Biafra at 50 : Ihe mere Igbo ejighị Odumegwu Ojukwu egwu egwu

Colonel Emeka Ojukwu Image copyright AFP

O meela afọ itoolu Ọchịagha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, sorola ndị nnanna laa n'ọnwa Novemba afọ 2011(1933-2011), mana ude ya ka na-ede na mba niile.

Ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ụmụ Igbo ka kpụ dike a duru Ọwụwa Anyanwụ Naijiria n'Agha Biafra n'onụ ọbụladị ugbua okwu nnwereonwe Biafra nwuuru ọkụ ọzọ.

Nke a bụ n'ihi na bido oge ọ bụụrụ onye ndu Biafra rue ugbua, ha ahụbeghị onye ndu ọdịmma Ndigbo churu ụra ka ya.

Ọtụtụ ndị okenye Igbo dịka Elliot Uko na-ekwu na ụdị akụ agwụ agwụ nna Ojukwu kpara zuuru ya ịgba ndị Igbo nkiti, nọọrọ onwe ya oge nsogbu butere Agha Biafra dakwasara ha.

Mana o tinyere isi ya buru ya.

Gee ihe Elliot Uko kwuru mere Igbo ji hụ Ojukwu n'anya karịa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption"Enweghị onye dị ka Ojukwu, enweghị onye ga-anọchinwu ya" - Uko

Agha Biafra furu Ojukwu ihe nile o nwere; oge ya, ọgụgụisi nakwa ego nna ya.

Emeka bụ nwa a mụrụ n'obi ọgaranya n'abalị anọ nke ọnwa Novemba afọ 1933 n'Ugwu Awusa n'ebe a kpọrọ Zungeru dị na Niger steeti.

Nna ya, Louis Odumegwu Ojukwu, onye Umudim, Nnewi, Anambara steeti bụ nnukwu ọgaranya ka ibe ya n'Afrịka.

O nwere ụlọọrụ njem ụgbọala ma bụrụkwa onyeisi mbụ nke 'Nigeria Stock Market.'

Louis agụghị oke akwụkwọ mana o zigara nwa ya bụ Emeka ụlọakwụkwọ ọkaibe na Naijiria nakwa mba ofesi.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBiafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'

Emeka gụrụ akwụkwọ na 'King's College' na Legọs nakwa na , Lincoln College na mahadum Oxford na mba Briten.

Ojukwu si azụ ụlọ banye ọrụ amị n'afọ 1957 n'ihi na nna ya akwadoghị ya. Oge ahụ, ọtụtụ na-ahụta ọrụ amị dịka ọrụ ndị enweghị nke ha dị mma ya.

Image copyright Getty Images

Ndiagha zigara ya ọzụzụ na England nakwa Ghana, ma bulie ya n'okwa ka ọ lọghachiri na Naijiria n'afọ 1958.

A tụgara ya Kaduna, e mecha mee ya onyeisi ndị agha na Kano.

Ọ bụ ka ọ nọ n'Ugwu Awusa arụ ọrụ soja ka Kaduna Nzeogwu, Emmanuel Ifejuna na Adewale Ademoyega na ndị ọzọ kpara nkata ịkwatu gọọmentị n'ike n'abalị iri na ise ọnwa January afọ 1966.

Ojukwu so na ndị mere na mbọ Nzeọgwụ na ndị otu ya gbara nyụrụ ọkụ pịị n'Ugwu Awụsa n'ihi okwukwe o nweburu na ịdịkọnotu Naịjirịa.

Image copyright Getty Images

Agụiyi Ironsi dịka onye kachasị nwe ọkwa na ndịagha Naijiria weere ọkwa onyeisiala mana ka onwa isii gachara, Murtala Muhammed chuturu ọchịchị ya n'ike.

E gburu ọtụtụ ndị Agha Igbo welitere isi ma site na ya banye n'ọgbụgbụ ndị Igbo nkịtị n'Ugwu Naijria nke mere ka ọtụtụ ụmụ Igbo gbaa ọsọ ndụ gbalata ala Igbo.

Ọ bụ dịka ogbugbu nakwa mgbagbu ndị Igbo riri elu karịa na-enweghị mbọ gọọmenti gbara ibelata ya ka Ojukwu dịka gọvanọ na-achị "Eastern Nigeria" kwuru ka ndị mpaghara ọbụla chịwa onwe ha.

Nke a mere ka e nwee ọgbakọ ebe ndị isi Afrịka zukọrọ wee tinye ya bu okwu ọnụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Odumegwu Ojukwu na-agwa ndị omeiwu Biafra okwu Julaị 16 1967

Ọgbakọ bụ n'obodo Aburi nke dị na Gana ka a nọ nwee ya, wee wepụta nkwekọrịta a kpọrọ 'Aburi Accord' nke onye ọbụla n'ọgbakọ ahụ binyere aka na ya.

Mana ka ọgbakọ ahụ gachara, Yakubu Gowọn dịka Onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ, jụwapụrụ isi na ihe o kwetara n'Aburi' ma bido agha megịde ndị mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ.

Ọ bụ n'abalị isii nke ọnwa Julai afọ 1967 ka Naịjirịa gbapụrụ ọnụ egbe mbụ bidoro agha Biafra n'obodo Gakem dị na Krọs Rivas steeti sokwa n' "Eastern Region.' oge ahụ.

N'ọnụ Ojukwu, ihe o jiri gaa agha bụ " Iji gbaa mbọ hụ na a napụtara ndị Biafra n'atụmatụ ndị chọrọ ịkpochapụ ha."

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Yakubu Gowon bụ onyeisiala NAijiria oge a lụrụ Agha Biafra

Agha Biafra nakwa agụụ so ya tara isi ụmụ Igbo karịrị nde atọ.

Mana ihe kachasị tụọ mbaụwa n'anya bụ na ndị Igbo site na ntuziaka Ojukwu gbara aka ngwaọgụ lụọ agha ahụ dịka dịmkpa rụọ afọ abụọ na ụma!

Kama ịda mba, ha jiri nka na agịrị isi rụpụta ọtụtụ ihe nyeere ha aka dịka ọgbunigwe, igwe na-esi mmanụ agbidị nakwa ihe ịtụnanya ndị ọzọ.

Ka agha na-achọ ibi, Ojukwu nyefere Philip Effiong ọkwa onyeisi Agha Biafra ma gbaa ọsọ ndụ gaa Ivory Coast.

Ezinaụlọ ya:

Image copyright Bianca Ojukwu
Nkenke aha onyonyo Alum di na nwunye Emeka Ojukwu na Bianca gbara akaebe na ihunanya amaghị okenye maọbụ agadi

Ojukwu bụ mmadụ ọha ma bụrụkwa onye ejighị obibi ezinaụlọ egwu egwu.

Ọ lụrụ Bianca Onoh, nwa Christian Onoh, onye bubu Gọvanọ Anambara steeti ochie, ha mụrụ ụmụ atọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Bianca, bụbụ onye nwetara nzere Agboghọ kachasị mma mma na Naijiria tupu ọ lụọ Ojukwu

Mana tupu ọ lụọ Bianca, Ojukwu luburu Njideka, onye ya na ya zutere oge ọ na-agụ akwụkwọ n'ala Bekee.

Ụmụ ndị ọzọ Ojukwu mụrụ gụnyere Debe(ọ lala mụọ) na Emeka Ojukwu nke obere, Ebere na Okigbo.

Ụwa mgbede ya

Ojukwu mechara lọghachi Naijiria oge ọchịchị Shehu Shagari ma soro zọọ ọkwa ọchịchị n'otu NPN n'afọ 1983.

A tụnyere ya na ndị nọ n'ọchịchị oge ahụ na mkpọrọ oge Muhammadu Buhari weghara ọchịchị dịka onye agha.

E mecha tọghapụ ya n'ihi na ha atụtaghị ya aja n'ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'ọnwụ, gọọmenti Goodluck Jonathan nyere Ojukwu nkwanye ukwu pụrụ iche dịka onyeisi agha

Ọ bụ ihunanya mere Igbo ji nye Ojukwu echichi 'Ikemba' nakwa 'Dikedịọra mma.'

Ka ọ nwụrụ n'ọnwa Novermba afọ 2011, o mere ọtụtụ ndị Igbo anyammiri dịka ha na-atụ arịrị na "enyi Biafra alaala."

Iji tie ndị mmadụ aka n'obi, Gọọmenti Naijiria n'oge Goodluck Jonathan kwanyeere Ojukwu ugwu zuru oke dịka onyeisi agha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: