Kano Hisbah: Ganduje kwụsịtụla iwu machiri nwoke na nwaanyị ịnọkọ na keke

Onye keke Image copyright Getty Images

Gọọmenti Kano steeti aracharala ihe ha gbọpụrụ dịka ha kwusịtụrụ iwu machiri nwoke na nwaanyị ibanye otu keke.

Onyeisi otu ndị uweojii Sharia na steeti ahụ bụ Sheikh Harun Ibn-Sina onye kwupụtara nke a kwuru na ọ bụ iji nye ohere ka a kpa ya akpaa tupu e tinye ya n'ọrụ.

Cheta na ọtụtụ ụmụ Naijiria katọrọ atụmatụ ahụ oge e kwupụtaburu ya.

Lee ihe ụfọdụ kwuru na Facebook BBC Igbo maka ya bụ atụmatụ:

Kano Hisbah: 'Iwu keke ọhụrụ naghara m ịga ọrụ n'oge'

Image copyright Getty Images

Otụtụ ndị bi na Kano jikwara eze kpee ekwere dịka iwu ahụ pụtara ihe.

Elizabeth Sabis bi na Kano akwaala arịrị gbasara etu iwu ọhụrụ ewebatara na Kano si emetụta ya.

Sabis gwara BBC Igbo na iwu a mere ya ka ọ ghara ịga ọrụ n'oge n'ụtụtụ n'ihi na ndị Keke bu nwoke ekweghị akwụsịrị ya.

O kwuru sị "e chere m ọtụtụ oge tupu m hụ keke ebụghị nwoke m bara nke kpatara na m erughi ụlọọrụ m n'oge"

Cheta na otu Hisbah na Kano bụ ndị na-elekọta iwu Sharia na steeti ahụ ga-ebido ịda onye keke bukọrọ nwoke na nwaanyị otu mgbe.

Ha kọwara na iwu a adịla kemgbe afọ 14 gara aga mana ugbua ka ha ga-etinye anya na ya ọfụma.

Ihe ndị ha ga-ada ndị mmadụ bụ: ị jichi keke onye ahụ rue ọnwa isii, ị da ya nha naịra puku ise nakwa ụtali iri.

Ndị mmadụ dịka Edward Onoride katọrọ emume a na-ajụ ma Hisbah a ga-egbochi nwoke na nwaanyị ịbanye otu ụgbọelu?

Kano steeti malitere ị so iwu Sharia kemgbe afọ 2001.

Isiokwu Ndị Emetụtara