Supreme Court Judgement: Hope Uzodinma emeriela dịka gọvanọ Imo steeti

Uzodinma

Ụlọikpe Kachasị na-anọkọ ikpe ikpe Gọvanọ Emeka Ihedioha nke Imo state enyela Hope Uzodinma mmeri na mgbede a.

Mkpebi gbara ọkpụrụkpụ ha kpebiri:

  • Ndị ọkaikpe nyere mkpebi ahụ kwuru ka Gọvanọ nọ n'ọche ahụ kwara lawa ozigbo.
  • Ha nyere iwu ka Inec napụta gọvanọ Emeka Ihedioha akwụkwọ Asambodo mmeri.
  • Ha nyekwara iwu ka a duo Uzodinma iyiọrụ dịka Gọvanọ.

Cheta na izuụka abụọ gara aka, Fada Mbaka mụnyere ọkụ na soshal midia dịka o buru amụma na Uzodinma ga-eweghara oche Gọvanọ Imo steeti.

Chetakwa na ha higharịrị ikpe Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje nke Kano steeti gaa ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Jenuwarị 2020.

Ebe a ka ha ga-ama onye meriri ntuliaka gọvanọ steeti ha dịka ụlọikpe ukwu ga-ekwu.

Rochas ekelela Uzodinma maka mmeri ya n'ụlọikpe

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rochas Okorocha chịburu Imo steeti afọ asatọ tupu Emeka Ihedioha abanye n'oche ahụ

Aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekelela gọvanọ ọhụrụ bụ Hope Uzodinma maka mmeri ya n'ụlọikpe Kachasi

Okorocha onye bụ Sinetọ na-anọchite Imo-West n' ụlọ omeiwu ukwu kelekwara otu APC maka mmeri ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na kwuru n'ozi nke ọ nụ na-ekwuru ya bụ Sdam Onwuemedo binyere aka na ga na-enye ọchịchị Uzodinnma ezi nkwado.

Ihe mere n'ụlọikpe kachasị ụbọchị 14/01/2020

Nkenke aha onyonyo Ụlọikpe 'Supreme Court' juru n'ọnụ maka mkpebi ikpe ndọrọndọrọ ọkwa gọvanọ maka steeti ise nkd Imo bụ otu n'ime ha

Ọkaikpe Tanko Muhammad, bụ onyeisi mmadụ asaa ndị ọkaikpe kpere ya bụ ikpe yighariri ya ka o gechara mkpesa ọkaiwu ndị ikpe ahụ metụtara.

Abba Kabiru-Yusuf, bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Kano steeti n'otu PDP, na-arịọ ka ụlọikpe kachasị kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

N'otu aka ahụ kwa ka ndị otu APC na-arịọkwa ka a chutuo Ihedioha n'ọkwa gọvanọ.

Lee onyonyoo etu ndị ọkaiwu si jupụta n'ụlọikpe 'Supreme Court' n'ụtụtụ Tuzde:

Nkenke aha onyonyo Ọkaiwu Mike Ozekhome

Akụkọ na-abịa.