Anambra steeti fire: Ọkụ gbara obi ndị ọrụoyibo

Ọkụ gbara obi ndị ọrụ n'Awka

Ọkụ ọgbụgba Image copyright @Cleorukkiss

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ọkụ gbara n'ụlọọrụ gọọmentị dị n'Amawbia, Anambra steeti.

Ya bụ ọkụ metutara ụlọọrụ onyeisi ndị ọrụ bekee akpọrọ Head of Service na Bekee nke steeti ahụ bụ ebe ndị uweojii na-ekwu na ha amabeghị ihe bidoro ya bụ ọkụ ruo ugbua.

Onyeisi ndị uweojii bụ John Abang ehiwela kọmitti ka enyocha ihe bidoro ya bụ ọkụ.

GIGM sị na ọnweghị ndị atọọrọ n'ụgbọla ha

Image copyright GIGM/Twitter

Ndị ọrụ Good is Good Motors ekwuola na-ọnweghị dị atọọrọ n'ụgbọala ha mere njem ụnyahụ bụ Satọde.

Ha dere n'akara Twitter ha na ndị ọkwọụgbọala ha niile lọtachara n'udo na njem ha mere.

Gọọmenti Naịjirịa sị na ha anaghị akpaoke okwukwe

Ọzọ, gọọmenti Naịjirịa agọọla n'ebobo ahụ na-agụnye ha na mba na-enweghị nkwaugwu na nsọpụrụ nye okpukpere chi ndị mmadụ abụghị eziokwu.

Mba Amerika gụnyere Naịjirịa na mba na-enweghị nkwanye ukwu na nsọpụrụ nye okpukpere chi bụ nke ọnụ na-ekwuru gọọmenti ahụ bụ Lai Muhammed sị na ọ bụ asị.

Modi asaala aka agụgọ maka iwu na-eso okwu

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Onyeisi mba India Narendra Modi sị na ọ bụ ndị pati ndorondoro ọchịchị ọzọ na-akpụta okwu a

N'ofesi, Onyeisiala India bụ Narendra Modi achiliela aka gọọ na iwu ahụ ha tiri abụghị maka imegide ndị okpukperechi Alakụba.

Modi sị na ya bụ iwu bụ maka iji chekwaba ndị nọ na mkpagbu na mba ahụ.

Ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụọla na ngagharịiwe maka iwu a ha sị na ọ bụ mkpagbu nye ndị ụka Alakụba.

Watford egbuo Man. U

Image copyright ALLSPORT/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Paul Pogba dịla anị mgbe a gbaturu ya

Ụnụ ahụlanụ na ndị kpee azụ ebuwela ụzọ taa na Premia Lig ebe Manchester United ghọrọ itibọrịbọ n'aka Watford n'asọmpị ha taa na.

Watford ji ọkpụ abụọ asataghị ihe merie Manchester United ebe Chelsea jikwa ọkpụ abụọ asataghị ihe ọbụla nyụọ Tottenham Hotspur anya.

Gee akụkọ ndị na otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji
Image copyright Getty Images

Ndị uweojii Abuja akatọọla ogbugbu onye otu ha ji ọkwa 'Inspector' gbagburu ibe ya ji ọkwa 'Corporal' ma gbuokwa onwe ya.

Onye ASP ndị uweojii bụ Mariam Yusuf sị na nke a mere n'ubọchị Satọde n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Dutse Alhaji dị n'Abuja.

Ọ sị na 'inspector' ahụ gbara onye 'corporal' egbe merụọ osote 'superintendent' ahụ tupu o gbuo onwe ya.

Yusuf sị na kọmishọna ndị uweojii bụ Bala Ciroma enyela iwu ka e mee ezigbo nyocha banyere nke a.

Ọ sịrị na ndị uweojii na-eti ezinaụlọ ndị a nwụrụ anwụ aka n'obi.

Image copyright Getty Images

Gọọmenti etiti ekwela nkwa na ọkụ latrik ga-abụ sara na mbido, n'etiti nakwa ngwụcha oge ekeresimesi a.

Minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Goddy Jedy-Agba kwuru nke a oge enyocha ngwa ọkụ latrik Azura dị n'obodo Ihovbor nke Edo steeti.

Jedy-Agba kwuru na ọkụ latrik a na-ewepụta ugbua karịrị ka ọ dị na mbụ.

Ọ sị na ndị ọrụ na-ewepụta ọkụ nakwa ndị na-ekesa ọkụ nakwa gọọmentị na-arụkọ ọnụ iji mezuo nkwa a.

Jedy-Agba dọkwara aka na ntị megide ndị mmadụ izu maọbụ imebi akụrụngwa ọkụ latrik n'ụzọ ọbụla.

N'ofesi

Image copyright AFP

Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron arịọla otu jikọtara ndị ọrụ ụgbọala arịrịọ ka ha kwụsị abụbụ ọrụ ha gbara nke ga-emegide njem n'oge ekeresimesi a.

Ọ sị ka ndị ọrụ biko jiri maka nsọpụrụ ha nwere n'ebe ezinaụlọ ha nọ mee udo.

N'egwuregwu

Image copyright Reuters

Manchester United na Watford ga-adọbiri ya n'asompi Premier League mgbe Watford ga-ele ha ọbịa.

A na-atụanya na Paul Pogba ga-eso gbaa asọmpi a dịka ọ nọchara ọnwa anọ na-agbaghị bọọlụ n'ihi mmerụ ahụ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ

Onyeisiala Buhari etiela mkpu maka agụmaakwụkwọ

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị nkuzi Mahadum ka ha gbalịa na-azụ ụmụakwụkwọ nke ọma ka ha nwee ike baa uru n'ebe ha na-arụ ọrụ.

O kpọrọ oku a n'emume mpụta na mahadum Tekịnụzụ dị n'Akure ebe osote odeakụkwọ otu jikọtara Mahadum bụ Suleiman Ramon-Yusuf nọchiri anya ya.

Anyị ụwa niile dị na mahadum anyị - Unilag

Image copyright Getty Images

Onyeisi mahadum Lagos bụ Ọkammụta Oluwatoyin Ogundipe sị na mahadum ahụ aghaghị agba nkịtị n'okwu ndị nkuzi abụọ wakporo ụmụakwụkwọ

Ọ sị na anya ụwa niile nọ n'ebe ha nọ iji mara ihe ha ga-eme banyere nyocha na ntaramahụhụ ndị nkuzi ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌka mmụta Boniface Igbenehue

N'ofesi

Image copyright Reuters

Onyeisiala mba Cuba bụ Miguel Diaz-Canel ahọpụtala Manuel Marrero Cruz dịka praịm minista mbụ ha n'ime ihe karịrị afọ iri anọ.

Cheta Fidel Castro kachapụrụ ọkwa praịm minista na mba ahụ n'afọ 1976 mgbe ọ nọ dịka onye ndu mgbanwe.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Roberto Firmino scored an injury-time winner as Liverpool defeated Monterrey 2-1 to reach their second Club World Cup final

Liverpool amabutela Iko Club World Cup nke mbụ ha site n'imeri ndị Flamengos nke Brazil n'agba nke ịkpeazụ asọmpi ahụ.

Ọ bụ otu ọkpụ goolu nke Roberto Firmino nyere na ngwụcha oge nyere ha aka ịmabute iko a.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji