2020 Budget: Etu o kwụ n'ihu nke 2019 nakwa etu ọ ga-esi metuta akụnaụba Naịjirịa

Onyeisiala Muhammadu Buhari Image copyright Getty Images

Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2020 n'iwu, otutu ihe dị iche ebutela nrụrịtaụka banyere ya.

Okwu a kpụ n'ọnu bụ ihe gbasara ihe ndị dịka Agụmakwụkwo, nchekwa, ahụike, ịko ubi na ihe ndị ọzọ.

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere akụnaụba bụ Davoe Okorie kọwara BBC ụfọdu ihe maka Bọjetị 2020.

Lee ihe na-egosi etu Bojetị 2019 na nke 2020 sị kwụrụ

Okorie kọwara na ọ bụru na ego gọomentị wepụtara maka agụmaakwụkwọ, ahụike, nchekwa na ọrụ ugbo dị obere karịa nke afọ 2019, kedụ zie ihe mere Bọjetị 2020 ji karịa nke 2019?

Ọ kọwara na ọ bụ ụgwọ gọọmentị Naịjirịa chọrọ ikwughachi mere ka ego 2020 ji karịa nke 2019.

Okorie gosikwara na Gọọmentị tụrụ anya na ha ga-akpata ego ga-eru puku nde naịra asatọ dịka ha dere na Bọjetị 2018 kama ọ bụ naanị puku ijeri naịra abụọ ka gọọmentị Naịjirịa kpatara.

Ọ gara n'ihu kọwaa na gọọmentị na-ebite ego iji kwụọ ụgwọ ọnwa na ihe ndị ọzo na-agaghị amịta mkpụrụ a ga-eji kwụghachị ụgwọ.

Ihe ọzọ o kwukwara bụ na ụgwọ "subsidy" gọọmentị na-akwụ na-anapụ ndị Naịjirịa ohere iji nweta ihe dị iche iche ga-eme ka ndụ dị ha mfe.

Image copyright Getty Images

Kedụ Ihe gọomentị ga-eme ka ihe dị mma

Maazị Okorie sị na gọọmentị ga-eme ụfọdụ ihe ndị a iji mee ka ihe dị mma.

  1. Gọọmentị wetulata aka n'ego ha na-etinye n'ego enyemaka (subsidy).
  2. Ka gọọmentị belata etu ha si emefu ego ha ji elekọta ndị n'ọchịchị, Okorie kwuru sị " Ị lee anya ego opeketampe na-esiri anyị ike ịkwu".
  3. Gọọmentị ga-ejisi ike tinye iwu "Petroluem Downstream Deregulation Bill" nke ga-eme ka ndị ụlọọrụ dị iche iche zụọ ahịa mmanụ agbịdị.

Na nchịkọta, Okorie sị na gọọmentị jisie ike tinye ego na akụnaụba Naịjirịa nke ga-eme ka ọrụ dị mma, were nwaayọ na-emefu ego ka Naịjịrịa nwee ike ikwụ ụgwọ ha ji.

Akụkọ ga-amasị gị