Witchcraft Conference: Ngagharịiwe emeela ka a gbanwee isiokwu ọgbakọ ahụ

Ịta amụsụ
Nkenke aha onyonyo O nwere ihe ọjọọ dị na inyobanye anya n'okwu gbasaara ịta amụsụ?

Ọgbakọ nkuzi nke e hiweburu iji lebanye anya n'ihe ịta amusu pụtara na ihe na-akpata ya" nke ngalaba B.I.C Ijomah Centre for Policy and Research nke ya bụ mahadum gbanwere ọ bụrụ "Ụdị Agwa Mmadụ dị iche iche."

Otu jikọrọ ndị ụka ọgbara ọhụrụ a kpọrọ 'Pentecostal Fellowship of Nigeria (PFN)' buru agha ekpere abalị abụọ iji kagbuo ọgbakọ ahụ.

Image copyright UNN

Dịka onyeisi PFN n'Enugwu steeti bụ Bishọp Godwin Madu siri kwuo n'akwụkwọ mgbasaozi o wepụtara, o kwuru na ha agaghị anọrọ gba nkịtị ewere steeti ahụ nyefee n'aka ndị amusu.

Mahadum 'University of Nigeria, Nsukka' (UNN) agbanweela isiokwu ọgbakọ ha kwesịburu ime na Tuzde dịka ọtụtụ otu ndị okpukpere Kraist mere ngaghariiwe megide ya.

Nkenke aha onyonyo Ndị bịara ọgbakọ
Nkenke aha onyonyo Ndí bíara ọgbakọ

FUTA Bullies: Mahadum achụọla ụmụakwụkwọ isii kụrụ ibe ha ihe 'tinker' kụrụ 'pan'

Image copyright Facebook/FUTA

Mahadum 'University of Nigeria, Nsukka' (UNN) agbanweela isiokwu ọgbakọ ha kwaoburu ime na Tuzde dịka ọtụtụ otu ndị okpukpere Kraist mere ngaghariiwe megide ya.

Ọgbakọ nkuzi nke e hiweburu iji lebanye anya n 'Ihe Ita Amusu Pụtara na Ihe na-akpata ya" nke ngalaba B.I.C Ijomah Centre for Policy and Research nke ya bụ mahadum gbanwere ọ bụrụ "Ụdị Agwa Mmadụ ga."

Otu jikọrọ ndị ụka agbụrụ ọhụrụ a kpọrọ 'Pentecostal Fellowship of Nigeria (PFN)' buru agha ekpere abalị abụọ iji kagbuo ọgbakọ ahụ. Dịka onye isi PFN na Enugwu steeti bụ Bishop Godwin Madu siri kwuo n'akwụkwọ mgbasaozi o wepụtara, o kwuru na ha agaghị anọrọ gbaa nkịtị e were steeti ahụ nyefee n'aka ndị amusu.

Mahadum Federal University of Technology Akure (FUTA) achụọla ụmụaka isii jidere onye otu ha tie ihe tinka kụrụ pan.

N'ihe nkiri pụtara n'izu gara aga ebe ụmụaka ahụ gụnyere otu nwoke gbara nwata ahụ gburu gburu, ha ji ihe ọbụla ruru ha aka wee tie ya ezigbo ihe.

Nke a mere ka ụlọakwụkwọ ha tinye ọnụ, ma kwuo na ka ha mechara nnyocha gbasara ya bụ agwa ọjọọ, na ha achọghịzị ka ụmụakwụkwọ ahụ gụrụ na-aga n'ihu n'ụlọakwụkwọ ha.

Lee ihe ha depụtara n'uju:

EFCC anwụchiela onyeisi Kirikiri nakwa dọkịta

Ụlọọrụ Efcc anwụchiela Emmanuel Oluwaniyi bụ onyeisi ụlọmkpọrọ Kirikiri nakwa Hemeson Edwin bụ dọkịta na-arụ ebe ahụ.

Ha nwụchiri ha n'ụbọchị 25 nke ọnwa Nọvemba, ka ha na-ebo ha ebubo ihe ha kpọrọ ịtụ okpokpo asị maka ọnọdụ ahụike Hope Aroke bụ onye a tụrụ nga afọ iri abụọ na anọ (24) maka ịkpa arụ kọmputa mana ọ nọrọ ebe ahụ gwuo wayo otu nde dọla.

Asị ha tụrụ, mere ka Aroke nwee ohere ị na-apụ n'ụlọmkpọrọ gaa 'ịnata ọgwụgwọ'.

N'ofesi,

Idemmiri egbuola ihe ruru mmadụ iri na ise ma chụpụ ihe karịrị narị n'ụlọ, n'obodo Kinshasa dị na mba DR Kongo.

Nke a na-abịa na-erughi ụbọchị atọ ụgbọelu si n'elu dakwasị ụlọ ma gbuo ihe ruru mmadụ iri abụọ na asaa n'obodo Goma dịkwa na mba ahụ.

N'egwuregwu,

Ala ga-anụ ụda ya taa mgbe oke enyi abụọ bụ Real Madrid na PSG ga-ezute ma chịpụ ya na Champions League.

Border Closure: Benin na Niger anaghị eme ihe anyị kwekọrịtara

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nigeria Minister of Information and Culture, Lai Mohammed

Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na mba Niger nakwa Benin ebidobeghị nleba anya na nsogbu butere mgbachi okeala Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

Mohammed kwuru na ngwa ahịa na ndị mbịara mbịara anwụchiri n'okeala ahụ emere mgbachi gosiri nke a.

O kọwara nke a dịka ọ gara njem nleta na okeala Seme ịhụta etu ihe si aga.

"Mgbachi oke ala a emeela ka osikapa si mba ofesi kwụsị ịbata ala anyị" ka o kwuru.

Na mba ofesi,

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo E chere na ogbunigwe a gbara n'ụlọụka katolik si n'oge Agha Biafra

Otu ụlọikpe na mba Argentina atụọla ndị fada abụọ nga ihe ruru afọ iri anọ.

Ụlọikpe ahụ tụrụ Fada Corbacho na Fada Corradi nga n'ihi na ha metọrọ ụmụaka dara ogbi na mba ahụ.

N'egwuregwu,

Ogenyi Onazi emeela Emmanuel Sani ihe nwanne na-emere nwanne site n'ịkwụrụ ya ụgwọ ọwụwa ahụ n'ụlọọgwụ.

Cheta na Sani kwụsịrị ịgba bọọlụ n'ihi ọrịa ụkwụ akpọrọ Achilles Tendonitis.

Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Isiokwu Ndị Emetụtara