ọyị ka ya na ụkọchukwu Udumeje bụ.

O kwuru na ya matara ụkọchukwu ahụ kamgbe mana ọbụghị na ya na-aga ụka ya.

N'okwu ya, "Ama m chukwu, mana ihe mmọnwụ pụtakwa, agbapụta m."

Ọ sị na ya ekwesighi ịhapu omenala makana omenala bu ihe e ji mara mmadụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionVicky Nwogu

Zubby kwuru na ya anọghị n'Ọnịcha oge mkpa mkpa kpara n'ahịa Ọchanja mana ya gbatara ha ọsọ enyemaka were nye ha otu nde naira ma kwado kwa atụmatụ gọvanọ Obiano wepụtara maka igbochi ọku ọgbụgba n'ọdị n'ihu.

"I nyere ndị mmadụ aka, onwe gị ka i nyere aka."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na o nweghikwa onye e nyere ego sị ya dobe.

Maka ndị chọrọ ịbanye ogige Nollywood, Michael sị na ọ dịghị mfe mana ka ha jisie ike, na-emesi ihe ha na-eme ike.

O kwukwara ka ndị Igbo ghara ịhapụ asụsụ Igbo makana ọ bụ asụsụ nna nna ndị Igbo.

"Onye hapụrụ asụsụ Igbo obi ndị ichie agaghị adị mma n'ebe ọ nọ."

Maka nwoke iyi uwe nwaanyị, Michael sị na ọ bụghị ihe na-amasị ya mana ya na-ahụ ya na ndị mmadụ nwere ohere ime ihe ha chọrọ ime.

Maka ọchịchị, ọ sị na ụdị nke ọ chọrọ abụghi ka ndị mmadụ na-ekwe oke nkwa.

"Ya bụrụ sọsọ ọkụ ka onyeisiala mere n'ime afọ anọ, ya mee ya, ọ bụghi ikwe oke nkwa a naghị emezu emezu."

O kwenyere maka ihe a na-ekwu na a na-emegbu ndị Igbo na Naịjirịa mana ọ sị na ha bụ ndị na-agba mbọ.

"E mechiri "border" bụ ebe ụmụ anyị si ebubata ihe. Mana, ya bụrụ nke ga-eme ka ihe dị mma, ana m akwado ya."

Akụkọ ga-amasị:

Isiokwu Ndị Emetụtara