University of Transportation Daura: Ihe iri i kwesiri ịma maka Mahadum Njem a

Nigeria currently has a number of students studying rail transportation in China. They're expected to return home to play roles in the SGR system and in the Transportation University to be flagged off next week. Image copyright @toluogunlesi/Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị gọọmentị na-azụ na Chaịna maka ụgbọ oloko

N'ụbọchị Mọnde a ka Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-etinye ọkwụte a ga-eji malite ịrụ Mahadum Njem nke mbụ na Naịjirịa.

Ọ bụ n'obodo Buhari bụ Daura ka a na-arụ Mahadum a.

Ihe bụ ihe iri i kwesiri ịma maka mahadum a:

  • Ọ bụ n'ọnwa Ọktoba 2018 ka gọọmentị etiti kwenyere iwete ego a ga-eji rụọ mahadum a, dịka ngalaba National Universites Commission siri kwuo.
  • Mahadum Njem a ga-etinye uche na nchọputa nakwa ọzụzụ ndị mmadụ maka ogige njem n'ome Naịjirịa.
  • Mahadum bụ nke gọọmentị etiti dịka ọzọka nwere ike ị nọ na Rivas Steeti, bụ ebe Minista na-ahụ maka njem bụ Chibuike Amaechi si.
  • Ọ bụ nde nari dọla iri ise ka ọrụrụ mahadum a ga-eri, dịka Maazị Amaechi siri kwuo.
  • Ọ bụ ụlọọrụ China Civil and Construction Company (CCECC) ga-arụ mahadum a.
  • Amaechi sịkwa na mahadum a ga-enye aka zụpụta ndị ọrụ ogige njem chọrọ
  • Ọ bụ ebumnobi gọọmentị etiti ịhụ na ndi tozuru etozu nọ n'ọkwa n'ogige njem, ọkachasi ugbua ha na ehibe ọdo ụgbọ oloko, ụgbọ elu na ndi ọzọ na Naịjirịa
  • Ugbua, Naịjirịa nwere ndị nọ mba Chaịna amụ maka njem ụgbọ oloko. A na-ele anya na ndị a ga-alọta bịa soro malite nchọpụta na Mahadum Njem a mgbe ọ ga-amalite.
  • Ndị gọọmentị na-azụ na Chaina maka atụmatụ ọrụ ụgbo oloko ga abịa kuzie nkuzi na mahadum a tupu ekwe ka ha ruo ọrụ ọzọ.
  • Ọ bụ mgbe akwụkwọ nke 2020 malitere ka mahadum ga-agbapụ ya ọsọ.

Ogige njem so n'ime ihe gọọmentị Buhari tinyere uju na ya kemgbe ha malitere ọchịchị n'afọ 2015.

Ha arụọla okporo ụgbọoloko nakwa ịrụcha ọdọụgbọelu ụfọdụ.

Onyeisiala Buhari ebitela ọtụtụ ego n'aka mba Chaịna maka okwu ụgbọoloko.

Maazị Amaechi sị na ọ bụ ịza aziza maka etu a ga-eji elekọta ụzọ oloko na ụgbooloko gọọmentị a rụrụ mere ya jiri wepụta atụmatụ mahadum.

Maka ihibe mahadum a n'obodo onyeisiala, Amaechi sị na onweghi ihe nke ahụ pụtara maka Daura dị na Naịjirịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a