POS charge: 'Onye anwakwala anwa kwụọ N50 maka POS' - CBN

Maka ịkwụ ego POS

egwe "POS" Image copyright Reuters

Ụlọakụ ukwu Naịjriịa agbarụọla ihu kwuo ka ndị mmadụ ghara ịkwụ ya bụ ego ndị na-ere ahịa ụfọdụ na-ama maka iji POS kwụọ ụkwọ.

Otu n'ime ndị isi na Central Bank nke Naịjịrịa bụ Musa Jimoh kwuru na ndị mmadụ ghọtahiere ya bụ atụmatụ.

Jimoh sị na iwu gọọmenti kwuru ka ndị na-ere ahịa kwụwa ụgwọ nke ha kpọrọ "stamp duty' na Bekee.

Mana ọnweghị mgbe ya bụ iwu kwuru ka ndị na-azụ ahịa kwụọ ya bụ ụkwọ, kama na ọ bụ ndị na-ere ere ga-akwụ ya.

Ọ sịkwa na ha kwere ndị na-ere ahịa nkwa na ha ga-agba mbọ ihu na ndị ụlọakụ dị iche iche napụtara ndị na-ere ahịa naịrịa iri ise bụ ego stampụ.

Jimoh kwusiri ike na "ego stamp" abụghị ndị na-azụ ahịa kwesiri ịkwụ ya".

Ọgbakwara ama na Central bank agaghị akwụsịnwu ya bụ ego "stamp" maka na ọbụghị n'aka ha ka ọ dị.

Ihe mere e ji nwụchie onyeomeiwu - Uweojii

Image copyright INSTAGRAM/SHINAPELLER

Ndị uweojii Legọs akọwala ihe mere ha nwuchie Shina Peller bụ onye omeiwu nwe ụlọ nkwari a kpọrọ 'Quilox club' dị na Legọs.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Bala Elkana sị na ọ bụ maka Shina Peller na ndị agboro wakporo ụlọ ndị uweojii dị na Maroko.

Ha sị na ọ bụ maka kpachikpachi okporoụzọ mere site etu ndị bịara ịṅụ mmanya na Quilox ji dochie ụgbọala n'okporoụzọ Ozumba Mbadi.

Ndị uweojii gara buru ụgbọala atọ ndị a sị kwụchiri ụzọ nke mere Shina Peller ji kpọrọ ndị agboro gawa n'ụlọ ndị uweojii.

Orji Uzo Kanu na mkpọrọ ya

Image copyright Orji Uzor kalu

Ụlọikpe ukwu dị na Legọs ajụla ịnabata arịrịo Orji Uzor Kalu rịọrọ ka a tọhapụ ya site n'ụlọmkpọrọ.

Ọkaikpe Mohammed Liman sị ka Orji Uzor bụ aka chịburu Abia steeti nọrọ n'ụlọmkpọrọ ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị ga-atụle akwụkwọ ọ gbara.

Ọkaikpe a jụrụ ihe mere Kalu ji gbapụ ọsọ tinye akwụkwọ a mgbe ụlọikpe mkpegharị achabibeghi ikpe nke mbụ ọ gbara.

Cheta na Kalu site n'aka ndị ọkaiwu ya gbara akwụkwọ sị ka ụlọikpe tọhapụ maka na ahụ adịghị ya.

E boro Kalu ebubo iri ego dị ijeri naịra asaa na ụma mgbe ọ na-achị dịka gọvanọ Abia steei bụ nke ikpe mara ya.

Mmanya akụoyibo egbuola ihe ruru mmadụ asatọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mmiri akụoyibo bụ ngwa kacha mkpa e ji emepụta mmanya lambanog

Ihe ruru mmadụ asatọ anwụọla ka ha ṅụchara mmanya e ji mmiri akịoyibo nke a na-akpọ Lambanog mee, na mba Filipines.

