Ebonyi Minimum Wage: 'Aga m akwụ ndị ọrụ N30,000 malite n'ọnwa Jenụwari 2020'

Ebe foto si, David Umahị onn Facebook
Gọvanọ Dave Umahi sị na ọ ga-amalite n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020 kwụwa ndị ọrụ Ebonyi steeti puku naịra iri atọ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe.
Onye ndụmọdụ ya na mgbasaozi bụ Francis Nwaeze mere ka BBC Igbo mata nke mgbe a kpọtụrụ ya n'ihe banyere okwu a.
Nwaeze sị na ọdịla anya gọvanọ Umahi kwere nkwa sị na ọ bụrụ na gọọmentị etiti tinye ya n'iwu na ọ bụ ihe ọ ga na-akwụ ndị ọrụ.
Ọ sị na gọvanọ hiwere kọmitii ga-elebanya n'usoro a ga-eji akwụ ụgwọ ọnwa opekatampe a.
Na mkpebi a si na mpụtara ihe ndị kọmitii ahụ chọpụtara bụ nke gosiri na ha ga-akwụli ya.
Nwaeze gara n'ihu kwuo na o nweghi onye ọbụla manyere gọvanọ Umahi ime mkpebi a n'ike, kama na ọ bụ nke o mere n'aka ya.
Buhari na ndị ECOWAS
Ebe foto si, Ahmad Bello Sulaiman/Twitter
Buhari gara ọgbakọ ndị Government of the Economic Community of West African States (ECOWAS)
Onyeisiala Muhammadu Buhari akwaala arịrị kọwaa na mkpamkpa ndị omekataraihepụọụjọ n'ọdịda anyanwụ Africa bụ ihe kacha adọchị ọganihụ azụ.
Ọ kwuru nke a n'ọgbakọ nke iri ise na isii nke ndị Economic Community of West African States (ECOWAS) mere n'Abuja ụbochị Satọde.
Buharị kwara arịrị maka ndị agha ururu iri asaa ndị omekome a gburu na mba Nije.
O kwusikwara ike na gọọm̀enti ya kwadosiri azụmahịa na mekọrịta nke mba ECOWAS.
Ndị bịara ya bụ ọgbakọ bụ Onyeisi ọgbakọ ECOWAS bụ Jean-claude Kassi Brou, Onyeisiala mba Nji bụ Issoufou Mahamadou,
Ndị ọzọ bụ ọnye bụbu onyeisiala Naịjriịa bụ akubu Gowon, onye nnọchite anya odeakwụkwọ United Nations bụ Mohamed Ibn Chambas na ndị ọzọ.
Ọkụ na-agba ọzara n'Ọstralia
Ebe foto si, EPA
N'ofesi, ndị ọrụ gbata gbata mba Australia adọọla ndị na-eme njem ụgbọala na mba ahụ ha kpachara anya ha maka oke ọkụ na agba ọzara nke ndị na mba ahụ.
Ndị ọrụ ọkụ ruru puku iri nọ n' ọrụ ịgbanyụ ọkụ kariri narị nke oke ifufe na okpomọkụ ekweghị sị mata ebe ọkụ ọzọ ga ebido.
Everton na Arsenal
Ebe foto si, AFP/Getty Images
N'egwuregwu, n'asọmpị Premier League agbara n'ihihie, Everton and Arsenal achịtaghị aja ma ọlị.
Taa ka ndị nọchitere anya ndị nkuzi ndị Arsenal bụ Freddie Ljungberg na ogbo ya nke Everton bụ Duncan Ferguson ga-agagodi n'ụsọ.
Ebe foto si, EPA
Carlo Ancelotti (akanri) na Bill Kenwright, onyeisioche ndí Everton ka ha na-enwe mkparíta úka
Carlo Ancelotti ga-abụzị onyenkuzi ndị Everton mgbe ọzọ ha ga-asompi otu Mikel Arteta ga-esi nọchie oche ndị Arsenal mgbe ọzọ.
Gee akụkọ ndị n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Amerịka eburula agha gaa n'agbata eluigwe na uwa
Ebe foto si, EPA
The Space Force has been something of a pet project for President Trump
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ewepụtala ngalaba ndịagha ọhụrụ na-ebu agha n'agbata ihu eluigwe na ụwa a kpọrọ US Space Force.
