Naira Marley: Lee ihe mere izuụka a ji bụrụ Sekem

NairaMarley Image copyright @NairaMarley/Twitter

Sịte na ndọrọndọrọ ọchichi ma rụọ na ndị na-eti egwu, izuụka a kpụ ọkụ n'ọnụ.

Ka anyị bido na ihe gbasara ụlọụka COZA na otiegwu Davido, Wizkid na Tiwa Savage.

1) COZA na ndị otiegwu

Ihe so wụo ewu n'ịzu a bu akụkọ na-ekwu na ndị ụka COZA jị ụzọ aghụghọ tinye ndị otiegwu ama ama bụ Wizkid, Davido na Tiwa Savage n'ihe ejiji ha ji akwado emume ụka ha chọrọ ime.

Mgbe ndị otiegwu a chọpụtara aghụghọ a, ha were iwe ma gosipụta ya na ihe ha depụtara na Soshal Midia ha .

Lee ihe ejiji nke eji Davido mee.

Lee ihe ejiji nke eji Wizkid na Tiwa Savage mee

Lee etu ha si gosipụta iwe ha

Tiwa Savage

Wizkid

Davido

Ka ọ dị ugbu a, ndị COZA ewepụla ihe ejiji a ha mere, kama onweghị ihe ha kwurula maka ya.

2) Donald Trump

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Trump ka bụ kwa Onyeisiala Amerịka dịka ọ na-eche ka ndị ụlọomeiwu ukwu kpebie

Ndị ụlọomeiwu nke mba Amerịka emeela atụmatụ 'impeachment' nke kwuru na Trump emetela ihe ekwesiri iji chụọ ya dịka onyeisiala mba Amerịka.

Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisiala Amerịka nke atọ ndị ụlọ omeiwu tinyere akwụkwọ ka achụpụ n'ọkwa.

3) Sotitobire Church

Ndị mmadụ gbara ụlọ ụka Sotitobire dị n'Akure ọkụ maka akụkọ ndị uweojii sị bụ asị na-efegharị na soshal midia.

Okwu a malitere n'ọnwa gara aga mgbe amaritere chọwa nwatakịrị aha ya bụ Gold Kolawole furu n'ụlọụka ahụ.

Dịka ọ dị ugbua, ogbaaghara ataala isi mmadụ abụọ nke bụ otu onye uweojii na onye nkịtị.

4) Emume ncheta ọmụmu onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari

Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari mere ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchi 17 nke ọnwa Disemba a.

Ozi nwunye ya bụ Aisha Buhari dere na Twitter butere ọtụtụ akụkọ.

5) Kamaru Usman

Kamaru Usman bụ nwaafọ Naijirịa ma bụkwa onye ama ama n'egwuregwu 'MMA' meriri mgba ma ka bụrụkwa okaibe ji mgba n'ụkwụ nke ndị UFC.

6) 6years single Term : Atụmatụ onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe.

Ndị ụloomeiwu nta ewepụla atụmatu ime ka onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe.

Otutu ha kagburu ya ma sị na onweghị ihe mere etu ọ dị ugbụ a.

7) Onwụ Benjamin Uwajumogu

Image copyright Twitter/@iamekweremadu
Nkenke aha onyonyo Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa

Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa nwụrụ n'ụbọchi nke asatọ n'ọnwa Disemba 2019.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijirịa zitere ezinụlọ ya ozi itiakanobi.

8) Naira Marley

Otiegwu ama ama bụ Naira Marley wuru n'izu a ọkachasi maka egwu ọhụrụ a na-agba nke ọ kpọrọ Tesumole.

Ihe ọzọ mere ka nwaokoroobia ji pụrụ onye akpụ n'ọnụ bụ egwu ohụrụ otipụtakwara n'izuụka nke ọ kpọrọ 'LOL- Lordoflamba'.

Akụkọ ga-amasị gị