Sowore: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Image copyright Instagram/@yelesho
Nkenke aha onyonyo Omoyele Sowore

Dịka ọ dị ugbua Sowore enwerela onwe ya dịka ndị ntaakụkọ Sahara Reporters gosiri n'akara twitter ha.

Kemgbe ahụ ọtụ mmadụ ekwuola ọtụtụ ihe gbasara ntọhapụ atọhapụrụ ya.

Onye Ọkaiwu bụ Malachy Ugwummadụ sị na ịtọhapụ Sowore ugbua bụ ịmechepụ ihu ihere gọọmenti bụ nke ha mechuru onwe ha site n'ijichi ya kemgbe ụlọikpe sị ka ahapụ ya.

Nwaamadị Brown Godwin kwuru n'akara Twitter ya na ọ dịka onyeisiala na-agbara ndị mmadụ Ekeresimesi site n'ịtọhapụ Dasuki na Sowore.

Femi Fani Kayode na onwe ya sị "ihere megbu ndị niile kwadoro ka ejichie Sowore na Dasuki"

Nwafọ Igbo ama ama na Twitter bụ Joe Aba sị na obi dị ya ụtọ ka esi tohapụ Sowore na Dasuki ugbua, mana na ọ bụrụ na atọhapụrụ ha mgbe ekwesiri, na ọtụtụ ihe meberi agaghị emebi.

Ndị otu SERAP na ọnwe ha sị na ha nabatara ntọhapụ atọhapụru Sowore na Dasuki mana ha ji ohere a arịọ gọọmenti ka ha kagbuo ebubo niile eboro ya ma tọhapụkwa ndị ọzọ dịka Agba Jalingo ozugbo ozugbo ma malite ịkwanyere ikike dịịrị onye ugwu na Naịjirịa.

Ọ sị na gọọmentị Buhari ekpebie irube isi n'iwu ụlọikpe nyere sị ka atọhapụ Dasuki na Sowore.

Malami sị na mkpebi ka a tọhapụ ha bụ n'usoro na ha ga-erube isi n'iwu na-eche ntọhapụ ha dịka ụlọikpe kwuru.

N'okwu ya Malami sị "mmadụ abụọ ndị a ga-erube isi n'ọnọdụ ụlọikpe nyere iji tọhapụ ha ma ghara ime ihe ọbụla ga-ebute ọgbaghaara n'obodo."

Mana Malami sịrị na ọ ga-agba akwụkwọ n'ụlọikpe megide iwu sị ka a tọhapụ ha kama na ha gaa n'ihu kporie ndụ nwereonwe ha ugbua.

Ịmetọ nwa nwaanyi Image copyright Getty Images

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Olando Ikoku ekwuola na ha nwetera mkpesa sị na otu Pastor metọrọ otu nwatakiri gbara afọ iri na nwanne ya nwannyi gbara afọ iri na isii.

Pastọ ahụ aha ya bụ Kennedth Onyeali bụ onyeisi nchụaja ndị Christ New Covenant Church dị n'okpuruọchịchị Ohaji Egbema dị n'Imo steeti.

Onyeali metọrọ nwa ahụ ka ọ na-ekpere ya ekpere ka ahụ dị ya mma.

Nne ụmụaka ahụ bụ Ijeoma Emeoha kọwara na nke a mere mgbe ya bụ Pastọ sị ka ya kpọtara ya nwa ya nke gbara afọ iri ka ọ lokọta nwanne ya anya n'ebe a na-ekpere ya ekpere na chọchị ya.

Nwan ya nke ahụ a na-ekpere kpere nwere nkwarụ n'ọkpa ya bụ nke mere ka ọ kwụsị akwụkwọ.

Ijeoma kwuru, na "pastọ ahụ na-akwasa nwa m ikpo chọwara nwa m nke nta mgbe ike nke ọzọ gwuru ya".

O kwuru na ya chọpụtara ihe mere mgbe obara si na ahụ nwa ya apụta.

N'okwu ya, Olando Ikoku sị na ya bụ Pastọ ghọgburu nwa ahụ ịkweta na ịkwasa ya iko bụ naani ụzọ ọ ga-esi gbakee na ya bụ ọrịa.

Sowore na Dasuki enwerela onwe ha

Dasuki na Sowore Image copyright Getty Images

Gọọmentị atọhapụ onye mkpọkọta otu 'RevolutionNow' bụ Sowore na onye bụbụ onye ndụmọdụ na nchekwa bụ Sambo Dasuki.

Ọ bụ ọkaiwu ukwu nke gọọmenti etiti bụ Abubakar Malami nyere iwu sị ka ndị ụlọọrụ nchekwa DSS tọhapụ ha.

Nyocha akụkọ ị nụrụ maka Naịjirịa - Buhari gwara Amerịka

Mohammadu Buhari Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala mba Amerịka ka ha sie imi n'ala mara ebe ha si enwete akụkọ banyere Naịjirịa dịka ọtụtụ ha bụ akụkọ nduhie.

Nke a na-abịa dịka Amerịka tinyere aha Naịjirịa na mba ndị na-akpagbu mmadụ n'ihi okpukperechi ha.

N'ofesi

Ụmụakwụkwọ so na-eme ngagharịiwe Image copyright EPA

Mba India ewepụtala akwụkwọ ọnụọgụgụ ọhụrụ n'agbanyeghi ngagharịiwe ndị mba ahụ mere megide iwu ịbụ nwa amaala.

Gọọmentị India sị na akwụkwọ a ga-egosi mmadụ ole ka ndụ ma nyekwa aka iji hiwe iwu ọhụrụ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌgbambọ: Etu m si hapụ ọrụ ọkaiwu kwawa akwa

Gunmen raid: Buhari etiela Jonathan aka n'obi

Goodluck Jonathan Image copyright Getty Images

Onyeisiala Buhari etiela Goodluck Jonathan aka n'obi maka ndị ojiegbe wakporo ụlọ ya n'Otuoke dị na Bayelsa steeti.

Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Tuzde kwuru na ndị oji egbe wakporo ụlọ onye chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan ụbọchị Monde ma gbuo otu onye agha Naijiria.

Akụkọ kwuru na Jonathan anọghị n'ụlọ oge mkpamkpa ahụ kpara mana ọnụ na-ekwuru ya bụ Ikechukwu Eze, gwara onye ntaakụkọ BBC na ya bụ mwakpo mere n'ụlọ nchekwa dị nso n'azụ ụlọ Jonathan ya

Buhari onye kpọrọ Jonathan n'ekwentị kwuru na ọ bụ ihe obi mgbawa.O tokwara ndị agha Naijiria maka ịgba mbọ hụ na- ha gbochiri mkpamkpa kara ịkpa.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu gbara ama nke a n'ozi o wepụtara.

Bọjeetị Enugwu steeti

Gọọmentị Enugwu steeti nke Ifeanyi Ugwuanyi nọ n'isi ya edepụtala ijeri otu narị naịra na iri isii na itoolu dịka ego ha ga-eji rụọ ọrụ nke afọ 2020.

Ọ mapụtara otu ijeri iji rụnye ụlọmposi na gburugburu steeti ahụ, iji sonye gọọmenti etiti n'ọgụ ịkwụsị nnyụsasị nsị ebe niile n'afọ 2025.

A tọrọla onye ụlọọrụ WAEC

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị ojiegbe atọrọla otu onye ụlọọrụ WAEC na mmadụ atọ ọzọ n'Ondo steeti.

Dịka akụkọ a si kwuo, ndị ntọrọ a akpọọla oku ka a kwụọ ha nde iri abụọ tupu ha atọghapụ ndị ha ji.

Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 25

Image copyright Palembang Search and Rescue Agency/Instagram
Nkenke aha onyonyo Ihe ruru ndị ọrụ gbatagbata 120 na-enye aka ịzọpụta ndị mmadụ

Ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise anwụọla ebe mmadụ iri na atọ ọzọ merụrụ ahụ ka otu bọọsụ makpuru n'ime mmiri n'Indoneshia.

Ka ọ dị ugbua, a ka na-enyo ihe kpatara ihe mberede a mere n'ụzọ Liku Lematang, dịka e zipuru ndị gbatagbata ka ha nyere aka ịchọta ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.

Manchester United a ga-azụ onye ọhụrụ?

Kepu kepu si n'ọgbọ egwuregwu apụta na-akọwa na Man Utd esonyela na ndị na-agba ọsọ ịzụta Erling Haaland n'aka ndị Salzburg.

N'otu aka ahụ, akụkọ na-ekwukwa na Chelsea na-akwado ịzụta Isco na-agbara Real Mdrid bọọlụ.

'Gọọmentị biko gbatara anyị ọsọ enyemaka n'Ọnịcha'

Ndị na-azụ ahịa n'Ọnịcha 'head bridge' akpọkuola gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ọtụtụ ngwaahịa ha lara n'iyi n'ọkụ gbara ahịa ahụ ụnyaahụ.

Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ metụtara ihe ruru ọnụụlọahịa iri anọ dị n'ọgbọ osisi, ọgbọ foam nakwa ọgbọ ji.

Onyeisi ahịa ahụ bụ Sunday Obinze, kwuru na ọ na-eche na ọ bụ waya latrik malitere ọkụ ahụ.

Ebe Collins Onwunali bụ odeakwụkwọ ndị ọgbọ ji, kwuru na obi dị ya ụtọ na ọkụ a ataghị isi mmadụ.

Ngagharịudo na Delta steeti,

Ụfọdụ ndị ọrụ Bekee a kwụsịrị ọrụ n'ike na Delta steeti n'afọ 2015 emeela ngagharịudo maka mmadụ narị anọ na iri ise gọọmentị steeti ahụ kpọghachitere n'ọrụ.

Ha kwuru na aha ndị ahụ a kpọghachitere esoghi n'ihe karịrị mmadụ puku atọ gọọmentị kwụsịrị ọrụ n'ike mgbe ahụ.

A chụọla onyeisi Boeing,

Image copyright Getty Images

Ndị ụlọọrụ Boeing achụọla onyeisi ha bụ Dennis Muilenburg ụkwụ eru ala, maka mkpọkasị ụgbọelu 737 Max abụọ kpọkasịrị n'afọ a.

Ndị Boeing kpọpụtakwara aha David Calhoun dịka onye ga-anọchi ya, mana ụfọdụ ndị ezinaụlọ ha nwụrụ n'ihe mberede ahụ ekwuola na onye ọhụrụ a amasịghị ha.

Ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

A nwụchiela otu onye na-akwado Chelsea maka iji ịkpa oke agbụrụ kparịa Son Heung-min na-agbara Tottenham bọọlụ.

Ndị uweojii kwukwara na ha nwụchiri mmadụ isii ndị ọzọ maka mkparị a, ụbọchị Chelsea meriri Tottenham na be ha.

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChristmas Carol: Lee etu ndị dara ogbi si a bụ abụ ekeresimesi

Isiokwu Ndị Emetụtara