Jesus manger: E weghachịtala osisi si n'akwa Jesus dinara n'ime ya
E weghachịtela osisi ha na-ekwu si n'akwa ahụ Jesus dinara n'ime ya mgbe a mụrụ ya na Bethlehem.
Poopu Francis nyere iwu ka e si na Basilica nke Santa Maria Maggiore dị na Rome, welaa osisi ahụ nọrọla ihe karịrị afọ puku, nye ndị Bethlehem.
Enugwu ga-enwe ezi nchekwa - Ndị uweojii

Kọmishọna uweojii Enugwu steeti bụ Ahmad Abdurahman, ekwuola na ndị otu ya dị ezigbo njikere ịhụ na steeti ahụ nwere nchekwa pụrụiche ọkachasị ugbua oge ekeresimesi ruru nso.
O kwuru na ha ewepụtala atụmatụ dị iche iche ga-enyere aka ịhụ na ha chekwara steeti ahụ nke ọma.
E gbuola ndị Boko Haram 13
Ndịagha Naịjirịa ekwuputala etu ha si buso ndị oyindụegwu bụ Boko Haram agha na nso osimiri Kamadougou ma gbuo mmadụ iri na atọ n'ime ha.
Ha kwukwara na ha nwetara ngwaagha gụnyere ụgbọegbe atọ, egbe na-esi n'ikuku nakwa ọtụtụ mgbọegbe na ọgbatumtum, n'aka ha.
N'egwuregwu,
Real Madrid emechaala gbagoruo n'elu tebulu La Liga dịka ha ji goolu abụọ a satara otu merie Alaves.
Ka ọ dị ugbua, ha ji naanị pọịntị atọ aga ndị nọbụ n'isi bụ Barcelona.
Atilogwu Udo: Ndị agha na-azacha ụzọ n'Owere

Ọchịagha Yusuf Tukura bụ aka na-chị ọdọ ndị agha Bekee kpọrọ 34 Artillary Brigade n'Owere chị ndị otu ya wụba ụzọ obodo ahụ n'ụtụtụ Satọde ime mkpocha na nzacha.
Ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụzọ Egbu Ọchị agha Tukura si na ha mere ihe a iji mezuo ihe onyeisi ha bu Ọchịagha Buratai si ha mee iji mee ka ha na ndi nkịtị nọdụ n'udo
Ọ sịkwa na atụmatu Atilogwu Udo ha na-eme na-aga nke ọfụma

Anyị enyeghi P&ID ego n'aka - Malami

Ọkaiwu ukwu nke Naịjirịa bu Abubakar Malami ekwuola na ọbụghị ego ka ha nyere ụlọikpe dị na mba Briten maka okwu ha na ụlọọrụ P&ID.
Malami si na ọ bụ nkwekọrịta na-aga akwụ ya bụ ego dị nde narị naịra abụọ ka ya nyere ụlọikpe.
Ọ sị na etu ọ kwụ ugbua, ya bụrụ na Naịjirịa emeri n'ikpe a, ha agaghi enyezi P&ID ya bụ ego.
Ngagharịiwe Hong Kong

Ụmụ akwụkwọ sekọneri na ndị nara ezumike nka na-eme ngaghri iwe na Obodo Hong Kong n'ụbọchị Satọde bụ ụbọchị mbụ n'atụmatụ ngagharị iwe a chọro ime kwa ngụcha izu ụka maka ihe ha sị bụ oke aka ike ndị uweojii.
Ljungberg abụrụla onye ndụ Arsenal nwamgbenta
Otu egwuregwu Arsenal ahọpụtara Freddie Ljungberg dịka onye ga-anọchite anya Unai Emery dịka onye nchuzi ha.
Ljungberg ga-ano n'ọkwa ahu nwamgbenta ruo mgbe ha nwetere onye ọhụrụ.
Aisha Buhari sị na nsogbu dị na Naịjirịa akarịala

Aisha Buhari etiela mkpu na ihe isi ike akarịala na Naịjirịa ma sịkwa ka ndị na-achị hụ na ha mere ihe ha kwesiri ime ma hụ na ahụhụ ndị ọha na-ata belatala.
Odoziakụ Buhari kwuru nke a n'Abuja n'ebe a na-eme ọgbakọ ngalaba ofufe Alakuba akpọrọ "Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) General Assembly and National Executive Council" emere ụnyaahụ.
Buhari si n'agbanyeghi na di ya bu onyeisiala sọsọ ya agaghi emenwu ihe dị na ọchịchị.
Ọ sị ka ndị so achị Naịjirịa tinye aka n'atụmatụ ịzọpụta Naịjirịa na nsogbu.
Ọ gakwara n'ihu gbarụọrụ aka na-achi steeti di iche iche ihu maka ọ sị na ha kwesiri itinye uche n'ihu na ha na-achị nwetere ihe ọganihu.
Odoziakụ Buhari nọkwa na ọgbakọ ahụ tinye ọnụ n'atụmatụ inyocha ihe ndị mmadụ na-eme na soshal midia.
"Maka okwu soshal midia, ị gaghị anọdị na be gị dee na Osote Onyeisiala Naịjirịa arituola n'ọkwa. Ihe bụ nnukwu okwu. Ya bụrụ na Chaịna nwere mmadụ na-enyocha ihe ndị mmadu ijere na ọma na-eme na Soshal midi, ahụghị m ihe mere na Naịjirịa nwere mmadụ otu narị nde na iri asatọ agaghi emenwu ya."
Anyị amalitela ibu ndi mmadụ n'efu n'ime ụgbọoloko si Legọs gawa Ibadan - Amaechi
Minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi kwuru na ngalaba ya amalitela iji ụgbọ oloko buo ndị mmadụ n'efu site Legọs gawa Ibadan.
Atụmatụ a malitere ụnyaahụ ga na-agakwa n'ihu ruo ngụcha ọnwa Maachị nke afọ 2020.
Gọọmentị Imo na ndị uweojii ga-arụkọ ọrụ inyocha akwụkwọ ụgbọala na Decemba
N'Imo steeti ndị uweojii sị na ha na ngalaba na-ahụ maka ibulite ego dị n'akpa gọọmentị state ahụ ga esoro mee emume ha kpọrọ "operation Vede na Bekee.
Operation Vede bụ atumatu ha ga-eji nyocha ma akwụkwọ ụgbọala ezukwara ezu.
Atụmatu ga-amalite n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Decemba.
Onye gburu ndị mmadụ na London si mkpọrọ pụta - uweojii

Onye ji mma mmagbuo mmadụ abụọma merụọ mmadụ atọ ahụ ụnyaahụ na akwa mmiri London bụ onye amara ikpe na ya na ndị oyi ndụ egwu nwere mmekọ
Ndị uweojii sị na Usman Khan dị afọ iri abụọ na asatọ ka si mkpọrọ pụta mgbe ọkpara mkpa mkpa a.
Ndị uweojii gbagburu amadị a dịka ndi ọha jituru ya ebe ọ na-akpa ike a.
Gee akụkọ BBC Igbo na nkejiebe a:
