2019 Prophecies: Amụma e buru na 2019, ndị mezuru na ndị gbara ụka

Fada Mbaka na Onye Amụma Emmanuel Omale Image copyright Amen/Emmanuel Omale/Facebook

Dịka afọ 2019 na-abịa na njedebe, BBC Igbo lebara anya n'ụfọdụ amụma ndị ụkọchukwu mara banyere ihe ndị ga-emenụ.

Nnyocha anyị gosiri na ụfọdụ mere , ebe ụfọdụ ghọrọ ka nri gbara ụka n'ihi na ha emezughị.

1. Buhari ga-emeri na ntuliaka 2019- Mbaka, Omale

Image copyright Getty Images

Onye Amuma Emmanuel Omale nke Divine Hand of God Prophetic Ministry dị na Abuja buru amụma na Onyeisiala Muhammadụu Buhari ga-emeri ntuliaka 2019.

Fada Ejike Mbaka bụ onye ndu isi otu Adoration Ministry, Enugwu, kwuru na ya amaghị onye ga-emeri na ntuliaka 2019 mana na Atiku abughị ya bụ "onye nzọpụta Naijiria."

Amụma ahụ mezuru dịka Buhari meriri Atiku na ntuliaka nke e mere n'ọnwa Febuwari afọ afọ 2019.

2. Atiku tinye uchu n'Ugwu Naijiria- Suleiman

Image copyright Omega Fire Ministries/Facebook

Johnson Suleiman nke ụlọụka 'Omega Fire Ministries International' nọrọ n'amụma nke ya dọọ Abubakar Atiku nke PDP, onye ya na Buhari zọkọrọ ọkwa na ntuliaka ahụ, aka na ntị ka o tinye uchu karịa na inweta nkwado ndị ugwu na ntuliaka 2019.

Nke a mezuru n'ihi na Atiku nwetara ezigbo nkwado na Ndịda Anyanwu Naijiria ma gbaa ọnyụpa n'Ugwu Naijiria.

3. A ga-anwụchi onye zọrọ ọkwa onyeisiala

Suleiman makwara amụma na a ga-anwụchi otu onye zọrọla ọkwa onyeisiala.

Nke a mezuru n'ihi na ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS nwuchiri Omoyele Sowore nke zọrọ ọkwa onyeisiala na Ntuliaka 2019 n'aha AAC maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmenti tụnye ya na nga ọnwa anọ.

4. Otu onye chịbụrụ gọvanọ ga aga nga- Omale

Image copyright Emmanuel Omale/Facebook

Omale bukwara amụma na otu aka chiburu otu steeti ga-aga mkpọrọ.

Nke mezuru dịka Orji Uzor Kalu chiburu Abia steeti nọ n'ụlọ mkpọrọ ugbua dịka a mara ya ikpe imefu ego ndị Abia.

Nkenke aha onyonyo Orji Uzo Kalu aka chịburu Abia Steeti

Amụma ndị emezughị;

5.Ntọ nnukwu ọgaranya si Ọwụwa Anyanwụ na-azụ ahịa mmanu

Omale kwuru na a ga-akpa nkata igbu maọbụ ịtọrọ otu onye nnukwu mmadụ si Ọwụwa Anyanwụ nọ n'ahịa mmanu nke ga-ebute ọgbaghara a ga-eji gbaa ahịa a ma ama ọkụ.

Ahịa Onicha na Balogun dị na Legọs gbara ọkụ mana o nweghị ka o siri metụta ọgaranya Igbo ọbụla.

6. Ndịagha ga-enupu isi- Ayodele

Image copyright INRI Evangelical Church/Facebook
Nkenke aha onyonyo Primate Elijah Ayodele bụ onye ndu INRI Evangelical Church

Primate Elijah Ayodele nke INRI Evangelical Church mara amụma na ndị agha Naijiria ga-enupu isi nye ndị isi ha.

Nke a emezughị, mana ihe o kwuru na ihe ga-esiwanye ike mezuru dịka ihe ịda oke ọnụahịa na-aga n'ihu.

7. Atiku ga-eweghara ọchịchị n'aka Buhari- Olagunju

Wale Olagunju, nke ụlọụka 'Divine Seed of God Chapel Ministries', Sasa,Ibadan mmara amụma na Chineke ga-anara Buhari ọchịchị nyefe Atiku n'aka n'afọ 2019.

Nke a emezughị. Buhari ka nọ n'oche ya.

Naịjiria bụ ala ọtụtụ ndị nọ na ya ejighị okpukperechi na okwu sị n'ọnụ ndị ndu ha egwu egwu, n'agbagheghị mpụtara okwu ndị ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị: