Davido enwetala echichi na Delta state

Davido Image copyright Instagram/Bobo Ajudua

A ga-amalite ịkpọ Davido 'ichie'!

Aha otutu a sitere n'echichi ndị Ibụzọ dị na Delta steeti chiri David Adeleke n'ụbọchị 30 nke ọnwa Nọvemba 2019 a.

Otiegwu ahụ gara n'obodo Princess Pat Ajudua bụ 'Chief Whip' n'ụlọomeiwu Delta steeti ma bụrụkwa nne enyi ya nwoke, ebe ọ natara echichi ahụ.

'A ga m agbagha mmeri Adeyemi' - Dino Melaye

Dino Melaye ekwuola na ọ ga-agbagha mpụtara ntuliaka e mere na mpaghara Kogi West nke Smart Adeyemi meriri n'ihi na ọ nabataghị ya.

Ọ kwuru n'akara Twitter ya na mmeri eji ọgbaghara na mwakpo nweta abụghị ezi mmeri.

Ọkụ agbaala ọdọ ahịa iri na ise na Legọs

Ndị ọrụ gbatagbata na Legọs emenyụọla ọkụ gbara n'ahịa Owode-Onirin dị na mpaghara Ikorodu.

Ọkụ ahụ metụtụtara ọdọ ahịa iri na ise mana o nweghi onye mrụrụ ahụ maọbụ nwụọ na ya bụ ọdachi.

Na mba ofesi

Image copyright Reuters

Ihe ruru mmadụ iri na otu na-anata ọgwụgwọ ugbua dịka otu onye bu egbe wakporo ụlọ egwu dị na steeti New Orleans nke mba Amerịka.

Ndị uweojii kọwara na ha anwụchiela otu onye ma kwuo na ha ka na-esi imi n'ala maka okwu a.

Onye ga-anochị anya Quique Sanchez Flores?

Otu Watford esorola nzọmụkwụ otu Arsenal nakwa Tottenham n'ịchụtu onye nkuzi ha bụ Quique Sanchez- Flores.

Cheta na nke a ga-eme ya ugboro abụọ n'ime ọnwa atọ ha na-achụ onye nkuzi otu bọọlụ ha.

Akụko ụwa n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Aisha Buhari nwere okwu maka ndị Naịjirịa

Image copyright Twitter/Aisha Buhari

Ndị gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị naanị ha ka nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari na-ata ụta maka ọnọdụ ọjọọ Naịjirịa nọ n'ime ya ugbua, na ọ bụ ndị Naịjirịa niile.

N'ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Abdulrazaque Bello Barkindo zipuru, o kwuru na nke a bụ ịkọwapụta ihe Aisha gwara ndị ndọrondọrọ ọchịchị oge ya na ha zukọrọ n'ọgbakọ ndị alakụba n'izu gara aga.

Kuziwenu ihe mere mgbe gboo n'ụlọakwụkwọ

Image copyright Instagram/Sam Dede

Sam Dede nke e ji ime ejije na Nollywood mara, adụọla ọdụ sị na ọ ga-adị mma ka ụlọakwụkwọ ndị sekọndarị nọ na Naịjirịa malitere ikuzi ihe ndị mere mgbe gboo, ka ndị na-etolite nwee ike ịghọta.

Dede bụkwa onye nkuzi Theatre Arts na mahadum Pọtakọt, kwuru na agụmakwụkwọ nakwa akụkọ mgbe ochie dị mkpa maka iweta ụdịrị Afrịka anyị niile chọrọ ịhụ.

N'ofesi,

Mịnịstrị na-ahụ maka ikpe ziri ezi na mba Briten ejirila ngwangwa malite nnyocha n'ọnọdụ mgbapụta a na-enye ndị a tụrụ nga maka ihe gbasara mwakpo oyiegwu.

Nnyocha a welitere isi maka ihe mere n'akwammiri Lọndọn ebe Usman Khan nọbu n'ụlọmkpọrọ wakporo ma gbuo mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ atọ ahụ.

N'egwuregwu,

Onye ga-aza dike mgbe Arsenal ga-ezute Norwich?

N'otu aka ahụ, Manchester United ga-achọ imere onwe ha aha n'ọgbọegwuregwu Old Trafford mgbe ha ga-ele Aston Villa ọbịa.

Jonathan na-arịọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị arịrịọ

Image copyright Getty Images

Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Afrịka ejirila nwayọ nwayọ na-anapụta ọchịchị n'ike dịka etu ndị agha si ewegharabu ọchịchị n'ike.

O kwuru na atụmatụ a agaghị eme ka mpaghara Afrịka dị mma, wee were ohere ahụ rịọ ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ibe ya kwụsị igbu mmadụ n'ihi na ha na-achọ ịbanye ọchịchị.

Onyeisiala Namibia ga-achịrị gawa

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Nke a ga-abụ ugboro abụọ Hage Geingob ga-achị dịka onyeisiala nakwa nke ikpeazụ ya

Hage Geingob azọtala oche ya ọzọ ịchịrị gawa n'ihu dịka onyeisiala mba Namibia nke ugboro abụọ.

Ka ọ na-ekele ndị mba ya, Geingob gara n'ihu kwuo na ihe kacha eme ya obi aṅụrị bụ na awakpoghi maọbụ kwafuo ọbara onye ọbụla n'ihi ntuliaka a.

N'egwuregwu,

Image copyright Twitter/WatfordFC

Kepukepu si mba Ịngland apụta na-akọwa na e nwereike ịchụ Quique Sanchez Flores bụ onye nchịkọta Watford ọsọ eru ala taa.

Ọ bụrụ na a chụọ ya, ọ ga-abụ onye nchịkọta nke atọ a na-achụ na Premier League n'ime izu abụọ a gara aga.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWorld Aids Day: HIV n'ọnụ ọgụgụ

Isiokwu Ndị Emetụtara