Sagamu Interchange Bridge: E mechiela akwa Shagamu

Ihe mberede ọkporoụzọ mere n'okpuru Akwa Shagamu Image copyright FRSC
Nkenke aha onyonyo Ihe mberede ọkporoụzọ mere n'okpuru Akwa Shagamu

Ngalaba na-ahụ maka ihazi njem okporoụzọ bụ FRSC n'aha ịchafụ amaala ọkwa mmechi Akwa Sagami dị n'Ogun steeti.

Nke a na-eme dịka ọkụ si na nnukwu ụgbọala na-ebu mmanụ zụkọtara ọnụ gbara akwa ahụ n'ụbọchị Ekeresimesi.

N'ozi ọnụ na-ekwuru FRSC n'Ogun steeti bụ Florence Okpe wepụtara nye ndị ntaakụkọ, o kwuru na nnyocha ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ọrụ mere gosiri na ọnọdụ akwa ahụ adịzịghị mma n'ihi ọkụ ahụ gbara ya.

Nke mere o ji dị mkpa ịrụzi ya .N'ihi nke a, FRSC nyere ntuziaka ka ụgbọala ndị si ala Igbo abata site n'Ijebu Ode si ụzọ gara n'azụ ụlọọgwụ 'FRSC Emergency Road Side Clinic' dị na Sagamu ma tụgharịa tuppu ha erute Ogere.

Ha kwukwara ka ndị si Abeokuta na-aga Legọs si ụzọ Kara-Shagamu ma a gaafecha 'Julius Berger Yard' were sonyekwa Okporoụzọ si Sagamu- Ijebu Ode - Ore gawa Benin

Christmas Day Visit: Kpọwanụ m 'Baba go slow', a ga m arụ ọrụ m - Buhari

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọnụ ụfọdụ ndị mmadụ agaghị eme ka ọ kwụsị ịrụ ọrụ ya nke ọma dịka onyeisiala.

Buhari kwuru nke a oge ọ nabatara ndị ọbịa bịara kelee ya maka emume ekeresimesi n'Aso Villa.

O kwuru na ndị hụrụ ya n'anya n'ihi ọrụ ọma ọ na-arụ karịrị ndị na-akọcha ya.

Buhari kwuru sị: "Oge m kpagharịrị steeti iri atọ n'isii nke Naịjirịa maka ịchụ nta vootu, a chọpụtara m na ndị mmadụ pụtara ige m ntị abụghị ndị mmadụ ọbụla ga-akwunwu ụgwọ."

"Nke a mere ka m mata na ndị na-akwado m karịrị n'ọnụọgụgụ."

"Eji m akwụkwọ iwu Naịjirịa ṅụọ iyi. A ga m arụ ọrụ m nke ọma, ọ masị ndị mmadụ ha kpọwa m 'Baba Go Slow'.

Nwoke etigbuola nwunye ya

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị na-eme ejije gbasara nwoke na'akụ nwụnye ya ihe

Akụkọ na-ekwu na aka ndị uweojii akparala otu nwoke ji aka tigbuo nwunye ya ụbọchị ekeresimesi.

Nwoke a aha ya bụ Mutiu Sonola gbara afọ iri atọ na asaa.

Onụ na-ekwuru ndị uweojii Ogun State bụ Abimbola Oyeyemi kwuru na nnyocha ha mere gosiri na nwoke ahụ na-eji nwunye ya amụ ọkpọ kwa mgbe.

Oyeyemi kwuru na Sonola gbara ọsọ oge ọ hụrụ na nwunye ya adaala n'ala.

Ọ bụ nna nwata nwanyị ahụ gbatara buru nwa ya gawa ụlọọgwụ ebe dọkịta gwara ya na ọ nwụọla.

Sonola ka nọ na mkpọrọ ndị uweojii ezu ike ugbua.

Na Japan

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Mínísta na-ahụ maka ikpe nwkụmọtọ na Japan, Masako Mori

Mba Japan akwụgbuola otu nwoke onye mba China a mara ikpe ọnwụ maka igbu otu ezinaụlọ n'afọ 2003.

Nwoke a aha ya bụ Wei Wei gburu mmadụ anọ n'otu ezinaụlọ nke gunyere di, nwunye na ụmụ ha abụọ.

Nke a bụ nke mbụ n'ime afọ iri Japan na-egbu onye mbịarambiara a mara ikpe ọnwụ n' obodo ahụ.

Ihe karịrị otu narị mmadụ bụ ndị amkpọrọ a mara ikpe ọnwụ na japan.

Anaghị agwa ha ụbọchị a ga-egbu ha ganye n'ụbọchị ahụ eruo.

Egwuregwu bọọlụ 'Boxing Day'

Image copyright PA Media
Nkenke aha onyonyo Ndị Southampton meriri ndị Chelsea 2 - 0

Otu egwuregwu bọọlụ niile so n'asọmpi English Premier League zutere onwe n'ụbọchị Tọzde dịka omenala mba England si dị.

A na-enwekarị asọmpi bọọlụ kwa ụbọchị 'boxing day' ọbụla na mba England iji mee ka emume ekeresimesi na-ekpowanye ọkụ.

Ajọ ikuku na Philippines

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị bi n'obodo Ormoc na-egwufe na mmiri

Ihe ruru mmadụ iri anwụọla ka ajọ ifufe zakọrọ ndị mmadụ na mba Filipịns ụnyaahụ.

Ajọ ifufe ahụ a kpọrọ 'typhoon phanfone' na Bekee, ekweghị ihe karịrị mmadụ puku iri laruo ụlọ, ka ha na-eche ụgbọ ndị ga-ebula ha ụlọ ekeresimesi.

#Khadoni apụtala ihe:

Khafi Khareem nke Big Brother Nigeria Pepper Dem ekwela ịlụ Gedoni Ekpata ya na ya yịwara n'ụlọ ahụ.

Khafi obi na-atọ pọlina pọlina depụtara nke a n'elu soshal midia ya ebe o dere sị "Enwetara m onyinye Ekeresimesi kachasị mma'.

Ị nyere nne na nna gị onyinye ọbụla n'izu a?

Ọ bụrụ na ị nyeghi, bịa mụta n'aka Francisca Ordega na-agbara Super Falcons nke Naịjirịa bọolụ.

Ordega tinyere ihe onyonyo gosiri ebe nne na nna ya na-agba egwu maka ụgbọala ọhụrụ ọ zụtaara ya, ma na-enwe olileanya inye nne ya ụlọ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.

Ụgbọmmiri ekpuola na Tọki.

Image copyright Reuters

Mmadụ asaa anwụọla ka ụgbọmmiri bu ndị mbịarambịara si mba dị iche iche kpuru na mba Tọki.

A zọpụtara mmadụ iri isii na anọ bụ ndị a kpọgara ụlọọgwụ, ebe a ka na-enyocha ihe ha nọ na-eme n'ụgbọmmiri ahụ.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Jurgen Klopp nke Liverpool ekwuola na ọ bụ njọ na ụfọdụ klọb dị na Premier League ga-agba egwuregwu abụọ n'ime ụbọchị atọ.

Cheta na Pep Guardiola nke Manchester City tikwara ụdịrị mkpu a ụbọchị ole na ole gara aga.

Ndị Miyetti Allah nwere okwu banyere ndị gọvanọ Owuwa-anyanwụ

Ndị otu Miyetti Allah ekeleela ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ maka etu ha si etinye uchu na njikọta obodo.

N'ekele ekeresimesi onyeisi nke mpaghara ọwụwa-anywanwụ bụ Alhaji Gidado Siddiki zipuru n'Anambara, o kelere ndị gọvanọ a maka etu ha si nabata ndị otu ha na steeti ha.

'Anyị anwụchighi Sowore maka na ọ bụ onyentaakụkọ'

Image copyright @GarShehu
Nkenke aha onyonyo Garba Shehu

Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu ekwuola na ọ chọrọ ka ndị mba ofesi mara na gọomentị Buhari anwụchibeghi onye ntaakụkọ ọbụla maọbụ mechie ụlọntaakụkọ ọbụla kemgbe 2015 ọ banyere ọchịchị.

Shehu kwuru sị na ha anwụchighi Omoyele Sowore maka na ọ bụ onye ntaakụkọ, kama na ọ bụ maka ọkwa 'ikwatu gọomentị' ọ mara.

Ihe ga-eme na Premier League taa:

Ka ị na-ezu ike n'ụlọ gị ka a ga na-enyo ma ndị nchịkọta ọhụrụ a zụtara na Premier League a ga-azanwukwa aha nna ha.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ancelotti ka banyere n'ihe bụ afọ abụọ dịka onye nchịkọta Napoli, tupu a chụọ ya

Onye dịka Carlo Ancelotti ga-egosi ma ego Everton ji zụta ya ọ bụ n'efu mgbe ha ga-ezute Burnley ebe elekere atọ nke ehihie taa.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChristmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi

Isiokwu Ndị Emetụtara