2019 Summary: Ntuliaka, mkpọrọ Orji Uzor Kalu na ihe ndị ọzọ kporo ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị na 2019

Buhari/OUK Image copyright @oukTWEETS

Bido na ntuliaka iji họputa onyeisiala ruo na mkpọrọ a tụrụ aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu, Ị nwereike ikwu na afọ 2019 bụ chi bọọ a nụ ozo.

Lee ihe iri kachasi kpoo ọkụ:

1. Mwep Ọkaikpe ukwu Onnoghen

Image copyright National Judicial Council

Onyeisiala Muhammadu Buhari wepụrụ Walter Onnoghen dịka onyeisi ọkaikpe n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị.

Buhari kwuru na ọ bụ maka ebubo nrụrụaka e boro Onnoghen kpatara o ji wepu ya n'ọkwa.

2. Mbugharbch ntuliaka

Ka ọ fọrọ naanị elekere ole na ole ka oge ruo maka mbido ntuliaka 2019, Mahmood Yakubu bụ onyeisi INEC kwuru na e bugharịala ya bụ ntuliaka si n'abali iri na isii nke ọnwa Febrụwarị gaa abalị iri abụọ na atọ.

Nke a tinyere onye ukwu na onye nta na gbagharia, ma mekwaa ka ndị mmadụ malite ikwu na ọ dị ka nrụrụaka abatala na ntuliaka ahụ.

3. Mmeri Buhari

Image copyright Getty Images/Atiku

Mgbe Muhammadu Buhari pụtara ihe dịka onye meriri okwa onyeisiala, o mere ọtụtụ mmadu ndị n'ọchị ndị n'akwa.

Atiku Abubakar bụ onye PDP kwuru na nnukwu nrụrụaka dị na ya bụ ntuliaka.

Atiku gbara Buhari na ndị otu ya bụ 'All Progressives Congress' (APC) akwụkwọ n'ulọikpe, mana Buhari merikwara ya ebe ahụ.

4. Rochas, Nwosu na Ihedioha

Uche Nwosu na Emeka Ihedioha gbara mgba ka dimkpa maka oche Govano Imo steeti, mana ọ bụ Ihedioha mechara merie.

Nke a bụ n'agbanyeghi na Rochas Okorocha bụ aka na-achị Imo steeti oge ahụ dọnyeere Nwosu ukwu.

Mana Rochas mechara zọta oche n'ụlọomeiwu ukwu n'agbanyeghi mgba ya na onwe ya gbara n'akụkụ nke ya maka oche ahụ.

5. Amaechi na Wike

Image copyright MIN OF TRANSPORTATION/gETTY IMAGES

Gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike na Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi gbara nnọọ mgba maka onye ga-emeri oche gọvanọ steeti ahụ.

Ọ bụ ezie na Amaechi esoghi zọọ ya bụ ọkwa, mana ọ kwadoro Tonye Cole bụ onye otu ndọrọndọrọ 'Africa Progressives Congress' (APC).

Nke a bụ n'ihi na INEC kụpụrụ ndi APC iso zoo ọchịchị na Rivas.

Mana Wike meriri ma Amaechi ma Cole, kụọ ha abụọ ukwu n'ala.

6. Mwepụta nd isi ụlọomeiwu

Image copyright @SenAhmadLawanI
Nkenke aha onyonyo Ahmed Lawan

Onye ọbụla chị obi n'aka oge a na-akwado ntuliaka maka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta.

Mana n'ikpeazụ, Ahmed Lawan na Femi Gbajabiamila tuuru ugo.

Ike Ekweremadu so wee zọọ ya bu ọkwa, mana ọ chịtaghi aja.

7. Dino Melaye

Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-enyocha Dino maka ebubo gbasara ogbugbu mmadụ na ohi

Dino Melaye kụrụ afọ n'ala na ndọrọndọrọ nke ndị otu PDP mere iji họputa onye ga-anọchite anya ha n'izọ ọkwa gọvanọ Kogi Steeti.

Oteghi aka, ụlọikpe kagburu mmeri ya dịka onye omeiwu, ma kwuo ka e megharia ntuliaka ya.

Mgbe e megharịrị ya, Melaye kụkwara afọ n'ala ọzọ wee ghọọ 'Aaron' gbara aka ala.

8. Nwchi na mkpọrọ Sowore

Image copyright Sowore2019/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019

Ndị uweojii nzuzo bụ 'State Secret Service (SSS) nwụchiri Sowore n'ọnwa Ọgọstụ, ma tụọ ya mkpọrọ.

Iwe ha bụ na Sowore chọrọ ịhazi ngaghariiwe a kpọrọ 'Revolution Now'.

E mechara tọghapụ ya naanị otu ụbọchị tupu a nwụchie ya ọzọ.

Sowore ka nọ na mkpọrọ ruo taa, agbanyeghi na ụlọikpe enyela iwu ugboro ugboro ka a tọhapụ ya.

9. Bọjeti 2020

Image copyright BashirAhmed/Twitter

Onyeisiala Buhari bugaara ndị omeiwu Bọjeti 2020.

Ndị omeiwu mere ngwa ngwa itule ya bụ bọjeti ma kwado ya.

Buhari binyere aka na bọjeti n'abalị iri na asaa nke ọnwa Disemba.

Nke a bu nke mbụ kemgbe afọ 1999 onyeisiala na-ebinye aka na bọjeti n'ọnwa Disemba nke ga-eme ka ọ malite kpọmkwem n'abalị mbụ nke Jenụwarị.

10. Mkpọrọ Orji Uzor Kalu

Ụlọikpe dị na Legọs mara OUK ikpe maka nrụrụaka ma tụọ ya nga afọ iri na abụọ.

Nke a gbara ọtụtụ mmadụ gharịị n'ihi na Kalu bụ onye otu All Progressives Congress (APC) bụ Pati nọ n'ochịchị.

Ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC kwukwara na ọtụtụ ndị jibu ọkwa gọvanọ ka na-agabiga nnyocha.

Ka anyị chebiri afọ 2020 makana ọ dị ime! Onye ma nke ndọrọndọrọ ọchịchị ga-amụta?

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