Ihe i kwesiri ma maka Chioma Uzodinma; nwunye gọvanọ Imo steeti

Chioma Ikeaka- Uzodinma na di new first lady of Imo state, South East Nigeria. Image copyright Other

Site n'ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị 2020, Chioma Uzodinma abụrụla nwunye gọvanọ Imo steeti.

Ọtụtụ ndị ma di ya bụ Hope Uzodinma; bụ onye ọ lụrụ n'afọ 2015 ka ọ gbachara nwunye ya nke mbụ alụkwaghịm, mana ụfọdụ amaghị Chioma a bụ onye ga-abụ 'nne mbụ' na steeti ahụ.

Lee ihe ndị BBC Igbo chọpụtara maka nwaanyị a.

  • Ọ na-aza Chioma Ikeaka, tupu ọ lụọ di
  • A mụrụ ya n'ọnwa Disemba afọ 1989, n'ezinaụlọ Humphrey na Beauty Ikeaka
  • Ọ bụ onye Ideatọ dị n'Imo steeti
  • Ọ bụ naanị otu nwa nwaanyị nne ya mụrụ, mana o nwere ụmụnne ndị nwoke abụọ
  • Ụlọakwụkwọ Primarị ya bụ International Early Learning Centre dị n'Aba, Abịa steeti ebe o toro
  • Ụlọakwụkwọ Sekọndrị ya bụ Dority International Secondary School.
  • Ọ gụrụ dịka Ọkaiwu na mahadum Imo steeti (IMSU)
  • Ọ gụkwara n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu bụ nke a na-akpọ 'law school' na Bekee, n'Abụja
  • Ọ rụọla ọrụ dịka 'Junior Associate' n'ụlọọrụ ndị ọkaiwu a kpọrọ Emeka Etiaba & Co, nakwa Rickey Tarfa & co na Chris Uche & co.
  • Ndị ma ya sị na ọ naghị enye nsogbu, na ọ na-adị ezigbo nwayọ
  • Ọ mụrụ diọkpara ya n'afọ 2016. ka otu afọ ọ lụchara di gachara
  • Ọ mụrụ ụmụejima nwaanyị abụọ n'afọ gara aga, iji meruo ọnụọgụgụ ụmụ ya atọ.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu ụmụnwaanyị Biafra si husie anya n'oge agha