Watford vs Man Utd: Osisi kpọrọnkụ a na-atụanya ọdịda nke dị ndụ ekwojiri

Watford na Manchester United Image copyright ALLSPORT/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Paul Pogba dina ala mgbe a gbaturu ya

Ihere mere okwute taa ebe akwa kụwara akị ka ndị Watforf jiri ọkpụ abụọ menye Manchester United ihere taa bụ Sọnde.

Watford bu klasi premia lig n'isi nụrụ ya bụ ọgụ ka agụ ihụ na ha jituru Manchester United bụ ndị nke asatọ n'okpokoro lig.

Agbanyeghị na Manchester United ji bọọlụ pesenti iri isii na anọ, ndị Watford ekweghị ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko.

Ya bụ mmeri gbagwojuru ọtụtụ anya maka na Mancherster United emeribuola ihe dịka asọmpị pesenti iri asaa na atọ (73%) bụ nke ha dachiri azụ ka ọ dị ha taa.

Onyenkuzi Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer kwuru nke bụ eziokwu na-eleghị anya n'azụ.

Okwuru na "ndị otu m ekwesighị imeri ya bụ asọmpị maka na ha nọrọ ka ọgbọnọ site na mbido ruo na ngwụcha ya bụ asọmpi".

Okwukwara na otu ihe ahụ mekwara ndị Watford na mbido mana ha mechere ghọta onwe ha.

Image copyright ALLSPORT/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Aron Wan-Bissaka, Harry Maguire na Juan Mata nke Manchester United ka egbuchiri bọọlụ

Ole jakwara Paul Pogba ike na-ekwu na nlọhachite ya bụ uru dịịrị ndị otu ya maka na oji ike na uchu lohachite azụ, agbanyeghị na ahụghị ọkpa ya taa.

Onye nyere penarịti ndị Watford bụ Troy Deeney kwukara na obi bụ ha sọ aṅụrị maka ya bụ mmerị mana nke a agaghị eme ka ọ baa ha isi.

"Anyị ga-agba mbọ ihụ na anyị adachighị azụ, maka na ndị mmadụ che na anyị ga-agharịpụ".

Watford ji ọkpụ goolu abụọ merie Manchester United na ya bụ asọmpi.

Image copyright ALLSPORT/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ismaila Sarr ji bọolụ ebe Luke Shaw na-eduga ya ozi

Ismaila Sarr nke mba Senegal mukere ka kpakpando ta dịka nyere goolu nke mbụ ndị ka onyere aka nwete penariti ahụ nke Deeney nyere.

Nke a bụ goolu nke abụọ ya kemgbe amalitere sizin a.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara