Tax Identification Number: I nwetela nke gị?

Ego

Tupu ị nwee ike ịdọrọ ego n'ọba ego gị bido n'ọnwa Jenụwarị 2020 gawa, ị ga-egosi na ị na-akwụ ụtụisi gi.

Nke a bụ nke na-efegharị na soshal midia ma na-ekwukwa na atụmaatụ a so n'akwụkwọ ndị ụlọomeiwu ukwu wepụtara n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa November, 2019.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi

BBC Igbo gbalịrị ịnụta n'ọnụ ndị ọrụ ngalaba mmefu na mkpata ego Naịjirịa bụ "Ministry of Finance, Budget and National Planning" gbasara ya bụ atụmaatụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

Anyị gakwara n'akara twitter ha ma chọpụta na ya bụ iwu gafere ogo nke ngụpụta atọ, na-echezi ka onyeisiala binye aka na ya.

Mgbe BBC Igbo jụrụ ndị ụlọ ọrụ 'Federal Inland Revenue Service,' otu onye na-anọ n'oche nnabata ha gwara anyị na ya bụ atụmaatụ erubeghị ha ntị.

Anyị jụkwara ọnụ na-ekwuru ndị ụlọakụ Fidelity bụ Ejike Ndiulo maka ya bụ atụmaatụ, o kwuru na ozi ahụ erubeghi ha ntị.

Mana gịnị bụ Tax Identification Number?

Nke a bụ akara ndị ụlọọrụ ụtụisi na-enye mmadụ maọbụ ụlọahịa nke ga-abụzi njirimara ha mgbe ọbụla ha chọrọ ịkwụ ụgwọ ụtụisi.

Ihe ndị ọzọ ikwesiri ịma maka TIN

- I ga-enweriri akara Bank Verification Number(BVN) nakwa akwụkwo njirimara nke mba Naịjirịa.

- Ihe mere i ga-eji nweriri akara TIN bụ maka iji gosi na ịbụ nwafọ Naijirịa maọbụ ụlọahịa na-akwụ ụgwọ ụtụisi.

- A naghị akwụ ụgwọ maka idebanye aha iji nweta TIN mana ọ bụrụ na ị si n'aka ndị ọsọ ahịa, ọ ga-eme ka ịkwụọ ụgwọ.

- A na-eweta ya ozigbo imechara usoro eji enweta ya mana ụfọdụ oge o na-ewe ihe ruru abalị abụọ iji pụta.

Ihe ndị a bụ dịka ụlọọrụ Joint Tax Board si depụta n'akara webụsaịtị ha.

Akụkọ ndị ga-masị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara