Uche Nwosu: 'Ọ gara nlegharị anya na AA ma laghachite APC '- FCC Jones

Uche Nwosu Image copyright Facebook/Nwosu

Ọnụ na-ekwuchitere pati APC n'Imo steeti bụ FCC Jones ekwuola na Uche Nwosu alaghachitela otu All Progressives Congress bụbu pati ya.

Cheta na Nwosu zọburu ọkwa gọvanọ n'okpuru otu Action Alliance na ntuliaka 2019.

Jones kwuru na Uche Nwosu gara nlegharị anya n'otu AA mgbe ọ zọrọ ọchịchị n'okpuru pati ahụ maka oke nrụrụaka juru pati APC mgbe gara aga.

N'okwu ya, 'ihe a dị n'atụmaatụ a na-ahazi kamgbe."

"Ugbua Uche Nwosu ga-esonye Rochas Okorocha nakwa Muhammadu Buhari bụ onyeisiala."

O kwuru na Uche Nwosu kwenyere na APC kamgbe ụwa ma ga-esokwa dozie ya bụ pati ka ihe mere na mbụ ghara imekwa ọzọ.

O kwuru na etu ọdị ugbua, Nwosu na-eme azụmahịa ma chebiri ntuliaka na-abịa n'ihu.

Chụpadonu ndị oyindụegwu - Buratai

Image copyright Nigeria Army/Twitter

Tukur Buratai bụ ọchịagha ndị agha Naịjirịa agwala ndị agha na-ahụ maka Operation Lafia Dole n'Adamawa steeti ka ha chụpado ndị oyindụegwu ghara inye ha oghere ikute ume.

O kwuru na gọọmentị ga-enye ha nkwado ha ga-eji buso iyindụegwu agha.

A kwatuola ụlọ 2500 na-adịghị mma

Ngalaba Lagos State Environmental and Special Offences (Enforcement) Unit akwatuola ihe karịrị ụlọ ọjọo puku abụọ na narị ise a rụrụ na nso mmiri dị na Marwa dị na Lekki.

Onyeisi ha bụ Olayinka Egbeyemi kwuru na nkwatu a bụ maka nkwado ha na-akwado ịrụ ụzọ ọzọ a ga-esi na-aga Lekki-Epe.

'Gbalahụnụ ọkụ ọgbụgba'

Image copyright EPA

A gwala ihe karịrị mmadụ puku iri bi nakwa bịa nlegharịa anya n'obodo Victoria dị na mba Ọstrelia ka ha kwapụ gbaa ọsọ ndụ.

Nke a bụ ụzọ e si adọ ha aka na ntị makana a na-eche na ọkụ ọgbụgba na-agba ọhịa ndị dị n'obodo ahụ na-akawanye njọ.

Chelsea gwọrọ Arsenal ara

Image copyright Getty Images

Chelsea ekweghi Arsenal zọọ ha mpịtị mpị ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Emirates.

Ha ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu wee sị Arsenal 'taa kpuchie ọnụ' n'agbanyeghi na ha bụ ọbịa na be ha.

Gụọ ya n'uju ebe a: Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ

NCC adụọla ụlọọrụ na-enye ikuku ekwenti ọdụ

Nkenke aha onyonyo Teleology meriri Glo, Airtel na Alheri iji nweta ohere ịzụ 9mobile

Ngalaba na-ahụ maka nhazi etu ndị ọrụ ikuku mgbasa ozi n'ekwenti bụ Nigeria Communications Commission adụọla ndị ụlọọrụ na-enye ikuku ekwenti ọdụ

Ndụmọdụ a ha nyere gbasara ịnye ndị mmadụ ruo abali iri anọ na ise tupu ha si na otu igwe na-enye ikuku ekwenti fere ọzọ.

N'ofesi,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị ụka Jew juru na Monsey dị na New York

Amaala mmadụ ise mma n'ụlọ onyeisi ụlọụka Jew n'obodo New York dị na mba Amerịka.

Nke a na-eme dịka ndị ụka ahụ na-eme mmemme. Ndị uweojii anwụchiela onye a na-eche mere mkpa mkpa a.

Amabeghị ihe mere onye a ji wakpo ụlọụka ahụ.

Otu akpọrọ "Orthodox Jewish Public Affairs Council (OJPAC)" na asụrụ otu mma ugboro isii.

Chelsea na Arsenal ga-akwata ya

Image copyright Getty Images

A ga-ama mbe nabụ nke bụ oke taa dịka Chelsea na Arsenal ga-ezute onwe ha n'egwuregwu Premier League nke ga-eme n'elekere abụọ nke ehihie.

Chai, onye mere Manuel Pellegrini ihe a?

Image copyright Getty Images

West Ham achụọla onyeisi ha bụ Manuel Pellegrini ọsọ ọkpa eru ala.

Otu egwuregwu ahụ mere nke a k a Leicester City meriri West Ham site n'inye ha ọkpụ goolu abụọ asatara otu mere ya mmeri itoolu n'ime egwuregwu iri na abụọ ha gbagoro n'izu a.

A na-atụ anya na ha nwereike ị họpụta aka chiburu West Ham akpọrọ David Moyes i so na ndị nwereike inọchite anya Pellegrini.

Atiku na ụmụ Naịjirịa etoola ndị uweojii

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme

Onye jibu ọkọlọtọ PDP zọọ oche onyeisiala bụ Atiku Abubakar etoola ndi uweojii etu ha siri mee ngwa ngwa nwuchie ndị ohị bịara ịwakpo ụlọakụ dị na Mpape, Abuja ma kwuo uru ọ bara inye ụmụ

Naịjirịa ezi nchekwa n'afọ 2020 na-bịanụ.

Ebe ụfọdụ ụmụ Naịjirịa kwuru na etu ndị ohi ahụ si tọkịrị n'ụlọakụ ahu dịka ihe a na-ahụ n'ihe nkiri.

Nke mere ka ihe nkiri akpọrọ 'Money Heist' na-ewu na soshal midia.

@FunnyAfrica na-eto onye were egwu agụrụ n'ihe nkiri ahụ wee dọnye n'onyonyo gosiri etu esi nwuchi otu n'ime ndị ohi ahụ

Akinwale Adekunbi na-akatọ etu otu onye uweojii si yiri akwa na-enweghị nchekwa maka mgbọ bịa inwuchi ndi ohi bu egbe.

Nzogbu, Nzogbu, Enyimba Enyi!

Image copyright Getty Images

Ndị isi pati APC nke Edo steeti na-ekwusi ike na ọ bụghị Adams Oshiomhole bụ onyeisi ha kama na ọ bụ gọvanọ na-Achị steeti ahụ ugbua bụ Godwin Obaseki ka ha ma.

Onyeisioche APC N'Edo steeti bụ Anselm Ojezua kwuru na ka ọ dị ugbua akwụsịtụla Oshiomhole i bụ onyeisi APC na steeti ahụ.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche ndị na-asọ anụ?