Ihe ruru mmadụ narị atọ ọzọ nọ n'ụlọọwgwụ ugbua anata ọgwụgwọ dị ka ha na-ekwuputa maka afọ mgbu na anya ajụ.

'Inwe kabal adịghị njọ'

Image copyright Twitter/Garba Shehu

Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari, ekwuola na o nweghi ihe o mere ma e nwee 'Kabal' na-enyere Buhari aka n'ọchịchị.

Shehu kwuru na gọọmentị niile dị n'ụwa nwere ụdịrị ndị ahụ, n'ihi na onyeisiala ọbụla ga-enwerịrị ndị na-adụ ya ọdụ nakwa ndị ọ tụkwasịrị obi.

Gịnị ka a ga-eme ndị 'yahoo-yahoo'?

Otu ngalaba na-arụ ọrụ na-efu ekwuola na ọ ga-aka mma inyere ndị anwụchiri maka igwu wayo nke a na-akpọ 'yahoo yahoo' na Bekee aka, kama ịtụ ha nga.

Ngalaba 'VELMA Foundation' ahụ kwuru sị na ntaramahụhụ ahụ anaghị enyere ha aka, kama na ọ ga-aka mma ịhụ na onye ahụ chegharịrị n'ọrụ ọjọọ ahụ ma baara ọha uru.

Onye ka Arteta ga-eji mepee akwụkwọ n'Arsenal?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mikel Arteta

Kepu kepu si Arsenal apụta na-akọwa na Mikel Arteta ka malitere ịchịkọta Arsenal, amarala ndị ọhụrụ ọ chọrọ ịzụbata.

Akụkọ na-ekwu na Arteta agbadola anya ebe Dries Mertens nke Napoli na Kevin Volland nke Bayer Levekusen nọ.

Naịjirịa anaghị akwado mmegide okpukperechi - Lai Mohammed

Image copyright Getty Images

Gọọmentị etiti akatọọla aha ọjọọ mba Amerịka kpọrọ Naịjirịa nke ha sị so na mba ndị na-esonye maọbụ na-akwado mmegide mmadụ inwe okpukperechi masịrị ya.

Lai Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi, kwuru sị na aha ọjọọ a si n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ iji okpukperechi akatọ ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari.

Iwu ọhụrụ ndị 'Central Bank of Nigeria' tinyere

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị na-eweta ego ruru puku otu narị naịra nwereike ịkwụ ụgwọ karịa ugboro iri

Ụlọakụ gị ga na-anazị gị naịra iri atọ na ise karịa iri isii na ise a na-ana ma i si n'igwe ATM na-abụghị nke ụlọakụ gị dọrọ ego.

Nke a bụ makana ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ CBN enyela ha iwu ka ha butuo ya ma wetukwaa aka n'ụfọdụ ụgwọ ndị ọzọ.

Ọgụ chara n'ụlọmkpọrọ

Image copyright Reuters

Ihe ruru ndị nga iri na isii anwụọla ka ọgụ chara n'etiti otu abụọ n'ime ụlọmkpọrọ El Porvenir dị na Tegucigalpa dị na mba Họnduras, na-erughi ụbọchị abụọ ọgụ dapụtara na mkpọrọ ọzọ.

Ndị na-arụ na mkpọrọ ndị a sị na e ji ma egbe ma mma lụọ ọgụ a takwara isi mmadụ iri na asatọ n'ụbọchị Fraịde.

Oge egwuregwu ndị Manchester City

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Guardiola bụ onye nchịkọta ha sị na o degaara Premier League akwụkwọ ozi iji sị ha 'daalụ'

Ndị Manchester City na-ajụ ndị Premier League ajụjụ maka ntinye oge ha ga-eji agba asọmpi, dịka ha ga-agba asọmpi abụọ n'ime awa iri anọ na isii.

Man City ga-ebu ụzọ zute Wolves n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa a, ma zutekwa Sheffield United n'ụbọchị iri abụọ na itoolu.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