Na mgbape ngalaba a Trump sị na ihu eluigwe na ụwa bụzi ebe ọhụrụ a ga na-alụagha n'ụwa ugbua.
FIFA awụọla Naịjirịa n'ala
Ebe foto si, @NGSuper_Falcons
Ndị FIFA awụọla Naịjirịa n'ala dịka ha jụrụ inye Naịjirịa ikike ịhazi asọmpi Iko Mbaụwa nke ụmụnwaanyị nọ n'okpuru afọ iri abụọ afọ 2020
Ha nyere mba Mba Costa Rica na Panama ikike a kwuo na afọ ejughi ha n'ụdịrị akụrụngwa egwuregwu Naịjirịa nwere.
Nkeji Ehihie
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ụmụaka iri abụọ nwụrụ n'ibi ugwu
Ebe foto si, Getty Images
Emume nwata ji abụru nwoke bụ ihe nzuzo
Gọọmentị Saụt Afịrịka emechiela ọtụtụ ụlọakwụkwọ ebe a na-anọ a kwado ụmụaka maka emume iji tozuo ịbụ nwoke dịka ụfọdụ so n'emume ahụ nwụrụ.
Ngalaba na-ahụ maka omenala na ofu sị na-emechiri ụlọakwụkwọ ndi dị n'ebe dị iche iche na mpaghara "Eastern Cape" ruo otu afọ.
Ọ kpọkwala ka anwụchie ndị aka ha dị n'ọnwụ mmadu ruru iri abụọ.
Emume eji anabata nwata n'etiti nwoke gụnyere ibi ugwu nakwa ibi n'ụgwụ ọtụtụ izu ụka.
Ehe mere e ji ebi ugwu?
Kwa-afọ, puku na puku mmadụ dị afọ iri na ise ruo iri na asaa na aba ọhịa ebe a na-akụziri ha etu ha ga-ejiri bụrụ nwoke ga-abara obodo uru.
Mana, adịghị ekwu ihe na-eme ebe ahụ.
Emume a a na-akpọ "Ukwaluka" bụ nke a na-ahụ dịka ihe dị mkpa nwata nwoke ga-agafe iji bụrụ nwoke kpọm kwem n'agbụrụ ndị kachasị buo ibu na Saụt Afịrịka nke gunyere Xhosa na Ndebele.
N'ọtụtụ na eso emume a, mgbe ụmụaka na-alọta na-abụ ezigbote mmemme.
Ebe foto si, Getty Images
Nlọta ndị agbụrụ Ndebele n'afọ 2013
Mana ụfọdụ oge oke ihe na-eme, dịka ọnwu ụfọdụ ụmụaka maọbụ nwete ezibote mmerụ ahụ site na ibi ugwu.
Narị na narị ụmụaka nwoke gara ụlọ n̄ọgwụ n'afọ gara aga maka ibi ugwu agaghi ọfụma.
ụfọdụ ebe a na-eme emume a enweghi ikike n'aka gọọmentị ime ya.
Akwụla n'ụzọ aghara aghara - Onyeisi Uweojii
Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị
Dịka njem ekeremsimesi ebirila ọkụ n'uju, onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka ndị uweojii ghara ịkwụchi ụzọ aghara aghara, kama ka ha kwụrụ naanị n'ebe ndị amawapụtara ha.
ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Guardian nwere n'Abuja ụnyaahụ.
Naịjirịa esorola mba na-akpagbu mmadụ n'ihi okpukperechi
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Amerịka etinyela aha Naịjirịa n'ime mba ndị ha sị na-anabata mkpagbụ ndị mmadụ n'ihi okpukperechi ha.
Naịjirịa na mba dịka Cuba, Nicaragua na Sudan esorola Comoros, Rọshịa na Uzbekistan bụ aha ha dị n'akwụkwọ a.
Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta ọhụrụ nke Arsenal bụ Mikel Arteta sị na ọ dị njikere ọ tọpu ndị Arsenal n'agbụ ọnyụpa ha nọ na ya kamgbe.
Arteta sị na ọ bụ oke nsọpụrụ o nwere n'ebe Arsenal nọ mere o jiri nabata ịbụ onye nchịkọta ha.
Nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri
Igbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche ndị na-asọ anụ?