Tottenham Hotspur vs Chelsea: Lampard ji ọkpụ goolu abụọ mee Mourinho taa kpuchie ọnụ na be ya

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Nke a erie Mourinho ọnụ
Ụwa agbaa Jose Mourinho gharị taa ka ahụrụ anyụru n'elu gbara ijiji gharị dịka Frank Lampard ji ya siri osikapa ụbọchị ụka na be ha.
Chelsea sụkanyere ọkpụ abụọ tupu alaa ezumike na nkeji nke 12" nakwa nke 45".
Ndị otu Mourinho nwere olile anya na ha ga-asa ya bụ bọọlụ mgbe alọtara ya bụ ezumike mana Lampard sị na-ejighi ụtụtụ ama njọahịa erughị na nke a.
Tottenham mechere chere na ọ bụ ọgụ ọkpụkpụ aka ka eji emeta ya, mana ọgụ alụtaghị ya.
Ebe foto si, European Photopress Agency
Mateo Kavacic nke Chelsea na Dele Ali nke Tottenham na-esi ogo
Dịka Hotspur na-esi ọnwụ ịzọta isi onwe ha ihe niile ọnwụ ahụ nwere ike ịmetere ha bụ penariti maka Son ịgba Rudiger ọkpa.
Mourinho mekwara ike ya sịte n'iji Christian Eriksen gbanwee Eric Dier ka anatara ezumike ịji mata ka isi aga apụta.
Mana otu 'awụghị' n'ezi.
Tottenham gbatara kadị ịdọ aka na ntị (card) ise nke otu n'ime ya bụ nke mmemme (red card) eji chụpụ Son Heung-Min.
Ebe foto si, ALLSPORT/Getty Images
Son Heung-Min nke Tottenham e bee ebe achụpụrụ ya maka itinyere Rudiger ọkpa
Ndị nkwado Tottenham Hotspur malitere isiọnwụ dịka ha bidoro ịtụ gooli ndị Chelsea bụ Arrizabalaga iche.
Mmadụ atọ bụ ndị isi ekweọnwụ (Defence) otu chelsea kpachiri ebe niile Hotspur chọrọ isi bata ha ime nke mere na ha agbaghị aka ahịa ma ọlị.
Ụfọdụ na-akọwa na ọ bụ Willian nke Chelsea ji okpueze nke asọmpị a, agbanyeghị na ọnwebụgị ihe eji ya kpọrọ ruo ka o gosichara ike ya taa.