Dreadlocks: Ihe omimi dị n'isi dada

A na-ahụkarị ndị nwere ntutu dada dịka ndị pụrụ iche.

Ndị Igbo kwenyere na ha bụ ndị Chineke nyere ikike pụrụ iche.

Duruagwu nke abụọ n'Ụmụnakara, Imo steeti bụ onye omenala na adị mma sị na ndị dada na-abụkarị ndị mmiri.

Ọ sị na otu esi achọpụta ha bụ na ụmụaka ahụ na-ebekarị oke akwa mgbe a na-akpụ ha isi.

Ọ sị na isi ụmụaka ahụ anaghị ekwe ọbụbọ mgbe a na-achọ ịbọ ya.

"Isi ha na atụhie atụhie".

Mgbe ahụ ka e ji amata na ha bụ dada kwusizie ịmetụ ha aka n'isi.

Ọ bụghi mmadụ niile na emetu ha aka n'isi.

Ọ bụghịkwa mgbe niile ka ana asarụ ha ahụ n'isi, dịka Duruagwu kwuru.

Mgbe ụfọdụ a na-etinye ha ego ayọrọ maọbụ ego mkpọpụ n'isi iji tụjụnata mmụọ ha.

Ọ bụ afa n'ekwu mgbe aga eji akpụ ha ya bụ isi.

Maọbụ onye ahụ toruo ogo ọ gwa ndị be ha ka akpụọ ya isi.

Mgbe a ga-akpụ ya bụ isi, onwere omenala a ga-emere ya.

Omenala a gụnyere ịmere ndị dada ibe ha na ụmụaka ndị ọzọ oriri.

A na-egburu ha ọkụkọ ọcha na mmanya.

A na-agọkwara ọfọ tupu a kpụọ ha ya bụ isi, ịkọwa na anaghị akpụpụ ndụ ha na ya bụ isi.

Mgbe ụfọdụ, isi ọnwụ ịkpụ isi dada ha nwere ike ịnwe nsogbu dị iche iche nke gosiri na ha ekwesighị ịkpụ ya bụ isi.

Ndị dị otu a na-amalitekwa iru ya bụ isi n'okenye.

Mana ihe ndị a agụnyeghị ndị ji aka ha mee ntutu ha dada maka ịchọ mma.

Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke

Akụkọ ga-amasị gị