2019 Summary: Tacha, Cardi B, Ike Ekweremadu na ihe ndị ọzọ ị gaghị echefu maka afọ 2019
- Chimamaka Ihenacho
- Broadcast Journalist, Igbo

Ebe foto si, Instagram/Tacha, Cardi B, Getty Images
Dịka afọ 2019 na-abịa na nchịkọta, BBC Igbo na-echetara gị ihe ndị mere n'afọ ị na-agaghị akpọfu n'imi.
Site n'ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Disemba, ọtụtụ ihe mere bụ ihe wugidere ewu a jụwazịa ma ọ bụzị 'chi bọọ a nụ ọzọ'?
Lee ụfọdụ ihe ndị ahụ ebe a.
1) Mwakpo Ike Ekweremadu
Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụrụ na ị nụghị maka mwakpo a wakporo Ike Ekweremadụ bụ sinetọ n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa n'ọnwa Ọgọstụ 2019, kedụzị ebe ị gara?
N'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgọstụ ahụ, Ekweremadu gara ebe a kpọrọ ya oku pụrụ iche ka ọ bịa soro ndị Igbo rie ji ọhụrụ na mba Jamini, mana akụkọ dagharịrị ka ọ hụrụ onwe ya ebe ọ na-azọ isi onwe ya.
Ndị Ipob pụtara sị na ọ bụ ha wakporo ma tie dimkpa nwoke ahụ ihe, tupu ndị uweojii mba Jamini akpọrọ ya pụọ ebe ahụ.
Na e mechara wakpoo Rotimi Amaechi bụ minista na-ahụ maka njem, ewurughi ka nke a.
2) Alụmdi na nwunye Regina Daniels
Ebe foto si, Instagram/Regina Daniels
N'ọnwa Mee nke afọ a ka akụkọ malitere ifegharị na Regina Daniels bụ ome ejije a ma ama na Nollywood lụrụ Ned Nwoko bụbu onye omeiwu nta.
Kepu kepu a malitere mgbe Regina malitere itinye foto dị iche iche na-egosi ka ọ na-ekpori ndụ nakwa na-azụta ụgbọala nakwa ụlọ dị iche iche n'ime obere oge, n'elu soshal midia ya.
Ndị mmadụ nọ na-ajụ ebe ego niile a si apụta, tupu ndị 'onyokomita' enyoputa na e nwere ihe jikọrọ ya na Nwoko.
N'ọnwa Ọgọstụ ka Regina mechara pụta kwuo na ọ bụ eziokwu na ọ lụọla Nwoko.
3) Okwu Busola Dakolo na Biodun Fatoyinbo:
Ebe foto si, @biodunfatoyinbo/@busoladakolo
N'ụtụtụ ụbọchị 28 nke ọnwa Juun ka ndị Naịjirịa tetara ụra ịnụ na Busola Dakolo bụ nwunye otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo, na-ebo Biodun Fatoyinbo bụ ụkọchukwu ebubo ndina n'ike.
E kwugidere okwu gbasara ebubo a makana Fatoyinbo bụ ụkọchukwu nnukwu ụlọụka a ma dịka Commonwealth of Zion Assembly (COZA).
Ndị a ma ama na-ewu ewu pụtara kwuo ebe ha kwụ (ụfọdụ kwadoro Busola ebe ndị ọzọ kwadoro Fatoyinbo), ndị mmadụ mekwara ngagharịiwe, ebe Aisha Buhari bụ nwunye onyeisiala Naịjiria tinyekwara ọnụ.
Busola mechara gbaa Fatoyinbo akwụkwọ n'ụlọikpe, nke ụlọikpe mechara kụpụ ka ha sị na ha ahụghị ihe mgbaama a ga-eji kpee ikpe a.
4) Super Eagles natara ọlanchara:
Ebe foto si, Reuters
N'ọnwa Julaị ka asọmpi Iko Mpaghara Afrịka nke afọ 2019 nwuru ka ọkụ; n'ime ọnwa ahụ ka Ọljiria bulikwaranụ iko ahụ.
Mana Naịjiria agbaghị aka, makana ndị Super Eagles si n'ụkwụ Odion Ighalo mechara wụsa ọwa gbanye goolu nyere anyị ọlanchara maka ịbụ ndị nke atọ.
Ighalo nwetakwara ihe nrite akpụkpọụkwụ ọlaedo maka ịbụ onye kachasị nye goolu n'asọmpi ahụ.
5) Buhari ọ lụrụ nwaanyị ọhụrụ?
Ebe foto si, Getty Images
Aisha Buhari anaghị ezokarị ọnụ n'ihe gbasara ọchịchị di ya.
N'ọnwa Ọktoba ka akụkọ malitere ifegharị na Onyeisiala Muhammadu Buhari na-akwado ịlụkwasị Aisha nwunye ya nwaanyị ọhụrụ n'isi.
Akụkọ ahụ kwukwara na ọ bụ Sadiya Farouq bụ minista na-ahụ maka ihe gbasara mmadụ, ọrụ gbata gbata na mmekọrịta madụ na ibe ya, ka onyeisiala nọ na-akwado ịlụ.
Mana Farouq pụtara kwuo na enweghi ihe ọbụla jikọrọ ya na onyeisiala.
6) A chụrụ Tacha ụkwụ eru ala na Big Brother:
Ebe foto si, Youtube/BigBrotherNaija
Emume Big Brother Naịja Pepper Dem nke ugboro anọ malitere n'ọnwa Mee, mana o wugidere ruo ọnwa Ọktoba ọ gwụrụ.
