2019 in summary: Akụkọ ndị bụ ụwa bịa lele na 2019

Ebe foto si, Alph Lukau/Facebook
Ụkọchukwu Alph Lukau (yi uwe na-acha anụnụ anụnụ) na-ekwu na ọ kpọlitere ozu nwoke a
2019 na-abịa na njedebe n'ike n'ike mana lee ụfọdụ akụkọ ndị Naịjirịa ọkachasị ndị Igbo agaghị echezọ echezọ.
Anyị ga-malite site na nke dịka ọ chọrọ itinye ụjọ n'ime ụmụnwoke.
1.Ile anya n'ara nwaanyị ọ na-agbati ndụ nwoke?
Dịka ikuku ọkụ, o bidoro wube na ile nwaanyị anya n'ara ruo nkeji iri kwa ụbọchị nwereike idọtị ndụ nwoke dịka nchọpụta otu nwoke sayensi si mba Germany si kwuo.
Mana mgbe BBC Igbo jụrụ ya ndị ọkammụta na mmekọrịta nwoke na nwaanyị, ha zara na o nweghị mgbe sayensi ji gosipụta nke a.
Mana otu n'ime ha gwara anyị na onwekwara ike ịbụ eziokwu.
2. Ụkọchukwu kwuru na ọ kpọlitere mmadụ n'ọnwụ
Ebe foto si, Alph Lukau/Facebook
Ụkọchukwu Alph Lukau (yi uwe na-acha anụnụ anụnụ) na-ekwu na ọ kpọlitere ozu nwoke a
Ị chetara mgbe otu ndị ụlọozu nọ na mba Saụt Afrịka kwuru na ha ga-akpụpụ otu nwoke kpọrọ onwe ya ụkọchukwu ụlọikpe maka ikwu na ọ kpọlitere mmadụ n'ọnwụ.
Otu ihe nkiri e kesara ọfụma na soshal midia, gosiri ụkọchukwu Alph Lukau ka ọ na-agwa otu nwoke dina n'ime akpati ozu "kunie" o kuliri ka ndị mmadụ malitere iti mkpu ọṅụ.
Ndị ụlọozu ahụ kwuru na a ghọgburu ha, iji mee ka ha sonye.
Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe "ịtụ n'anya" ahụ mere n'ihu ụlọụka Lukau dị nso n'obodo Johannesburg, ebe ọtụtụ ji ya mere ihe ọchị.
"Anyị ekwenyeghị na e nwere ihe ọbụla dịka ihe iribama", ka ngalaba na-ahụ maka omenala, ofufe na asụsụ a kpọrọ "(CRL Rights Commission)" gwara ndị ntaakụkọ mba Saụt Afrịka.
Nwoke ahụ akpọlitere n'ọnwụ mechara nwụọ n'ihe mberede okporoụzọ ka otu izu ụka gafechara.
3.Onyonyo na-egosi onye nkuzi Unilag na-achọ ị dina ụmụakwụkwọ nwaanyị
Ọka mmụta Boniface Igbenehue
Ugboro ugboro ka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị na mahadum dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka na-ekwu na ndi nkuzi ha na-enye ha nsogbu iji dinaa ha.
Mana mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ekwetacha ihe ha na-ekwu.
Ihe onyonyo a BBC setere gbara nke a n'anwụ.
4. Ihụtụla Nwoke maọbụ nwaanyị nwere ọtụ na amụ n'ahụ ya?
Mgbe ọbụla ị nụrụ na mmadụ abụghị nwoke ọ bụghị nwaanyị, kedụ ihe na-agba gị n'uche?
Nke a bụ akụkọ banyere ndị Naịjirịa abụọ James Johnson na Mystique Evolving bu ikpu na amụ pụta ụwa.
Mmadụ abụọ ndị a kọrọ akụkọ ha nakwa ihe ndị ha na-agabiga na ndụ n'ihi ọnọdụ a.
5. Enyi na enyi lụrụ ọgụ ka ụkọchukwu ha tiwara ha akụ oyibo nsugbe
Ebe foto si, Getty Images
A na-ebokarị ụfọdụ ndị ụkọchukwu Naịjirịa maka amụma ụgha ha na-ebu
Ị na-agakwa n'ihu ụfọdụ ụkọchụkwụ kpachapụ anya.
I chetara ka ụkọchukwu si gwacha ọyị abụọ okwu ma bo otu n'ime ha na aka ya dị n'ime ihe ọjọ na-eme nke ọzọ.
N'otu ntabi anya ha abụọ bido lụwa ọgụ nke mere ka ndị mmadụ tiwe "Pamela Why" n'elu soshal midia.
Nke a mere na mba Saụt Afịrịka.
5. Nwaanyị lụrụ nwaanyị
Nwaanyị lụtara nwa ya nwụrụ nwaanyị
I chetara mgbe anyị wetere ụnu akụkọ Felicia Orji lụtara nwa ya nwoke nwụrụ anwụ nwaanyị.
O kwuru na ọ bụ makana nwa ya nwoke ahụ amụtaghị nwa tupu ọ nwụọ kpatara nke a.
Gerekwa ya ọzọ ka ị mata ka nwaanyị a alụtara alụta si mụta ụmụ ndị ọmụgoro Felicia.
5.I mana ka esi akpachapụrụ ọtụ anya?
Ebe foto si, Emma Russell
Nke a bụ akụkọ bara nnukwu uru mana ndị Igbo kụjara akụja na BBC nwereike iwepụtali ntuziaka gbasara akụkụ ahụ a.
Ha nabatara ya agbanyeghị na ọ gbara ha agba na ntị.
Gụọ ya n'uju ebe a Ihe 5 ndị nwere ọtụ kwesiri ịma
6. A ga-enyewe ụmụnwoke ọgwụ mgbochi nwa - Ndị dọkinta
Ebe foto si, SCIENCE PHOTO LIBARY
Ndị dọkịnta n'India na-akọwa na ha arụpụtala ọgwụ ga-eme ka nwoke ghara ịtụwa nwaanyị ime mgbe ọ na-achọghị.
Ha sị na ha na-enyochala ọgwụ a ma chọpụta na ọ na-arụ ọrụ ruo pasenti 97.3 ma kwukwa na ọ naghị enye nsogbu ọbụla n'ahụ.
Mana n'otu ntabi anya , ha pụtara kwukwa na ha akwụsịtụla igba ọgwụ ahụ makana ya bụ ọgwụ bidoro tiwasasia utu ụmụnwoke.
7.A ka na-ekwu nke bere nụ, ọzọ bekwasi ya
Ebe foto si, EPA
Ọtụtụ mmadụ hụchara etu enwereike isi lekọta ọtụ nwaanyị wee rịọ ka akuzie maka amụ nwoke.
Mana mgbe ya bụ akụkọ pụtachara, chọọchị gbasara!
Lee ya ebe a. Ihe ise i kwesiri ịma maka amụ
8. Nwaanyị siri ma rie nwa ya
Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ si mba Tanzania pụta kwuru na ndị uweojii mba ahụ anwụchiela nwaanyị na di ya maka ịgba ha ajụjụọnụ maka ihe mere nwa ha nwaanyị.
Ha na-enyocha nwaanyị ahụ maka ebubo igbu, sie ma rie nwa ya.
Onye ma etu afọ 2020 ga-adị?
Arọ ọhụrụ ọma ooo!
'Ma nwoke ma nwa ya nwe ara'