Christmas day: Ọkụ agbakọtala ụlọ karịrị 120 ọkụ na Chile

Ụlọ gbara ọkụ n'obodo Valparaíso, dị na Chile. Image copyright AFP/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụlọ gbara ọkụ

Ka ndị mmadụ na-egori maka ekeresimesi ka ụfọdụ ndị nọ na mba Chile na-ebe akwa dịka ọkụ gbara ihe ruru ụlọ narị na iri abụọ ọkụ.

Jorge Sharp bụ Meyọ n'obodo Valparaiso bụ ebe ọkụ ahụ na-agba, na-akọwa na ọ dị ka mmadụ ma ụma mụnye ya bụ ọkụ si n'ọhịa gbakọta ụlọ ndị mmadụ.

Onyeisiala Buhari na-asị gị ekeresimesi ọma

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Naịjirịa na-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari na-awụ ha n'ala na mba ofesi oge ụfọdụ

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela ndị ụka Kraịst dịka a na-agba ekeresimesi n'ụbọchị taa.

N'ekele ya, o kwuru sị ka ndị mmadụ na-egosi ịhụnanya ma gbado anya n'ihe ndị ga-ejikọta obodo ọnụ.

Ọ rịọkwara ka ndị mmadụ chetakwa ndị ọrụ nchekwa na ezinaụlọ ha ka ha na-echekwa mba a.

Buhari sịkwa ka ndị mmadụ gbado anya n'ụzọ, ma kwuo ka ndị na-elekọta ụzọ gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ so usoro izendụ, ka ihe mberede okporoụzọ nwee ike belata.

Ozi ekeresimesi Popu Francis

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Popu Francis

Pope Francis chọrọ ka ị mara na Chineke hụrụ ma onye ukwu ma onye nta n'anya, makwa ndị anyị na-ahụta ka 'ndị ọjọo'.

O kwuru nke a ka ọ na-edo maasị n'ụlọụka St Peter's Basilica dị na Vatican.

N'okwuchukwu o kwuru na ya bụ maasị, Pope Francis rịọkwara ka udo Chineke dakwasị ndị Nigeria nakwa ndị bi na mba Mali, Niger bụ ebe mkpagbu na ntọrị mmadụ na-arị ibe ya elu.

O kwuru na ọbụ mkpagbu dị otu a na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ụzọ ha si agbapụ n'obodo ha.

Ụfọdụ n'ime ha na-esi ụzọ osimiri maọbụ ịkpa ebe ọtụtụ n'ime ha na anwufu.

Ihe gọomentị chọrọ iwere gaasị ochie gị

Timipre Sylva bụ minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị, ekwuola na gọomentị etiti ga-eji aka ha agbanwe mkpokoro gaasị ndị merela ochie maọbụ mebie n'afọ ọhụrụ na-abịa.

Ekwe ọ ga-akụ Arteta n'isi?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mikel Arteta

Echi bụ ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Disemba ka Mikel Arteta ga-agba asọmpi nke mbụ ya dịka onye nchịkọta otu Arsenal.

Eddie Howe bụ onye nchịkọta Bournemouth bụ nke Arsenal ga-ezute echi, ekwuola na Arteta abụghị onye a ga-asị na ọ maghị nke o riri ma a bịa na nchịkọta.

Onye nnọchiteanya mba Amerịka gara hụ Buhari

Image copyright Getty Images

Marybeth Leonard bụ onye ọhụrụ na-anọchite mba Amerịka na Naịjirịa ekwuola na ọ bụ maka ihe ndị mmadụ na-agabiga n'ihi okpukperechi ha mere ka mba ahụ tinye Naịjirịa n'obodo ndị a ga-enyocha maka mmegbu na mmegide.

O kwuru nke a ka o zutere Onyeisiala Muhammadu Buhari n'obi ya ka ya bụ Leonard bịara imalite ọrụ ya.

Ndị oyindụegwu egbuola mmadụ 35

Ihe ruru mmadụ iri atọ na ise gụnyere ọtụtụ ụmụnwaanyị anwụọla na mba Bọkịna Faso dịka ndị a na-enyo na ha bụ ndị oyindụegwu wakporo obi ndịagha.

Akụkọ si mba ahụ apụta kwuru sị na mwakpo ahụ takwara isi ndịagha asaa na ihe ruru ndị oyindụegwu iri asatọ, ka ha na-akwakọrịta mgbọ.

Liverpool na Leicester City ga-azọ 'eze'

Image copyright Reuters

Echi bụ ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Disemba ka Liverpool bụ ndị mbụ na tebulu Premier League na Leicester City na-esote ha ga-agba mgba azụ eru ala.

Mara na Liverpool ji pọịntị iri aga Leicester City.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌgbambọ: Etu m si hapụ ọrụ ọkaiwu kwawa akwa

Isiokwu Ndị Emetụtara