N'ime owuwu ya ka mmadụ abụọ siri ike pụtara bụrụ ndị a na-akpụkarị n'ọnụ; Tacha maka ịgbasa ụfọdụ ndị mmadụ ọnụ ọjọo, nakwa Mercy maka egwu ọ na-agba nakwa ịbụ ihe ọ kpọrọ 'queen of highlights'.
Ihe mere ha jizi wuo n'ụzọ pụrụiche bụ ụbọchị ha abụọ kụkọtara isi, kọọ ezigbo ọnụ gaara ebi n'ọgụ aka ma ọ bụrụ na e gbochighi ha.
Nke a mere n'izu ikpeazụ ha n'ime ụlọ ahụ, mana nke ahụ akwụsịghị Big Brother inye Tacha ọsọ maka 'ikpalite Mercy'.
Mercy mechara merie ma nweta ego nde naịra iri atọ nakwa onyinye ụgbọala Innoson nakwa onyine ndị ọzọ ruru nde 30 ma a gụkọta ya ọnụ.
7) Davido na ndị Igbo malitere ịgọ ọgọ:
Ebe foto si, INSTAGRAM/DAVIDO ADELEKE
Otiegwu David Adeleke a ma dịka Davido gara kụọ aka n'ụzọ Chioma Rowland enyi ya nwaanyị n'ọnwa Septemba.
N'ime otu ọnwa ahụ, ọ gbanyere ọlaaka igosi ya na ọ chọrọ ịlụ ya.
N'ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba, nwata nwoke ya na Chioma mụrụ bịara ụwa. Ha gụrụ ya David Adedeji Ifeanyi Adeleke.
Ọ bụ n'afọ 2020 ka a ga-agba nkwụ nwaanyị? Ka anyị na-elenu.
8) Burna Boy ọ ga-enweta Grammy?
Ebe foto si, Getty Images
N'ụbọchị 20 nke ọnwa Nọvemba ka Burna Boy ezigbo aha ya bụ Damini Ogulu metara ihe tinyere ndị Naịjirịa ọchị n'ọnụ ọzọ.
Ụbọchị ahụ ka ozi pụtara gosiri na e debanyere aha ya na ndị nwereike inweta ntuurugo egwu na mba ofesi nke a kpọrọ Grammy.
A họpụtara ọbaegwu ya ọ kpọrọ 'African Giant' n'agba ndị nwereike inweta 'ọba egwu kachasị mma n'ụwa' nke bụ 'Best World Music Album' na Bekee.
Ka anyị na-ele ma nke a ọ ga-erute ụlọ.
9) Ntuliaka 2019:
Ebe foto si, @Atiku/@MBuhari
Ọ bụ naanị nwa e bu n'afọ nwereike ikwu na ọ maghị na e mere ntuliaka na Naịjirịa n'afọ 2019.
Ntuliaka ahụ malitere dịka 'chi bọọ a nụ ọzọ', mana o mechara bụrụ ihe gara aga ugbua.
E sitere n'iyigharị ụbọchị e kwesịrị ime ntuliaka, banye na Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị Ipob ịpụta sị ndị mmadụ ha pụta tụọ vootu karịa ịgbaghapụ ya dịka ọ gwaburu ha mbụ.
A kpọpụtara aha Onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye meriri, mana Atiku Abubakar bụ onye kacha gbalite elu ya na ya zọrọ ya ekwenyeghi na mpụtara ahụ.
Ọ gbara Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị na-ahụ maka ntuliaka, mana ha mechara sị na ọ bụ Buhari meriri n'ezie.
N'otu aka ahụ ka nke Imo steeti wuru maka ihe mere n'etiti Rochas Okorocha, Uche Nwosu bụ ọgọ ya nwoke nakwa Emeka Ihedioha.
Ibeawuchi
Ihedioha meriri na ntuliaka ahụ, Nwosu agbaa ya akwụkwọ n'ụlọikpe, mana ụlọikpe weliri Ihedioha aka dịka onye nwe oche ọchịchị ahụ.
N'aka nke ọzọ, Okorocha zọrọ oche ya n'ụlọomeiwu ukwu elu zọọ ya ala tupu o mechaa nweta ya ka e duchara ndị omeiwu ibe ya iyi ọrụ.
10) Ọbịbịa Cardi B:
Ebe foto si, Getty Images
Cardi B bụ otiegwu ezigbo aha ya bụ Belcalis Marlenis Almánzar, bịara Naịjịrịa naanị abalị atọ, mana o zuru ịtụgharị obi ọtụtụ ndị na-ahụbughi ya n'anya, mee ka ọ bụrụ 'ọdị n'obi' ha.
N'ime ụbọchị ole ahụ ọ nọrọ Naịjirịa, ọ gara zụrụ ọtụtụ ihe ịga leta ndị enweghi etu ụwa dị ha adị, ọ gakwara n'ihu zaa aha Igbo (Chioma B).
Ọ gwara ndị kpọtara ya sị ha kpọga ya ebe ọ ga-eri ezigbote nri Naịjirịa, na-abụghị nke ndị ụlọoriri na ndina.
Maka etu o si nweta obi ndị Naịjirịa, ha na ndị Gana bụ ebe ọ gawara ka o si Naịjirịa pụọ, malitere ịkọ ọnụ maka mba kacha masị otiegwu a.
Ihe nkiri a ga-amasị gị:
Christmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi