Abuja Bank Robbery: Aka ndị uweojii akparala ndị ohi wakporo ụlọakụ n'Abuja

Ndị uweojii Image copyright Channels TV

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa anwụchiela ndị ohi mmadụ anọ wakporo otu ụlọakụ n'Abuja.

Ha gbagbukwara otu onye ọzọ n'ime ndị oji egbe ezu ahụ.

Ndị ekperima ahụ wakporo ya bụ ụlọakụ dị na Mpape, Abuja, n'ụtụtụ ụbọchị Satọdee.

Mana oteghi aka ha banyechara n'ime ya, ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndị agha gbara ya bụ ụlọakụ gburugburu.

Nke a mere ka ndị ohi ahụ tọkịrị n'ime ụlọakụ ahụ maka na jewe ejewe adịghịzị mma, lawa alawa adịghị mma.

Otu onye n'ime ndị omekome ahụ chọrọ isi azụ owere mịpụ, mana ndị uweojii nwụchiri ya otu aka ahụ.

Mana ka nwa oge gachara ndị uweojii nwụchiri ndị ekperima ahụ niile.

Tinyere otu n'ime ha onye mgbọ tụrụ o wee nwụọ.

Aka akparala onye uweojii ekperima

Image copyright Lagos Police

Aka ndị uweojii akparala ofu onye otu ha ji egbe gbagbuo otu nwata nwaokorobịa na mpaghara Legọs Aịland ụbọchị Fraịde.

Onye uweojii a aha ya bụ Lukmon Akanbi na nwaokorobịa aha ya bụ Ramon Adeniyi nwere obere nghọtahie o wee mịrị egbe gbatuo ya.

Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs kwuru na e kpeela Akanbi ikpe imeụlọ dịka iwu ndị uweojii sị dị, wee chụọ ya n'ọrụ.

Ugbua, a hafeela ya n'aka ndị ngalaba na-enyocha mpụ bụ 'State Criminal Investigation Department' ka ha kpụpụ ya ụlọ ikpe.

Ndị oyi gewu akpaala arụ na Somalia

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ nwụrụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ndị oyi egwu tụrụ ogbunigwe na Somalịa n'ụbọchị Satọdee.

Ogbunigwe e tinyere n'ụgbọala agbagbuola mmadụ iri asaa na isii na mba Somalia.

Ndị ntaakụkọ ụfọdụ na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ eruola iri itoolu.

A na-ele anya na ọnụọgụgụ a ka ga-agbago.

Amatabeghị ndị tụrụ ya bụ ogbunigwe mana ndị otu oyi egwu bụ al-Shabab na-ebuso Somalia agha kwa mgbe kwa mgbe.

Ndị na-eyi ndụ egwu agaghị emeri anyị - Buhari

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu ndị otu ISWAP gburu dimkpa iri bụ ndị ụka kristi n'ihe onyonyo iji bọ ọbọ onyeisi ha e gburu na mba Syria.

Buhari kwuputara n'akara soshal midia ya na ọnwụ ndị ahụ aka ha dị ọcha wutere ya ma tụkwaa ya n'anya.

O kwukwara sị na onye ọbụla kpọrọ "Allahu Akbar" na egbu mmadụ abụghị onye alakụba n'eziokwu.

'Di m na ụmụ m ma egwu mmiri'

Image copyright Facebook

Nwunye ụkọchukwu ụlọụka Redeem nwụrụ n'ọdọ mmiri na-eti mkpu na aka enwe dị na ofe.

Gabriel Diya na ụmụ ya abụọ nwụrụ ebe ha gara ezumike na mba Spen mana nwunye na-akọwa na ọ bụghị mmiri riri ha n'ihi na ha atọ ma egwu mmiri ọfụma ọfụma.

Bọjetị Enugwu Steeti

Image copyright Facebook/Ugwuanyi News Update
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi

Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi ebinyela aka n'akwụkwọ atụmatụ mkpata na mmefu ego nke steeti ahụ maka afọ 2020.

Ugwuanyị mapụtara narị ijeri naịra 169 na ụma (N169.5 billion) dịka ego a ga-eji rụọ ọrụ na steeti ahụ n'afọ na-abịa abịa.

N'ime ego a, otu narị ijeri naịra na ụma (100.7 billion) bụ nke a ga-eji arụpụta ọrụ gbara ọkpụrụkpụ nke a ga-ahụ anya.

Ijeri naịra iri isii na asatọ na ụma (N68.7) billion bụ nke a ga-eji gboo mkpa ndị ọzọ dịka ịkwụ ndịọrụ ụgwọ dgz.

EPL

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Clavert-Lewin na-ekele onye nkuzi ya bụ Carlo Ancelloti

Calvert Lewin nyere goolu abụọ nke ndị Everton ji weee merie ndị Newcastle n'asọmpị EPL ụbọchị Satọdee.

Brighton merikwara Bournemouth 2-0, Watford apịa Aston Villa 3-0 ebe Southampton na Crustal Palace nyere onwe ha otu goolu otu goolu.

Manchester United ga-ezute ndị Burnley, Tottenham na Norwich ga-achịpụ ya, ebe ndị Leicester na-ezute ndị West Ham ugbua.

Kedụ onye obi na-asọ rịkpọ?

Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Peter Utaka ekwuola na obi na-eme ya pọlina pọlịna dịka ọ na-akwado ịsonye otu Kyoto Sanga nke Japan.

Utaka dị afọ iri atọ na abụọ agbarala otu dị icheiche na Belgium Denmark nakwa China bọọlụ mbụ.

Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji